Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere I Kwesịrị Iji Zere Mgbaasị

Ihe Mere I Kwesịrị Iji Zere Mgbaasị

Echiche Baịbụl

Ihe Mere I Kwesịrị Iji Zere Mgbaasị

N’OTU mba dị n’Eshia, ìgwè mmadụ nọ na-eme mkpọtụ n’otu ememme e ji akwanyere ndị mmụọ ùgwù. Ememme ahụ birikwuuru ọkụ mgbe a họpụtara ụmụ nwaanyị abụọ ka ndị mmụọ ọjọọ banye ha n’ime. Ụmụ nwaanyị ahụ kporopụrụ anya ma malite ịgba lịka lịka ka ndị akwụkwụ ji.

Na Puerto Rico, onye na-ajụ ndị mmụọ ase (bụ́ santero) jikeere ịkpọtụrụ mmụọ a na-akpọ Changó, chi égbè eluigwe. Onye ahụ na-ajụ ndị mmụọ ihe malitere ịkọ ihe ndị ọ na-ahụ, ndị niile nọ n’ime ụlọ ahụ malitekwara ịma jijiji dị ka ndị akwụkwụ na-adọ.

N’ọtụtụ mba, e nwere ọtụtụ ndị na-eme mgbaasị. E nweziela ọtụtụ ndị kweere n’ikike a na-anaghị ahụ anya, ọtụtụ ndị na-enwekwukwa mmasị na ya. Akwụkwọ, egwuregwu, ihe nkiri televishọn, na ihe nkiri ndị na-ekwu banyere ndị mmụọ ọjọọ, ndị amụsu, na ihe ndị karịrị ikike mmadụ na-ejupụtazi ebe niile ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

Ma, Baịbụl kụziiri anyị na ime ihe ọ bụla metụtara anwansi bụ nnọọ ime mgbaasị. Mgbaasị abụghị ihe egwuregwu. Ọ bụghị naanị mmadụ ịchọ ịmara ihe ọ na-amabughị. Ọ bụ iso ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi, emekọ ihe.—Mkpughe 12:9, 12.

N’ezie, ndị mmụọ ọjọọ na-eji mgbaasị eme ihe ndị na-akụ azụ ji ihe ndị e ji arata azụ eme. Onye ọ́kụ̀ azụ̀ na-eji ihe dị iche iche arata ụdị azụ dị iche iche. N’otu aka ahụ, ndị mmụọ ọjọọ na-eji ụdị dị iche iche nke mgbaasị eme ka ụdị mmadụ niile nọrọ n’okpuru ha. A kpọrọ onyeisi ndị mmụọ ọjọọ “chi nke usoro ihe [ọjọọ] a.” O nweela ike ime ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì ka ha wee ghara ịmata eziokwu nke Okwu Chineke, gharakwa ịmata nzube ya.—2 Ndị Kọrịnt 4:4.

Ihe Mgbaasị Na-eduga na Ya

E nwere naanị otu ihe ndị mmụọ ọjọọ chọrọ ịrụzu, nke bụ́: Ha chọrọ imegharị anyị anya ma duhie anyị ka anyị na Onye Kere anyị ghara inwe mmekọrịta chiri anya. Ha na-eme ka ndị mmadụ mara ụma nupụrụ ụkpụrụ ezi omume Chineke isi, ma ọ bụ mee otú ahụ n’amaghị ama. N’ihi ya, mgbaasị na-eme ka ihe mmadụ gharazie ịdị Chineke mma, ka mmadụ kwụsị inwe olileanya, ọ na-emesịkwa duje ná mbibi.—Mkpughe 21:8.

Luis, bụ́ onye Puerto Rico kwuru, sị: “Site na mgbe m bụ nwata, ndị ezinụlọ anyị na-eme mgbaasị. Ọ bụ okpukpe ezinụlọ anyị na ihe anyị na-eme mgbe niile. Echere m na ikike m nwere ịkọ ọdịnihu na ịkọwa ihe ndị dị na kaadị mgbaasị bụ ihe m bu pụta ụwa. Mgbe mgbe, m na-enwe ike ịtụtụlite kaadị e ji agba chaa chaa ma gwa ndị mmadụ nke ha ga-eji rite ego. Ọ dịghị ihe ọzọ Ekwensu ji ihe a m kpọrọ onyinye eme ma ọ́ bụghị igbochi m ịmata ihe dị na Baịbụl na ịghọ enyi Chineke.”—Jọn 17:3.

