Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Bụ Ndị Na-amataghị Ihe Ga-eme Echi”

“Unu Bụ Ndị Na-amataghị Ihe Ga-eme Echi”

Akụkọ Ndụ

“Unu Bụ Ndị Na-amataghị Ihe Ga-eme Echi”

DỊ KA HERBERT JENNINGS SI KỌỌ

“Esi m n’obodo ukwu bụ́ Tema, nke nwere ọdụ ụgbọ mmiri, na-alọta n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Ghana ma kwụsị iji buru otu nwa okorobịa chọrọ ka e buga ya n’ime obodo n’efu. Eji m ohere ahụ gbaara ya àmà. Echere m na m na-eme nnọọ nke ọma! Otú ọ dị, mgbe anyị ruru ebe nwa okorobịa ahụ na-eje, o si na gwongworo ahụ mapụ ma tikapụ ọsọ.”

IHE a merenụ tụpenyere m azụ̀ na ọ dị ihe dị iche na-eme ná ndụ m. Tupu mụ akọọ ihe merenụ, ka m kọọrọ gị otú mụ, bụ́ onye Canada, si bịa nọrọ na Ghana.

Ọ bụ n’etiti ọnwa December na 1949 n’ógbè dịpụrụ adịpụ n’ebe ugwu Toronto, Canada. Anyị ka gwusịrị nnọọ ihe dị ka otu mita n’ebe ala kpụkọrọ akpụkọ n’ihi oyi iji nweta mmiri maka otu ụlọ ọhụrụ. N’ịbụ ndị oyi na-atụ na ndị ike gwụrụ, ndị ọrụ anyị gbara otu ọkụ e ji ụmụ iberibe nkụ menwuo gburugburu, na-echere ka e jiri gwongworo bịa buru ha. Na mberede, Arnold Lorton, bụ́ otu n’ime ndị ọrụ anyị, malitere ikwu banyere “agha na akụkọ banyere agha,” “ọgwụgwụ ụwa a,” na-ekwukwa okwu ndị ọzọ dị nnọọ ọhụrụ ná ntị m. Onye ọ bụla mechiri ọnụ ozugbo, nọrọ ná mgbagwoju anya, ọbụna ụfọdụ wesoro ya iwe. Ana m echeta ikwu n’ime obi m, sị, ‘Nwoke m a nwere obi ike dị ukwuu! Ọ dịghị onye nọ ebe a chọrọ ige ntị, ma ọ ka na-ekwu ihe ọ na-ekwu.’ Ma ihe ọ na-ekwu kpaliri mmasị m. Ọ bụ nanị afọ ole na ole mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, anụtụbeghịkwa m ụdị ihe ndị ahụ n’okpukpe Christadelphian nke ezinụlọ anyị kpeworo ruo ọtụtụ ọgbọ. M gere ntị nke ọma, nkọwa ya dọọrọ mmasị m.

Egbughị m oge ịgakwuru Arnold iji nwetakwuo ihe ọmụma. N’ileghachi anya azụ, ana m echeta nnọọ otú ya na nwunye ya, bụ́ Jean, si enwe ndidi na obiọma n’ebe m nọ, bụ́ onye dị afọ 19 nke na-enweghị ahụmahụ. Ọtụtụ mgbe, ana m aga n’ụlọ ha iji soro ha kwurịta okwu n’agwabughị ha agwa, n’echereghịkwa ka ha kpọọ m. Ha gbaziri echiche m ma nyere m aka idozi enweghị nkwekọrịta nke ụkpụrụ na omume bụ́ nke nọ na-awagharị n’uche m ka na-eto eto. Ọnwa iri mgbe m nwesịrị ahụmahụ mbụ ahụ n’akụkụ ọkụ ahụ dị n’akụkụ ụzọ, e mere m baptism n’October 22, 1950, dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, esonyekwaara m Ọgbakọ Willowdale dị na North York, nke dị ugbu a na Toronto.

