Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ule nke Okwukwe

Ule nke Okwukwe

Ule nke Okwukwe

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GREAT BRITAIN

RICHMOND bụ ọmarịcha obodo nke dị na North Yorkshire, England. A na-anọ ná nnukwu ụlọ elu dị na ya, bụ́ nke e wuru mgbe mmeri Norman n’afọ 1066 gasịrị, ahụ ndagwurugwu nke osimiri Swale nakwa Ogige Nchekwa Anụmanụ nke Yorkshire Dales.

Ihe omume telivishọn bụ́ The Richmond Sixteen (Mmadụ Iri na Isii A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond), ekpughewo akụkụ dị mkpa nke ihe ndị mere ná nnukwu ụlọ elu ahụ n’oge na-adịbeghị anya—ọnọdụ nke mmadụ 16 jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ha bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ebe ahụ n’oge Agha Ụwa nke Mbụ. Gịnị mere ha?

Ịnwụde Mmadụ Iji Jee Agha

Mgbe Britain malitesịrị ịlụ agha n’afọ 1914, ịhụ mba n’anya mere nnọọ ka ihe dị ka nde mmadụ 2.5 banye n’òtù ndị agha ya. Otú ọ dị, n’ihi ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị agha a na-egbu, nakwa anya ọ bịara doo na agha ahụ agajeghị ibi ngwa ngwa otú ndị ọchịchị kwere nkwa ya, “ịba n’òtù ndị agha bịara bụrụ ihe a na-adịghịzi arịọta n’arịrịọ, kama ihe a na-amanye mmadụ n’ike,” ka Alan Lloyd, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere agha na-ekwu. Ya mere, na March 1916, na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme nke mba Britain, a malitere ịnwụde ndị ikom na-alụbeghị nwunye ịbanye n’òtù ndị agha.

E hiwere ụlọikpe ndị agha dị 2,000 iji leba anya n’okwu ikpe dị iche iche, ma, ọ bụ nanị ole na ole n’ime ndị ahụ jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ha ka a gụpụrụ kpam kpam n’ije agha. E nyere ihe ka ukwuu ná ndị jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ha iwu ịbanye n’òtù ndị na-esoghị alụ agha ahụ, bụ́ ndị e guzobere iji na-akwado ndị na-alụ agha. A ka nọgidere na-ele ndị jụrụ ịbanye n’òtù ndị ahụ anya dị ka ndị a nwụdere iji jee agha, a kpụpụkwara ha n’ụlọikpe ndị agha. E mekpọrọ ha ọnụ ma tụọ ha mkpọrọ, mgbe mgbe, n’ụlọ mkpọrọ ndị dị njọ ma dị mkpagide.

Mmadụ Iri na Isii A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond

N’ime Mmadụ Iri na Isii ahụ A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond, ise bụ Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Herbert Senior, bụ́ onye ghọrọ Onye Mmụta Bible n’afọ 1905 mgbe ọ dị afọ 15, dere n’ihe dị ka afọ 50 mgbe nke ahụ gasịrị, sị: “E tinyere anyị n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ndị yitewere ọnụ ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala. Ikekwe, e jibeghị ha mee ihe kemgbe ọtụtụ afọ, ebe ọ bụ na ikpo ahịhịa dị n’ala ha ruru sentimita ise ma ọ bụ asaa.” E mewo ka ọha na eze kirie ihe osise na ihe odide, bụ́ ndị a na-adịghịzi ahụ nke ọma n’ebe ụfọdụ, bụ́ ndị ndị mkpọrọ sekasịrị ma dekasịchaa n’ahụ́ ájá nke ọnụ ụlọ mkpọrọ ha. Ha na-agụnye aha, ozi, na ihe osise nke ndị ha hụrụ n’anya, tinyekwara okwu ndị na-ewusi okwukwe ike.

Otu onye mkpọrọ dere nnọọ, sị: “Ọ kaara m mma ịnwụ n’ihi ịgbaso ụkpụrụ kama ịnwụ n’ihi agbasoghị ụkpụrụ.” Ọtụtụ n’ime ozi ndị ahụ zoro aka n’ebe Jizọs Kraịst nọ nakwa n’ozizi ya, e nwekwara ihe yiri obe na okpueze ndị a kpachaara anya see, bụ́ nke Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile ji mee ihe n’oge ahụ. Herbert Senior kwuru na ya sere n’ahụ́ ájá nke ọnụ ụlọ mkpọrọ ya, ihe osise bụ́ “Chart of the Ages” (Chaatị nke Ọgbọ Dị Iche Iche) nke dị n’akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ The Divine Plan of the Ages, ma a chọtabeghị ya. Ọ pụrụ ịbụ na a hụghịzi ebe e sere ya na ihe odide ndị ọzọ n’ahụ́ ájá nke nnukwu ọnụ ụlọ mkpọrọ ahụ ma ọ bụ n’ebe ọzọ. Ihe odide ọzọ na-agụ, sị: ‘Clarence Hall, Leeds, I.B.S.A. May 29, 1916. E zigara ya France.’

E Zigara Ha France—Zighachikwa Ha!

