Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iṅụbiga Mmanya Ókè Ọ̀ Dị Nnọọ Njọ n’Ezie?

Iṅụbiga Mmanya Ókè Ọ̀ Dị Nnọọ Njọ n’Ezie?

 Echiche nke Bible

Iṅụbiga Mmanya Ókè Ọ̀ Dị Nnọọ Njọ n’Ezie?

RUO ọtụtụ afọ, ndị aṅụrụma ihe ha na-amasị ndị mmadụ, bụ́ ndị na-eme ya n’ihe nkiri iji kpaa ndị mmadụ ọchị, abụwo ihe a na-ahụkarị n’ọgbọ ihe nkiri nakwa n’ihe ngosi telivishọn. N’agbanyeghị na ndị na-eme ihe ngosi dị otú ahụ pụrụ ịnọ na-eme ya nnọọ dị ka ihe nkiri, ụdị ịkpa ọchị ha na-egosi echiche megidere onwe ya ọtụtụ ndị nwere banyere ịṅụbiga mmanya ókè, ha na-ele ya anya dị ka adịghị ike, ee, ma bụrụ ihe na-adịchaghị emerụ ahụ́.

N’ezie, ịṅụbiga mmanya ókè abụghị ihe ọchị. Òtù Ahụ́ Ike Ụwa kwuru na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè bụ otu n’ime ihe ndị kasị emebi ahụ́ ike n’ụwa nile. A sịrị na e wezụga iri ahụ́ nke ụtaba, ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè na-akpatara ndị mmadụ ọnwụ na ọrịa karịa ka iji ihe ọ bụla ọzọ na-eri ahụ́ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi si akpata, ọ na-efukwa nanị America ihe karịrị ijeri dollar 184 n’afọ.

N’agbanyeghị eziokwu ndị a, ọtụtụ ndị nọgidere na-ewere ịṅụbiga mmanya ókè dị ka ihe na-adịghị oké njọ. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ikweta na ịṅụbiga ya ókè ruo ogologo oge na-enwe mmetụta na-adịghị mma, ha ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla dị n’ịṅụ oké mmanya n’oge ụfọdụ. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ndị na-eto eto na-ele ịṅụbiga mmanya ókè anya dị ka ihe e ji ama na mmadụ etoola. N’agbanyeghịkwa ịdọ aka ná ntị siri ike òtù ahụ́ ike dị iche iche na-enye, ịṅụ oké mmanya na-arịwanye elu n’ụzọ dị ịrịba ama n’etiti ndị nọ n’afọ ndụ nile. N’ihi ya, o kwere nghọta na ọtụtụ ndị na-eche ma ịṅụ oké mmanya ọ̀ dị nnọọ njọ n’ezie. Gịnị ka Bible na-ekwu?

Mmanya na Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya —Onyinye Si n’Aka Chineke

E nwere ọtụtụ ebe e zoro aka banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ime Bible. Eze Solomọn  dere, sị: “Jee, were ọṅụ rie nri gị, werekwa obi dị mma ṅụọ mmanya [vaịn] gị; n’ihi na ọrụ gị nile atọwo Chineke ụtọ na mgbe dị anya gara aga.” (Eklisiastis 9:7) Ọbụ abụ ahụ kwetara na Jehova Chineke bụ Onye na-enye “mmanya [vaịn] nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:14, 15) O doro anya na mmanya so n’onyinye ndị Jehova ji gọzie ihe a kpọrọ mmadụ.

N’ụzọ doro anya, Jizọs kwadoro ịṅụ mmanya. N’ezie, ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ bụ ime mmiri ka ọ ghọọ mmanya bụ́ ịgba n’otu ememe alụmdi na nwunye. (Jọn 2:3-10) O jikwa mmanya mee ihe dị ka ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke ọbara ya mgbe ọ na-eguzobe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. (Matiu 26:27-29) Ọbụna Bible kwuru na mmanya nwere ihe ndị na-agwọ ọrịa, n’ihi na Pọl onyeozi gbara Timoti ume ka ọ “na-eji obere mmanya eme ihe maka afọ [ya].”—1 Timoti 5:23; Luk 10:34.