Iso Ndị Mụ na Ha Na-efekọ Ofufe Na-aga n’Ihu

Ihe siwanyeere m ike n’ebe obibi anyị mgbe nna m matara na m kpebisiri ike ịgbaso okwukwe ọhụrụ m. N’oge na-adịbeghị anya, papa m na onye ọkwọ ụgbọala mmanya na-egbu ji ụgbọala ha sọkọta isi, n’ihi ya kwa, ọtụtụ mgbe ọ naghị adị mfe iso ya mekọọ ihe. Ihe siiri mama m, ụmụnne m ndị nwoke abụọ, na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ, ike. Esemokwu banyere eziokwu Bible bịara ka njọ. Ya mere o yiri m ihe amamihe dị na ya ịhapụ ụlọ ka mụ na ndị mụrụ m wee dị n’udo nakwa ka m wee kwụsie ike ‘n’ụzọ nke eziokwu ahụ.’—2 Pita 2:2.

Ka ọ na-erule ná ngwụsị oge okpomọkụ nke 1951, abanyere m n’otu obere ọgbakọ dị na Coleman, Alberta. Ụmụ okorobịa abụọ, bụ́ Ross Hunt na Keith Robbins nọ n’ebe ahụ, na-arụsi ọrụ ike n’ime nkwusa ihu ọha oge nile, nke a maara dị ka ịsụ ụzọ oge nile. Ha nyeere m aka iche ihu n’otu ozi afọ ofufo ahụ. Na March 1, 1952, esonyere m ná ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile.

Eji m obi ụtọ na-echeta agbamume m nwetara. O nwere ihe dị ukwuu m ga-amụta, ebe a ka m nọkwa na-amụta ya. Mgbe e mesịrị, mgbe m tinyesịrị ihe dị ka otu afọ n’ozi ọsụ ụzọ n’Ọgbakọ Lethbridge, Alberta, m natara ọkpụkpọ òkù m na-atụghị anya ya ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Aga m na-eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova dịsasịrị n’akụkụ ụsọ oké osimiri ebe ọwụwa anyanwụ nke Canada malite na Moncton, dị na New Brunswick, ruo Gaspé, Quebec.

Ebe m dị nanị afọ 24 ma bụrụ onye dịtụ ọhụrụ n’eziokwu ahụ, enwere m mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru, karịsịa ma e were m tụnyere Ndịàmà tozuru òkè m ga na-eleta. Emere m ezi mgbalị n’ọtụtụ ọnwa ndị sochirinụ. Mgbe ahụ, ihe ijuanya ọzọ mere.

Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ije Gold Coast

Na September 1955, a kpọrọ m òkù isonyere ihe dị ka otu narị ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ maka klas nke 26 nke Watchtower Bible School of Gilead dị na South Lansing, New York. Ọnwa ise nke ọzụzụ kpụ ọkụ n’ọnụ bụ kpọmkwem ihe dị m mkpa. E wusiri ịnụ ọkụ n’obi m ike site n’iso ìgwè dị otú ahụ nwere mkpali dị ukwuu nọkọọ. N’oge a, e nwere ihe ọzọ mere bụ́ nke meworo ka ndụ m bụrụ nke na-enye afọ ojuju ruo taa.

Ọ dị otu nwanna nwanyị na-eto eto bụ́ Aileen Stubbs, so n’ụmụ akwụkwọ ahụ na-akwadebe maka ọrụ ozi ala ọzọ. Ihe m hụrụ n’ime Aileen bụ ezi nkwụsi ike, iji ihe akpọrọ ihe, na mmụọ obi umeala na nke obi ụtọ. Echere m na m menyere ya ụjọ mgbe m kwupụtara n’ụzọ akọ na-adịghị na ya na m chọrọ ịlụ ya. Otú ọ dị, ọ jụghị! Anyị abụọ kwekọrịtara na Aileen ga-aga ọrụ ozi ala ọzọ ya na Costa Rica, m ga-agakwa nke m na Gold Coast (nke bụ́ Ghana ugbu a), dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa.

N’otu ụtụtụ na May 1956, ahụrụ m onwe m n’ọfịs Nwanna Nathan Knorr nke dị n’okpukpu nke iri nke ụlọ elu dị na Brooklyn, New York. Mgbe ahụ ọ bụ onyeisi oche nke Watch Tower Society. A na-ekenye m ịga rụọ ọrụ dị ka ohu alaka iji lekọta ọrụ nkwusa ahụ na Gold Coast, Togoland (nke bụ́ Togo ugbu a), Ivory Coast (nke bụ́ Côte d’Ivoire ugbu a), Upper Volta (nke bụ́ Burkina Faso ugbu a), na Gambia.