Ndị soja a na-egbu n’agha na France na Belgium nọ na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu. Minista na-ahụ maka agha bụ́ Horatio Herbert Kitchener na Ọchịagha Britain bụ́ Douglas Haig chọsiri nnọọ ike inwetakwu ndị agha, gụnyekwara ndị ikom lụrụ nwunye, bụ́ ndị a malitere ịnwụde iji jee agha ka ọ na-erule May 1916. Iji manye ndị mmadụ ije agha, ndị ọchịchị kpebiri iji ndị ahụ jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ha dọọ ndị ọzọ aka ná ntị. Ya mere, a tụgidere Mmadụ Iri na Isii ahụ A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond égbè ma gwa ha, n’ụzọ megidere iwu, ka ha banye n’ụgbọ okporo ígwè ka ị́gà dịcha ha n’aka, ma zoro ezoro si n’ụzọ azụ ụlọ buga ha France. Mgbe ha ruru n’ụsọ mmiri nke Boulogne, ka magazin bụ́ Heritage na-ekwu, “e ji waya nwere ogwu kegidesịa ndị ikom ahụ n’osisi, ihe fọrọ nke nta ka o yie nnọọ ka à na-aga ịkwụgbu ha akwụgbu,” ma mee ka ha kirie ka a na-agbagbu onye agha Britain gbara ọsọ. A gwara ha na ọ bụrụ na ha emeghị ihe a gwara ha mee, na a ga-agbagbukwa ha otú ahụ.

N’ọkara ọnwa June nke afọ 1916, e duuru ndị mkpọrọ ahụ gafee n’ihu ndị agha 3,000 iji nụ amamikpe ọnwụ a mara ha, ma ka ọ na-erule n’oge a, Kitchener anwụọla, praịm minista nke Britain batakwara n’okwu ahụ. Otu mpempe akwụkwọ ozi ruru ndị isi nọ na London aka, e wee kagbuo iwu ahụ ndị agha nyere. E nyere Ọchịagha Haig iwu ịgbanwe amamikpe ọnwụ nile ahụ gaa na mkpọrọ afọ iri nke ọrụ ike.

Mgbe ha lọghachiri na Britain, a kpọọrọ mmadụ 16 ahụ gaa n’otu ebe a na-agbari okwute na Scotland ịrụ “ọrụ baara mba ha uru” n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha, ka otu akụkọ kwuru. E zighachiri Herbert Senior na ndị ọzọ n’ụlọ mkpọrọ ndị nkịtị, ọ bụghị nke ndị agha.

Ihe Mmụta nke Dị na Ya

Ebe ọ bụ na ahụ́ ájá nke ụlọ mkpọrọ ahụ esighịzi ike, otu n’ime ihe ndị e ji eme ihe n’ihe ngosi zuru ezu a na-eme ná nnukwu Ụlọ Elu ahụ dị na Richmond, bụ́ nke dị ugbu a n’aka òtù bụ́ English Heritage, bụ kọmputa nke na-egosi otú ihe dị kpọmkwem, bụ́ nke na-eme ka ndị nleta nwee ike ịhụ ime ụlọ mkpọrọ ahụ na ihe ndị e sekasịrị ma dekasịa na ha n’emebighị ha. A na-agba ìgwè ụmụ akwụkwọ dị iche iche ume ka ha ghọta ihe mere ndị ahụ jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ha ji dị njikere ịta ahụhụ, ịga mkpọrọ, nakwa ma eleghị anya ikwe ka a gbagbuo ha n’ihi nkwenkwe ndị ha ji ezi obi nwee.

N’ụzọ gara nnọọ nke ọma, Mmadụ Iri na Isii ahụ A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond “mere ka ọha na eze mara ihe mmadụ ịjụ ije agha n’ihi akọ na uche ya pụtara, ma malite ịnabata na inwe nkwanye ùgwù maka ya.” Nke a mere ka ndị ọchịchị ghọtakwuo ụzọ ha ga-esi na-emeso ndị debanyere aha ha n’akwụkwọ dị ka ndị jụrụ ije agha n’ihi akọ na uche ha, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ahụ.

N’afọ 2002, a raara otu akụkụ nke ọmarịcha ogige dị na mbara nke nnukwu ụlọ elu ahụ nye n’aha Mmadụ Iri na Isii ahụ A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond iji na-echeta nnọgide ha nọgidesiri ike n’ihe ha kweere.

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Nnukwu Ụlọ Elu nke Richmond bụ́ nke a rụrụ na narị afọ nke 12, na ụlọ nwere ọnụ ụlọ mkpọrọ dị iche iche

Herbert Senior, otu n’ime Mmadụ Iri na Isii ahụ A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond

Otu n’ime ọnụ ụlọ mkpọrọ ndị ahụ a kpọchiri Mmadụ Iri na Isii ahụ A Tụrụ Mkpọrọ na Richmond

Ihe osise e ji gbaa peeji gburugburu: Akụkụ nke ihe ndị e dekasịrị ma sekasịa n’ahụ́ ájá ụlọ mkpọrọ ahụ eri ọtụtụ afọ gara aga