Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụmọdụ Amamihe nke Otu Nne

Ndụmọdụ Amamihe nke Otu Nne

Ndụmọdụ Amamihe nke Otu Nne

“Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.”—Ilu 1:8.

NDỊ mụrụ anyị—nne na nna anyị—pụrụ ịbụ isi iyi bara uru nke agbamume, nkwado, na ndụmọdụ. Akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-akọ banyere otu eze na-eto eto, bụ́ Lemuel, onye natara “ozi dị mkpa” (NW) nke ‘ịdọ aka ná ntị’ site n’aka nne ya. E dekọrọ okwu ndị ahụ n’Ilu isi nke 31, anyị onwe anyị kwa pụrụ irite uru site na ndụmọdụ amamihe a nke onye bụ́ nne nyere.—Ilu 31:1.

Ndụmọdụ nke Kwesịịrị Onye Eze

Nne Lemuel ji ọtụtụ ajụjụ na-akpali mmasị anyị malite: “Gịnị, nwa m? gịnịkwa, nwa nke afọ m? Gịnịkwa, nwa nke nkwa nile m kwere?” Arịrịọ ọ rịọghachiri ugboro atọ na-egosi oké nchegbu o nwere ka nwa ya gee ntị n’okwu ya. (Ilu 31:2) Nchegbu ya maka ọdịmma ime mmụọ nke nwa ya na-esetịpụrụ ndị Kraịst mụrụ ụmụ taa ezi ihe nlereanya.

Banyere ọdịmma nke nwa ya nwoke, gịnị pụrụ ichegbu onye bụ́ nne karịa oriri oké mkpọtụ na ibi ndụ ịla n’iyi ná mmanya a na-ekwukarị okwu banyere ya, ndị inyom, na abụ? Nne Lemuel kpọrọ okwu aha kpọmkwem: “Enyela ndị inyom ike gị.” Ọ na-akọwa inwe mmekọahụ aghara aghara dị ka “ihe na-ebibi ndị eze.”—Ilu 31:3.

E kwesịghị ileghara ịṅụbiga mmanya ókè anya. “Ka ndị eze ghara ịṅụ mmanya vine, Lemuel, ka ndị eze ghara ịṅụ mmanya vine,” ka ọ dọrọ aka ná ntị. Olee otú onye eze ga-esi jiri ezi uche kpee ikpe ziri ezi ma ghara ‘ichezọ ụkpụrụ a tọrọ, wee gbanwee ikpe nke ndị nile e wedara nala’ ma ọ bụrụ na mmanya na-egbu ya mgbe nile?—Ilu 31:4-7.

N’ụzọ megidere nke ahụ, site n’izere ajọ ihe ndị dị otú ahụ, eze ahụ ga-enwe ike ‘ikpe ikpe nezi omume, kpepụtakwa onye e wedara nala na ogbenye.’—Ilu 31:8, 9.

Ọ bụ ezie na ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst nwere ike ha agaghị abụ “ndị eze” taa, ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya nke nne Lemuel nyere bịakwara n’ezi oge, ma eleghị anya ọbụna karịa mgbe e nyere ya. Iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighi ezi, ise ụtaba, na mmekọahụ rụrụ arụ bụ ihe zuru ebe nile ugbu a n’etiti ndị na-eto eto, ọ dịkwa mkpa ka ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst gee ntị mgbe ndị mụrụ ha na-ezi ha ‘ozi ndị dị mkpa.’

Nwanyị nke Na-ejide Onwe Ya nke Ọma

Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na ndị bụ́ nne ga na-enwe nchegbu banyere atụmanya ịlụ nwunye nke ụmụ ha ndị na-etoru ogo mmadụ. Nne Lemuel lebaziri anya n’àgwà nke onye ga-abụ ezi nwunye. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nwa okorobịa ga-erite uru dị ukwuu site n’ịtụle echiche onye bụ́ nwanyị n’okwu a dị mkpa.

N’amaokwu nke 10, e ji “nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma” tụnyere ruby dị oké ọnụ ahịa, bụ́ nke a na-enweta n’oge Bible nanị site ná mgbalị dị ukwuu. N’otu aka ahụ, ịchọta nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma chọrọ mgbalị. Kama iji ọkụ ọkụ mabanye n’alụmdi na nwunye, ọ ga-adị mma ka nwa okorobịa jiri nwayọọ mee nhọrọ. Mgbe ahụ, o yikarịrị ka ọ ga-eji ihe dị oké ọnụ ahịa ọ chọtara kpọrọ ihe nke ukwuu.

Banyere nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma, a gwara Lemuel, sị: “Obi di ya atụkwasịwo ya obi.” (Amaokwu nke 11) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ gaghị esi ọnwụ na nwunye ya ga-anata ya ikike n’ihe nile. N’ezie, ndị òtù ọlụlụ kwesịrị inwe mkparịta ụka tupu ha ana-eme mkpebi ndị gbara ọkpụrụkpụ, dị ka ndị metụtara ịzụ ihe ndị dara oké ọnụ ma ọ bụ ịzụlite ụmụ ha. Inwe nkwurịta okwu n’ihe ndị a na-eme ka e nwee ihe nkekọ chiri anya n’etiti ha.