Ana m echeta okwu Nwanna Knorr kwuru dị ka ò kwuru ya nnọọ ụnyaahụ. “Ọ bụghị iwu na ị ga-eweghara ọrụ ozugbo,” ka o kwuru. “Were ya nwayọọ; mụta ihe site n’aka ụmụnna nwere ahụmahụ nọ n’ebe ahụ. Mgbe ọ dị gị ka ị̀ dịla njikere, i kwesịrị ịmalite ije ozi dị ka ohu alaka. . . . Lee akwụkwọ ozi nhọpụta gị. Ụbọchị asaa gafesịa malite n’oge i ji garuo i kwesịrị iweghara ọrụ.”

‘Nanị ụbọchị asaa,’ ka m kwuru n’obi m. ‘Oleezikwanụ ihe bụ́ “were ya nwayọọ”?’ Ajụjụ ọnụ ahụ tinyere m ná mgbagwoju anya.

Ụbọchị ole na ole ndị sochirinụ gafere ngwa ngwa. N’oge na-adịghị anya, eguzo m n’akụkụ okporo ígwè mgbochi nke otu ụgbọ mmiri e ji ebu ibu nke na-agba n’Osimiri Ọwụwa Anyanwụ, gafere ọfịs Society dịgasị na Brooklyn, na-amalite njem oké osimiri nke ga-ewe ụbọchị 21 iji garuo Gold Coast.

Mụ na Aileen nọ na-ederịta akwụkwọ ozi ndị a na-eji ụgbọelu ebuga n’ofesi. Anyị zutere ọzọ na 1958 ma lụọ n’August 23 n’afọ ahụ. Akwụsịbeghị m ikele Jehova maka onye ibe dị otú a magburu onwe ya.

Ruo afọ 19, enwere m ekele maka ihe ùgwù nke iso ndị ozi ala ọzọ ibe m na ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Africa jekọọ ozi n’alaka ụlọ ọrụ Society. Ezinụlọ Betel mụbara site ná mmadụ ole na ole ruo ihe dị ka mmadụ 25 n’oge ahụ. Oge ahụ siiri anyị ike ma bụrụ nke jupụtara n’ihe omume, na nke ịrụpụta ihe. Otú ọ dị, aghaghị m ikwu eziokwu. Nye m, ihu igwe ahụ na-ekpo ọkụ, nke dị udè, bụ ihe ịma aka n’ezie. Ọ na-adị ka ọsụsọ ọ na-agba m mgbe nile, ka ahụ m ọ̀ na-anya anya mgbe nile, mgbe ụfọdụkwa, ahụ ana-agbakasị m. Ka o sina dị, ọ bụ ihe na-enye ọṅụ n’ezie ije ozi, ka ọnụ ọgụgụ anyị na Ghana mụbara site n’ihe ji nnọọ nke nta gafee ndị nkwusa Alaeze 6,000 na 1956 ruo 21,000 na 1975. Ọ na-enyekwa m obi ụtọ okpukpu abụọ ịhụ ihe karịrị Ndịàmà 60,000 na-arụsi ọrụ ike n’ebe ahụ taa.

“Echi” nke Anyị Na-atụghị Anya Ya

N’ihe dị ka n’afọ 1970, amalitere m inwe nsogbu ahụ ike nke siri nnọọ ike ịchọpụta ihe ọ bụ. Emere m nnyocha ahụ ike zuru ezu, nanị ihe a gwara m bụ na ‘ahụ dị m mma.’ Gịnịzi mere o ji adịkarị m ka ejighị m ahụ, m na-enwe nnọọ oké ike ọgwụgwụ na ahụ erughị ala? Ihe abụọ zara ya, ha bụkwaara m ihe ijuanya. N’ezie, dị ka Jemes si dee ya: “Unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi.”—Jemes 4:14.