Ihe Bụ́ Isi Bụ Ịṅụru Ya n’Ókè

Rịba ama na Pọl tụrụ aro ịṅụ nanị “obere mmanya.” N’ụzọ doro anya, Bible na-akatọ ụdị nile nke ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè. Ndị nchụàjà bụ́ ndị Juu nweere onwe ha ịṅụru mmanya n’ókè mgbe ha na-anọghị n’ọrụ. Otú ọ dị, a machibidoro ha iwu ịṅụ ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-aba n’anya mgbe ha na-arụ ọrụ nchụàjà. (Levitikọs 10:8-11) Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, a dọrọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ná ntị na ndị aṅụrụma “agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

Ọzọkwa, ná ntụziaka o nyere Timoti, Pọl kwuru na ndị na-edu ndú n’ọgbakọ apụghị ịbụ ‘ndị aṅụrụma na-ese okwu’ ma ọ bụ bụrụ “ndị na-aṅụ oké mmanya.” * (1 Timoti 3:3, 8) N’ezie, Bible nyere iwu ka a chụpụ ndị aṅụrụma na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo ya n’ụzọ dabara adaba, “onye na-akwa emo ka mmanya [vaịn] bụ.” (Ilu 20:1) Ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè pụrụ ime ka onye na-aṅụ ya gharazie inwe ike ịchịkwa onwe ya na ime mkpebi ndị dị mma.

Ihe Mere Okwu Chineke Ji Katọọ Ịṅụbiga Mmanya Ókè

Jehova, bụ́ ‘Onye na-ezi anyị ime ihe na-aba uru,’ maara na mgbe anyị ji ihe ọ bụla mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, anyị ga-emerụ onwe anyị na ndị ọzọ ahụ́. (Aịsaịa 48:17, 18) Otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Okwu Chineke na-ajụ, sị: “Ònye nwere ahụhụ? ònye nwere iru újú? ònye nwere ise okwu? ònye nwere ntamu? ònye nwere ogbugbu mma n’efu? ònye nwere anya na-acha ọbara ọbara?” Ọ na-aza, sị: “Ọ bụ ndị na-anọ ná mmanya [vaịn] ogologo mgbe; ndị na-aba n’ụlọ ịchọpụta mmanya a gwara agwa.”—Ilu 23:29, 30.

Ndị mmadụ emewo ọtụtụ ihe nzuzu na ihe ndị dị ize ndụ mgbe ha ṅụbigara ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè: ịkwọ ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ha na itinye onwe ha na ndị ọzọ n’ihe ize ndụ, igosi di ma ọ bụ nwunye onye ọzọ ịhụnanya gabiga ókè na ibibi nnọọ mmekọrịta, ikwu okwu na ime ihe nzuzu ma ọ bụkwanụ ihe rụrụ arụ. (Ilu 23:33) E kwuwo n’ụzọ ziri ezi na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè bụ otu n’ime nsogbu ndị kasị ebibi ihe n’ime nsogbu nile nke ọha bụ́ ndị na-akpa ihe a kpọrọ mmadụ aka ọjọọ taa. Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji na-agba ume, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya [vaịn] ókè”!—Ilu 23:20.

Ndị Galeshia 5:19-21, Pọl depụtara ịṅụ oké mmanya na oriri oké mkpọtụ dị ka “ọrụ nke anụ ahụ́” bụ́ ndị na-emegide mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè ga-emebi mmekọrịta mmadụ na Chineke. Ya mere, n’ụzọ doro anya, Ndị Kraịst kwesịrị izere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ ọ bụla na-ezighị ezi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ebe ọ bụ na ndị nlekọta kwesịrị ịbụ ndị nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ n’ụzọ ha si eme mkpebi nakwa n’akparamàgwà, na-egosipụta ụkpụrụ dị elu nke Jehova ruo ókè ha nwere ike, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na a ga-achọkwa otu ihe ahụ n’aka Ndị Kraịst ndị ọzọ.