Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ANABATA ONYINYE KACHANỤ CHINEKE NYERE ANYỊ?

Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị?

Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị?

“Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị . . . Ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha.”—2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.

Ọ BỤRỤ na mmadụ emeere anyị ihe ọma, anyị kwesịrị ikele ya. Ihe Jizọs kwuru mgbe ọ gwọrọ mmadụ iri na-arịa ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ n’oge ahụ, gosiri na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Otu n’ime mmadụ iri ahụ “laghachiri, jiri oké olu na-enye Chineke otuto.” Jizọs jụrụ ya, sị: “Ọ́ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ?” (Luk 17:12-17) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụ na anyị ekwesịghị ichefu ihe ọma e meere anyị.

O nweghị onyinye e nwere ike iji tụnyere ihe mgbapụta ahụ. Ọ bụ onyinye kachanụ e nyetụrụla anyị. Oleezi otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka ya?

  • Mata onye nyere ihe mgbapụta ahụ. Na Chineke nyere anyị ihe mgbapụta ahụ apụtaghị na anyị niile ga-eketa ndụ ebighị ebi. Anyị ga-eme ihe. Jizọs gwara Chineke n’ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na mmadụ agwa gị na o nwere onye zọrọ gị ndụ mgbe ị bụ nwata, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịmatakwu onye ahụ na ihe mere o ji zọọ gị ndụ? Jehova Chineke, onye nyere anyị ihe mgbapụta ahụ iji zọọ anyị ndụ, chọrọ ka ị mata ya, nakwa ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma. Baịbụl gwara anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

  • Nwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ. Baịbụl kwuru na “onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:36) Olee otú ị ga-esi enwe okwukwe? Ị ga-arụ ọrụ. (Jems 2:17) Olee ụdị ọrụ ọ bụ? Mmadụ nyewe gị ihe, ị ga-anara ya onye ahụ tupu ya aghọọ nke gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe mgbapụta ahụ. Ị ga-anabata ya tupu ya abara gị uru. Olee otú ị ga-esi eme ya? I kwesịrị ịmụta otú Chineke chọrọ ka i si na-ebi ndụ, ma na-ebi ndụ otú ahụ. * Rịọ Chineke ka ọ gbaghara gị mmehie gị, ka i nwee ike inwe akọnuche dị ọcha. Ọ bụrụ na i nwee okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, ị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe udo ga-eju ebe niile, obi eruokwa onye ọ bụla ala.—Ndị Hibru 11:1.

  • Gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jizọs malitere ihe a ga na-eme kwa afọ iji na-echeta ihe mgbapụta ahụ. Jizọs kwuru banyere ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ndịàmà Jehova ga-echeta ọnwụ Jizọs na Tuzdee, Eprel 11, 2017, mgbe anyanwụ dachara. Ọ ga-ewe ihe dị ka otu awa. A ga-ekwu okwu a ga-eji kọwaa uru ọnwụ Jizọs na-abara anyị ugbu a, nakwa uru ọ ga-abara anyị n’ọdịnihu. N’afọ gara aga, ihe dị ka nde mmadụ iri abụọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụwa niile. Anyị ji obi anyị niile na-akpọ gị ka i soro anyị cheta ọnwụ Jizọs n’afọ a, iji gosi na obi dị gị ụtọ maka onyinye kachanụ Chineke nyere anyị.

^ para. 7 Otú kacha mma ị ga-esi amata Chineke ma bịaruo ya nso bụ ịmụ Baịbụl. I nwere ike ịgwa Ndịàmà Jehova ka ha bịa mụwara gị Baịbụl, ma ọ bụkwanụ gị agaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.jw.org/ig gụọ ya.