Ihe mbụ tụpenyere m azụ bụ ahụmahụ ahụ m nwere n’ebe nwa okorobịa ahụ m gbaara àmà nọ, mgbe m bu ya n’ụgbọala na-abanye n’obodo. Ọ dịghị otú m si ghọtatụ na m nọ na-atakwuri, na-ekwusikwu okwu ike ka oge na-agafe. Mgbe anyị ruru ebe nwa okorobịa a na-aga, o juru m anya mgbe o si na gwongworo ahụ mapụ ma tikapụ ọsọ. Ihe ka ukwuu ná ndị Ghana bụ ndị ihe na-adịghị enye nsogbu n’obi, ndị na-anọ nwayọọ, ndị nwere ike ịnagide ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla. Mmeghachi omume ya adabaghị nnọọ ná nkọwa ahụ. Anọ m ebe ahụ na-eche banyere ya. Achọpụtara m na m nwere nsogbu. Amataghị m kpọmkwem ihe ọ bụ. Ma enwere m nsogbu n’ezie.

Nke abụọ bụ na mgbe otu nkwurịta okwu nke na-akpali nnyocha onwe onye gasịrị, Aileen tụrụ aro, sị: “Ọ bụrụ na nsogbu a abụghị nke anụ ahụ, ọ ga-abụrịrị nke uche.” Ejiziri m nlezianya detuo mgbaàmà nile m na-enwe, gaa hụ otu dibịa na-agwọ ọrịa uche. Mgbe m gụpụtasịrị ndepụta m, nzaghachi ya bụ: “Nke a bụ nsogbu doro anya. Ị na-arịa ọrịa uche mkpaghasị nke na-akpata ịda mbà n’obi.”

O riri m ọnụ! Ọ nọgidere na-aka njọ ka m na-agbalịsi ike ịnọ na-adọga ruo afọ ole na ole sochirinụ. Anọgidere m na-achọ ngwọta ya. Ma ọ dịghị onye ọ bụla maara n’ezie ihe a ga-eme. Lee mgbalị na-ekoropụ obi ọ bụ!

Ọ nọwo mgbe nile na-abụ ebumnobi anyị ijigidesi ihe ùgwù nke ozi oge nile ike dị ka ọrụ anyị ná ndụ, e nwekwara nnọọ ọtụtụ ihe dị mkpa ka e mee. Ekpesiri m ekpere ike ọtụtụ mgbe, sitekwa n’ala ala obi m, sị: “Jehova, ọ bụrụ na ị chọrọ, m ‘ga-adị ndụ, meekwa ihe a.’” (Jemes 4:15) Ma ọ dịghị otú ahụ. Ya mere, n’iche ihe bụ eziokwu ihu, anyị mere ndokwa ịhapụ Ghana na ọtụtụ ezigbo ndị enyi anyị ma laghachi Canada na June 1975.

Jehova Esite n’Aka Ndị Ya Nye Aka

N’oge na-adịghị anya amụtara m na adịghị m mkpa gabiga ókè, nsogbu m apụghịkwa iche. Aghọtara m ihe okwu ndị dị na 1 Pita 5:9 pụtara, nke na-asị: “[Maranụ] na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ́ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.” Ebe nke a doworo m anya, amalitere m ịghọta otú Jehova si kwado anyị abụọ n’ezie n’agbanyeghị mgbanwe a na-adịghị enye obi ụtọ. Lee ụzọ magburu onwe ya ‘òtù ụmụnna’ si nyere anyị aka n’ọtụtụ ụzọ!

N’agbanyeghị na anyị enweghị ihe dị ukwuu n’ụzọ ihe onwunwe, Jehova ahapụghị anyị. Ọ kpaliri ndị enyi anyị nọ na Ghana inyere anyị aka n’ụzọ ihe onwunwe na n’ụzọ ndị ọzọ. Ná nnukwute obi abụọ, anyị hapụrụ ndị anyị bịaworo hụ n’anya nke ukwuu ma chigharịa iji hụ maka “echi” a a na-atụghị anya ya.

Nwanne nwanyị Aileen, bụ́ Lenora, na di ya bụ́ Alvin Friesen, ji obiọma nye anyị ụlọ ma gboo mkpa anyị n’ụba ruo ọtụtụ ọnwa. Otu dibịa a ma ama n’ịgwọ ọrịa uche ji obi ike buo amụma, sị: “Ị ga-agbake n’ọnwa isii.” Ikekwe, e kwuru nke ahụ iji mee ka m nwee obi ike, ma amụma ahụ emezughị ọbụna mgbe afọ isii gasịrị. Ruo taa, ana m agbaso ihe e ji ụzọ akọ na-akpọ ihe imetụ n’isi mgba. Nke ahụ bụ n’ezie aha dị nro karị, ma dị ka ndị ọ na-arịa maara nke ọma, aha dị nro karị adịghị ụzọ ọ bụla o si ebelata oké mgbaàmà nke ọrịa ahụ.

