Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Nku Azụ̀ Weel

Nku Azụ̀ Weel

ONWERE otu ụdị azụ̀ weel na-ebu ezigbo ibu. O nwere mkpumkpu azụ. Azụ̀ a kadị trela bu ibu arọ. Ma, ọ dị garagara. Olee ihe mere o ji dị garagara? O nwere ihe ndị dị ka akpụ dị na nku ya. Ọ bụ ha na-enyere ya aka.

Ihe ị ga-echebara echiche: Weel na anụ ndị ọzọ bi na mmiri nwere nku na-akwọ mụrụmụrụ. Ma, weel nke a anyị na-ekwu okwu ya dị iche. Akpụ na-eju na nku ya. Ọ na-egwu mmiri, akpụ ndị ahụ dị na nku ya na-eme ka mmiri na-agbọli elu. Otú a mmiri si agbọli na-enyere azụ̀ a aka ifesi nku ya ike, bụ́kwanụ ihe na-eme ka ọ dị garagara. Akpụ ndị ahụ dị na nku ya na-enyekwara ya aka igwufe ebe mmiri na-achị ọkụ.

Ndị ọkachamara na-esi imi n’ala ka ha mara ma ò nwere otú nku azụ̀ a ga-esi nyere ha aka ka ha rụọ ụmara ụgbọ mmiri, njin na-adọpụta mmiri, ihe na-enye ọkụ, na ihe helikọpta ji efe.

Gịnị ka i chere? Nku weel a anyị na-ekwu okwu ya ọ̀ nọkatara dịrị, ka è kere ya eke?