N’ezie, nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma nwere ọtụtụ ihe ime. N’amaokwu nke 13 ruo nke 27 e depụtara ndụmọdụ na ụkpụrụ ndị nwunye nọ n’ọgbọ ọ bụla pụrụ iji mee ihe maka abamuru nke ezinụlọ ha. Dị ka ihe atụ, n’ihi ịrị elu nke ọnụ ahịa uwe na arịa ụlọ, nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma na-amụta iji aka ya arụpụta ihe na ịghara ịdị na-emefusị ihe ka ezinụlọ ya wee nwee ike iji ejiji kwesịrị ekwesị ma dị mma n’anya. (Amaokwu nke 13, 19, 21, 22) Iji belata ego ezinụlọ na-emefu n’ihe oriri, ọ na-akọ ugbo ókè o nwere ike ma na-eji nlezianya azụ ihe.—Amaokwu nke 14, 16.

N’ụzọ doro anya, nwanyị a adịghị eri “nri umengwụ.” Ọ na-arụsi ọrụ ike ma na-achịkwa ihe omume ezinụlọ ya nke ọma. (Amaokwu nke 27) Ọ na-eke “ike n’úkwù ya dị ka ihe okike,” nke pụtara na ọ na-adị njikere ịrụ ọrụ ndị chọrọ ike ọkpụkpụ aka. (Amaokwu nke 17) Ọ na-ebili mgbe chi na-efobeghị iji malite ọrụ ụbọchị ya, ọ na-arụsikwa ọrụ ike ruo n’abalị. Ọ dị ka a ga-asị na oriọna nke o ji ahụ ụzọ wee na-arụ ọrụ ya adịghị anyụ anyụ.—Amaokwu nke 15, 18.

Karịsịa, nwanyị ahụ nke na-ejide onwe ya nke ọma bụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ọ na-atụ egwu Chineke ma jiri nkwanye ùgwù miri emi na egwu nsọpụrụ na-efe ya ofufe. (Amaokwu nke 30) Ọ na-enyekwara di ya aka n’ịzụ ụmụ ha ime otú ahụ. Amaokwu nke 26 na-asị: “N’amamihe,” ka ọ na-ezi ụmụ ya ihe, “iwu nke ebere dịkwasịkwa n’ire ya.”

Nwoke nke Na-ejide Onwe Ya nke Ọma

Iji nweta nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma, ọ ga-adị mkpa ka Lemuel rụzuo ọrụ ndị dịịrị nwoke nke na-ejide onwe ya nke ọma. Nne Lemuel na-echetara ya ọtụtụ n’ime ihe ndị a.

“Ndị okenye ala” ya ga na-akọ akụkọ dị mma banyere nwoke nke na-ejide onwe ya nke ọma. (Ilu 31:23) Nke ahụ pụtara na ọ ga-abụ onye nwere ike ime ihe, onye na-eme ihe n’eziokwu, onye a pụrụ ịtụkwasị obi, na onye na-atụ egwu Chineke. (Ọpụpụ 18:21; Deuterọnọmi 16:18-20) N’ihi ya, ọ ga-abụ “onye a maara n’ọnụ ụzọ ámá,” bụ́ ebe ndị ikom a ma ama na-ezukọ iji lebara okwu obodo anya. Iji bụrụ “onye a maara” dị ka nwoke na-atụ egwu Chineke, ọ ga-abụ onye nwere ezi uche ma soro ndị okenye “ala,” nke pụtara ma eleghị anya ókèala ma ọ bụ ógbè ya, na-arụkọ ọrụ.

Obi abụọ adịghị ya na n’ikwu okwu site n’ahụmahụ nke ya, nne Lemuel na-echetara nwa ya nwoke banyere mkpa ọ dị iji onye gaje ịbụ nwunye ya kpọrọ ihe. Ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ụwa nke ọ ga-ahụ n’anya karịa ya. Ya mere chee echiche banyere oké mmetụta nke dị n’olu okwu ya mgbe ọ na-ekwupụta n’ihu mmadụ nile, sị: “Ọtụtụ ụmụ ndị inyom emewo omume kwesịrị ndị inyom na-ejide onwe ha nke ọma, ma gị onwe gị kachasị ha nile.”—Ilu 31:29.

O doro anya na Lemuel jiri ndụmọdụ amamihe dị na ya nke nne ya nyere ya kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, anyị na-arịba ama, na n’amaokwu 1, o zoro aka n’ebe okwu nne ya dị dị ka nke ya. N’ihi ya, ọ nabatara ‘ịdọ aka ná ntị’ ya ma rite uru site na ndụmọdụ ya. Ka anyị onwe anyị kwa rite uru ‘n’ozi a dị mkpa’ site n’itinye ụkpụrụ ya n’ọrụ ná ndụ anyị.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma adịghị eri “nri umengwụ”