Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Ọhụrụ Dị Anyị Mkpa

Ụwa Ọhụrụ Dị Anyị Mkpa

Odeakwụkwọ Ukwu Òtù Mba Ụwa aha ya bụ António Guterres kwuru, sị, “Nsogbu juru n’ụwa anyị a.” Ihe a o kwuru ọ́ bụghị eziokwu?

Anyị na-anụkarị akụkọ gbasara

  • Ọrịa dị iche iche

  • Ọdachi ndị na-emere onwe ha

  • Ịda ogbenye na agụụ

  • Imetọ ụwa na oké okpomọkụ

  • Arụrụala, tigbuo zọgbuo, na nrụrụaka

  • Agha

O doro anya na ụwa ọhụrụ dị anyị mkpa, ya bụ, ụwa

  • Ahụ́ ga-agbasi onye ọ bụla ike na ya

  • Ahụ́ ga-eru onye ọ bụla ala

  • Nri ga-abụ atụrụ tawa

  • A na-enweghị ebe ruru unyi

  • A na-enweghị onye a ga-emegbu

  • Udo zuru ebe niile

Ma, oleekwanụ ihe ụwa ọhụrụ pụtara?

Gịnị ga-eme ụwa a anyị bi n’ime ya?

Olee ihe anyị ga-eme ka anyị biri n’ụwa ọhụrụ?

Ụlọ Nche a ga-esi na Baịbụl zaa ajụjụ ndị a nakwa ajụjụ ndị ọzọ yiri ha. Ihe ọ zara ga-akasikwa gị obi.