Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tv Ọ̀ Na-ezu Ohi Oge?

Tv Ọ̀ Na-ezu Ohi Oge?

Tv Ọ̀ Na-ezu Ohi Oge?

ỌBỤRỤ na mmadụ enye gị otu nde dọla ka i wee kwụsị ikiri televishọn ná ndụ gị nile, ị̀ ga-akwụsị ya? Ihe a ka a jụrụ ụfọdụ ndị America n’afọ ole na ole gara aga. Otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla a jụrụ ajụjụ a zara na ha agaghị akwụsị ya. Ná nnyocha ọzọ e mere, a jụrụ ndị mmadụ ihe ndị kasị ha mkpa ná ndụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha kwuru na ọ bụ udo na obi ụtọ. Ma, nke ahụ bụ ihe nke abụọ ha kwuru na ọ bụ ya kasị ha mkpa. Ihe mbụ ha kwuru kasị ha mkpa ná ndụ bụ nnukwu TV!

Televishọn bụ ihe a ma nnọọ ama n’ụwa nile. Laa azụ n’afọ 1931, bụ́ mgbe a ka rụpụtara televishọn arụpụta, onyeisi oche Ụlọ Ọrụ America nke Na-ahụ Maka Iji Redio Agbasa Ozi, kwuru, sị: “Ozugbo a rụpụtara televishọn otú a chọrọ ka ọ dị, ọ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na mmadụ nile nọ n’ụwa ga na-ekiri ya.” O nwere ike ịbụ na okwu ndị ahụ yiri ihe na-agaghị eme eme n’oge ahụ, ma ọ dịghịzi otú ahụ taa. A na-ekwu na TV e nwere n’ụwa nile dị ihe dị ka otu ijeri na narị puku nde ise, ebe ndị na-ekiri ha karịrị nnọọ ọnụ ọgụgụ ahụ. Ma ì kwere ma i kweghị, televishọn na-enwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ ndị mmadụ.

Oge ọtụtụ mmadụ na-emefu n’ikiri TV abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. N’otu nnyocha e mere n’ụwa nile n’oge na-adịbeghị anya, a chọpụtara na e kewe awa ndị mmadụ ji ekiri TV kwa ụbọchị, onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-eketa ihe karịtụrụ awa atọ. Ndị bi n’Ebe Ugwu America na-eji awa anọ na ọkara ekiri ya kwa ụbọchị, ebe ndị bi na Japan na-eji awa ise ekiri ya kwa ụbọchị, nke pụtara na ọ bụ ha kasị ekiri TV. Ị gbakọta awa nile ahụ, ị ga-ahụ na ọ karịrị akarị. Ọ bụrụ na anyị na-eji awa anọ ekiri TV kwa ụbọchị, mgbe anyị ga-eru afọ 60, anyị ga-ejiwo afọ iri kirie TV. Ma, ọ dịghị onye n’ime anyị ga-achọ ka ihe a ga-ede n’ili ya ma ọ nwụọ bụrụ: “Ebe a ka e liri ezigbo enyi anyị, nke ji otu ụzọ n’ụzọ isii nke afọ ndụ ya kirie TV.”

Ihe mere ndị mmadụ ji ekiri TV ruo ọtụtụ awa ọ̀ bụ n’ihi na ihe a na-egosi na ya na-atọ ha ụtọ? Ọ bụchaghị ya. Ọtụtụ mmadụ kweere na ọ na-abụ ha mefuchaa oge dị ukwuu n’ikiri TV, ha atawa onwe ha ụta na ha ejighị oge ahụ mee ihe gaara aka abara ha uru. Ụfọdụ ana-ekwu na “ikiri TV eriela ha ahụ́.” N’eziokwu, TV apụghị iri gị ahụ́ otú ọgwụ ọjọọ si eri mmadụ ahụ́, ma ụzọ ha si eri ahụ́ yiri ibe ha. Ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ na-emefu oge dị ukwuu n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ọ bụ eziokwu na ha chọrọ iwetulata aka n’oge ha na-emefu n’ịṅụ ya, ma ọ bụdị kwụsị ịṅụ ya kpamkpam, ma ọ naghị ekwe ha. Ha na-eji oge ha kwesịrị iji mee ihe ndị dị mkpa n’ime ezinụlọ ha nakwa n’ebe ndị ọzọ, aṅụ ya. Ha kwụsịkwa ịṅụ ya, ya enyewe ha nsogbu n’ahụ́. Ọ pụkwara ịdị otú a n’ebe ndị na-ekirikarị TV nọ.

Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Ịracha mmanụ aṅụ hie nne adịghị mma.” (Ilu 25:27) A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ikiri TV. Ọ bụ eziokwu na ezigbo ihe a na-egosi na televishọn dị ọtụtụ, mmadụ iji oge dị nnọọ ukwuu ekiri ya pụrụ ime ka ọ ghara ịdị na-ewepụtacha oge iji soro ndị ezinụlọ ya nọkọọ, ọ pụrụ ime ka ụmụaka ghara ịgbata ihe n’ụlọ akwụkwọ na ịmụta ịgụ ihe nke ọma, ọ pụkwara ime ka mmadụ buo oké ibu. Ọ bụrụ na ị na-eji oge dị nnọọ ukwuu ekiri TV, ọ bụ ihe amamihe dị na ya iche echiche banyere ihe ị na-erite na ya. Oge dị oké ọnụ ahịa, ọ dịghịkwa mma imefusị ya emefusị. Ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya ichebara ihe anyị na-ekiri echiche. Anyị ga-atụle banyere ya n’isiokwu na-esonụ.