N’oge ahụ, Nwanna Knorr arịawalarị ọrịa nke mesịrị gbuo ya na June 1977. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-enwe ohere na ume idere m ogologo akwụkwọ ozi ndị na-enye agbamume, nwee okwu nkasi obi na ndụmọdụ. M ka na-ewere akwụkwọ ozi ndị ahụ n’ihe dị oké ọnụ ahịa. Okwu ya bịanyụrụ nnọọ mmetụta ezi uche na-adịghị na ya nke ịbụ onye dara ada m nọgidere na-enwe.

Ná ngwụsị nke 1975, anyị hapụrụ ihe ùgwù ije ozi oge nile dị oké ọnụ ahịa anyị nwere ma tụkwasị uche n’ime ka ahụ ike m ka mma. Ìhè nkịtị na-afụ m ụfụ n’anya. Ụda mberede na-adị m ka ụda égbè. Ngagharị nke ìgwè mmadụ na-erikpu m. Ọ bụ ọgụ na mgba n’ezie nanị ịga nzukọ ndị Kraịst. Ka o sina dị, ekwenyesiri m ike n’uru dị ná mkpakọrịta ime mmụọ. Iji nagide, ana m abanyekarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ndị mmadụ nọdụsịrị ala, pụọkwa obere oge tupu ọ malite ịzụ wuruwuru ná ngwụsị nke usoro ihe omume.

Ikere òkè n’ozi ihu ọha bụ nnukwute ihe ịma aka ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ọbụna mgbe m rutesịrị n’otu ụlọ, adịghị m enwe obi ike ruo n’ókè nke ịkụ mgbịrịgba ụzọ. Otú ọ dị, adịghị m alawa n’ihi na amaara m na ozi anyị pụtara nzọpụta nye anyị onwe anyị na ndị ọ bụla ga-aṅa ntị. (1 Timoti 4:16) Mgbe obere oge gasịrị, ana m enwe ike chịkwaa mmetụta uche m, gaa n’ọnụ ụzọ nke ọzọ, ma gbalịa ọzọ. Site n’ịnọgide na-ekere òkè n’ozi, anọgidere m na-enwe ezi ahụ ike ime mmụọ, nke ahụ mekwara ka m nwekwuo ike ịtachi obi.

N’ihi na ihe imetụ n’isi adịghị ala ala, aghọtawo m na ọrịa a yikarịsịrị ka ọ gaghị ahapụ m aka n’usoro ihe dị ugbu a. Na 1981, usoro isiokwu ndị magburu onwe ha pụtara na Teta! * Site na ha, amalitere m ighọta ọdịdị nke nrịanrịa a nke ọma karị nakwa ịmụta ụzọ ndị ka dịrị irè isi nagide ya.

Ịmụta Ịnagide

Ihe a nile aghaghị ịchọ ịchụ àjà na mgbanwe n’aka nwunye m. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enye nlekọta n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, o yiri ka ị ga-aghọta ihe ndị ọ chọpụtara:

“O yiri ka nsogbu ọnọdụ uche ọ na-akpata mgbanwe mberede n’ụdị onye mmadụ bụ. N’ime awa ole na ole, onye ọ na-arịa pụrụ ịgbanwe site n’onye dị gara gara, nke na-enye agbamume, onye nwere atụmatụ na echiche ndị ọhụrụ, ghọọ onye ike gwụsịrị, nke nwere àgwà na-ezighị ezi, ọbụna na-ewe iwe. Ọ bụrụ na a ghọtaghị ya dị ka nrịanrịa, ọ pụrụ ịkpasu ndị ọzọ iwe ma gbagwojuo ha anya. N’ụzọ doro anya, a ghaghị imegharị atụmatụ ngwa ngwa, onye ahụ na-amalitekwa ịlụso mmetụta nke ndakpọ olileanya na nke ịbụ onye a jụrụ ajụ ọgụ.”