Ọtụtụ ndị nwere ike iche na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ imekọ ihe, nakwa na ọ badịrị uru. Ha nwere ike ikwu na e nwere ndị mmụọ ọjọọ na-enyere mmadụ aka ma ọ bụ kwuo na mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ imekọ ihe nwere ike imepe onye ahụ anya, ya enweta akụnụba, ma ọ bụ mee ka o nwee obi ụtọ. Nke a bụ nnọọ ụgha chara acha. Luis kwuru, sị: “Ọ ga-enwerịrị ihe ọ ga-efu gị.”

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Chad malitere ịdị na-ahụ ihe ndị na-atụ ụjọ, a na-akpọtekwa ya n’ụra mgbe ọ bụla o hiwere ụra. Ọ sịrị: “Ndị mmụọ ọjọọ malitere inye m nsogbu na imekpa m ahụ́ kwa abalị.” Olee otú anyị nwere ike isi chebe onwe anyị ka a ghara inye anyị ụdị nsogbu ahụ?

Otú Anyị Nwere Ike Isi Chebe Anyị

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ichebe onwe anyị, ọ dị mkpa ka anyị zere ihe ọ bụla ga-ejikọ anyị na mgbaasị. (Ndị Galeshia 5:19-21) N’ihi ya, Jehova Chineke nyere ndị na-ejere ya ozi iwu ka ha zere ihe ndị na-esonụ: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla . . . nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova, ọ bụkwa n’ihi ihe arụ ndị a ka Jehova bụ́ Chineke gị ji na-achụpụ ha n’ihu gị.”—Diuterọnọmi 18:10-12.

Iji mee ihe a Baịbụl kwuru, ọtụtụ ndị echebela onwe ha site n’ịtụfu akwụkwọ ma ọ bụ ihe ọ bụla gbasara mgbaasị. Ken, bụ́ onye kwụsịrị ime mgbaasị, kwuru, sị: “Agara m lee ihe niile m nwere ma bibie nke ọ bụla m chere na ọ dị njọ.”—Lee Ọrụ 19:19, 20.

Otú kasịnụ mmadụ nwere ike isi chebe onwe ya bụ iso ezi Chineke, bụ́ Jehova, na-enwe mmekọrịta. Lee ihe Jems 4:7, 8 sịrị na anyị kwesịrị ime: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ. Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso. Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere uche abụọ.”

Jehova Chineke na-akụziri ndị bịaruru ya nso ihe, ọ na-echebekwa ha. Ha abụghị “ndị na-amaghị atụmatụ” Setan, ọ naghịkwa eji oyiyi ọ na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè aghọgbu ha. (2 Ndị Kọrịnt 2:11; 11:14) Ọzọkwa, Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri okwukwe kpọkuo Jehova, ọ ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ kwụsị inye onye ahụ nsogbu. Chad, bụ́ onye e kwuburu okwu ya, sịrị, “Ịmata ebe ihe na-eme m sitere na ịkpọku Jehova Chineke ka o chebe m pụọ n’aka ha mere ka ọ kwụsị.”—Abụ Ọma 91:1, 2.

O doro anya na ndị nwere obi eziokwu nwere ike ịṅụrị ọṅụ ugbu a n’ihi nchebe Chineke na-enye nakwa n’ihi ịmata na n’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ndị mmụọ ọjọọ na ndị niile na-akwado ha. Chegodị ụdị ọṅụ na udo ga-ejupụta n’ụwa mgbe ụmụ mmadụ nweere onwe ha pụọ ná nsogbu niile nke mgbaasị na-akpata!—Aịzaya 11:9; Mkpughe 22:15.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee ụfọdụ mgbaasị Ndị Kraịst kwesịrị izere?—Diuterọnọmi 18:10-12; Mkpughe 21:8.

▪ Olee ndị na-akwado mgbaasị?—2 Ndị Kọrịnt 2:11; 11:14; Mkpughe 12:9, 12.

▪ Olee otú anyị nwere isi chebe onwe anyị pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ?—Jems 4:7, 8.

[Foto dị na peeji nke 14 na 15]

Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmụọ ọjọọ na-eji mgbaasị eme ihe ndị na-akụ azụ ji ihe ndị e ji arata azụ eme