Ma mụ onwe m, mgbe ọ dị m ka ahụ ọ dịla m nnọọ mma n’ụzọ pụrụ iche, ụjọ na-abịa m. Esitewo m n’ahụmahụ mara na ihe na-eso “oké obi ụtọ” bụ ịdaba n’ọnọdụ “ịda mbà n’obi.” N’ọnọdụ nke m, “ịda mbà n’obi” na-adịrị mụ mma karịa “oké obi ụtọ” n’ihi na ịda mbà n’obi ahụ na-emekarị ka m ghara ịgagharị agagharị ruo ọtụtụ ụbọchị, o yighịkwa ka m ga-etinye aka n’ihe na-ekwesịghị ekwesị. Aileen na-enyere m aka nke ukwuu site n’ịdọ m aka ná ntị ịghara inwe mkpali gabiga ókè nakwa site n’ịkasị m obi na ịkwado m mgbe ọnọdụ uche na-adịghị mma rikpuru m.

Mgbe ọrịa a na-esi ike, e nwere nnọọ oké ihe ize ndụ nke ịbụ onye na-eche nanị banyere onwe ya ruo n’ókè nke ichefu ndị ọzọ nile. Mmadụ pụrụ ikewapụ onwe ya kpam kpam mgbe o nwere ịda mbà n’obi ma ọ bụ mgbe ọ na-aghọtaghị mmetụta na mmeghachi omume nke ndị ọzọ n’oge o nwere uche mkpasasị. N’oge gara aga, o siiri m ike ịnakwere ihe àmà nke nsogbu uche na nke mmetụta uche m. Anọwo m na-alụ ọgụ megide echiche bụ́ na ọ bụ onye ọzọ ma ọ bụ ihe si ebe ọzọ, dị ka mgbalị kụrụ afọ n’ala, na-akpata nsogbu ahụ. Ọtụtụ mgbe, aghaghị m ichetaghachiri onwe m, sị, ‘Ọ dịbeghị ihe gbanwere gburugburu m. Nsogbu a si n’ahụ m, ọ bụghị n’ebe ọzọ.’ Nke nta nke nta, a gbaziwo echiche m.

N’afọ ndị gafeworonụ, anyị abụọ amụtawo ịgwa onwe anyị na ndị ọzọ ihe bụ́ eziokwu banyere ọnọdụ m. Anyị na-agbalịsi ike ịnọgide na-enwe nchekwube ma ghara ikwe ka ọrịa a chịkwaa ndụ anyị.

“Echi” nke Ka Mma

Site n’ekpere siri ike na ọtụtụ mgbalị, anyị eritewo uru site ná ngọzi na nkwado Jehova. Anyị abụọ akatawo ahụ ugbu a. A na-ele m ahụ oge nile na-enyekwa m ọgwụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrịnụ mgbe nile, ahụ ike m akabeghịkwa njọ. Anyị na-enwe ekele maka ihe ùgwù ije ozi ọ bụla anyị pụrụ inwe. M ka na-eje ozi dị ka okenye ọgbakọ. Anyị na-agbalị mgbe nile ịdị na-akwado ndị ọzọ n’okwukwe.

N’eziokwu, dị ka Jemes 4:14 na-ekwu: “Unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi.” Nke ahụ ga-adị otú a ruo ogologo oge usoro ihe a nọgidere na-adị. Otú ọ dị, ihe Jemes 1:12 kwuru bụkwa eziokwu: “Ngọzi na-adịrị nwoke onye na-atachi obi n’ọnwụnwa: n’ihi na mgbe a nwapụtaworo ya, ọ ga-anata okpueze ahụ, bụ́ ndụ, nke Onyenwe anyị kwere nkwa inye ndị hụrụ Ya n’anya.” Ka anyị nile guzosie ike taa ma nweta ngọzi ndị Jehova na-ekwe nkwa inye echi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 35 Lee isiokwu ndị bụ́ “Ị Pụrụ Ịnagide ná Ndụ,” dị ná mbipụta Teta! (Bekee) nke August 8, 1981; “Otú Ị Pụrụ Isi Lụsoo Ịda Mbà n’Obi Ọgụ,” na nke September 8, 1981 (Bekee); na “Ibuso Oké Ịda Mbà n’Obi Agha,” na nke October 22, 1981 (Bekee).

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịchọ ịnọrọ nanị m n’ebe m na-ese ihe

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na nwunye m, bụ́ Aileen

[Foto dị na peeji nke 28]

Ná Mgbakọ “Oziọma Ebighị Ebi” e nwere na Tema, Ghana, na 1963