Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmiri Ọ̀ Na-agwụnahụ Ụwa?

Mmiri Ọ̀ Na-agwụnahụ Ụwa?

Mmiri Ọ̀ Na-agwụnahụ Ụwa?

“Inweta mmiri dị mma, nke na-adịghị ize ndụ, nke a na-emetọghị emetọ nakwa nke zuru ezu bụ isi ihe dị ụmụ mmadụ mkpa iji nọgide na-adị ndụ, na-enwe ọganihu ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya nakwa n’ụzọ akụ̀ na ụba. Otú ọ dị, anyị na-anọgide na-akpa àgwà dị ka a ga-asị na mmiri dị mma juru eju mgbe nile. Ọ dịghị otú ahụ.”—KOFI ANNAN, ODEAKWỤKWỌ UKWU ÒTÙ MBA NDỊ DỊ N’OTU.

N’IME puku afọ gara aga, òtù ikpe pụrụ iche ezukọwo n’ehihie Thursday nile n’obodo bụ́ Valencia dị na Spain. Ọrụ ya bụ idozi esemokwu banyere mmiri.

Ndị ọrụ ugbo nọ n’ala dị larịị nke na-emepụta ihe nke Valencia na-adabere n’ịgba ala mmiri, ịgba ala mmiri na-achọkwa mmiri dị ukwuu—bụ́ nke nọgideworo na-adị ụkọ n’akụkụ a nke Spain. Ndị ọrụ ugbo ahụ pụrụ ịkpọku òtù ikpe ahụ na-ahụ maka mmiri mgbe ọ bụla ha chere na ha anaghị enweta òkè ruuru ha. Esemokwu banyere mmiri abụghị ihe ọhụrụ, ma ọ na-esi ike idozi ha n’ụzọ ziri nnọọ ezi dị ka ọ dị na Valencia.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 4,000 gara aga, ajọ esemokwu dapụtara n’etiti ndị ọzụzụ atụrụ banyere ikuru mmiri n’otu olulu mmiri dị nso na Bịa-sheba dị n’Israel. (Jenesis 21:25) Nsogbu mmiri e nwere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa akawokwa nnọọ njọ kemgbe ahụ. Ọ dịkarịa ala, ndị ndú abụọ a ma ama nọ n’ógbè ahụ ekwuwo na mmiri bụ otu ihe pụrụ ime ka ha busoo mba ha na ha gbara agbata obi agha.

Ná mba ụwa ndị a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo na ha, mmiri anọwo na-akpali mmetụta siri ike mgbe nile. Ihe kpatara ya dị mfe nghọta: Mmiri dị oké mkpa maka ndụ. Dị ka Kofi Annan kwuru, “mmiri dị ọcha bara oké uru: anyị apụghị ịdị ndụ ma ọ bụrụ na ọ dịghị. A pụghị iji ihe ọzọ dochie anya ya: ọ dịghị ihe ndị ọzọ a pụrụ iji mere mmiri. Ihe pụkwara imetọ ya n’ụzọ dị mfe: ihe omume mmadụ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ọdịdị na n’otú mmiri dị mma e nwere haruru.”

Taa, a na-eyi ma ọdịdị ma otú mmiri dị mma e nwere na mbara ala anyị haruru egwu otú a na-emetụbeghị mbụ. Oyiyi o yiri ka e nwere mmiri buru ibu n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa nwere ihe ndabara ọma, ekwesịghị imegharị anyị anya.

Ọdọ Mmiri nke Na-atalata Atalata

“Otu n’ime ihe ndị na-emegide onwe ha nke ukwuu n’àgwà ụmụ mmadụ bụ na anyị na-eji ihe akpọrọ ihe nanị mgbe ọ kọrọ ụkọ,” ka Osote Odeakwụkwọ Ukwu nke UN bụ́ Elizabeth Dowdeswell kwuru. “Anyị na-amata uru mmiri bara nanị mgbe olulu mmiri tara. Olulu mmiri na-atakwa ọ bụghị nanị n’ebe ndị a na-enwe ụkọ mmiri ozuzo kamakwa n’ebe ndị a na-ejibughị ụkọ mmiri mara.”

Ndị na-eche ụkọ mmiri ihu kwa ụbọchị ga-aghọta nsogbu ahụ nke ọma. Asokan, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’ọfịs na Madras, India, aghaghị iteta awa abụọ tupu chi abọọ kwa ụtụtụ. Ọ na-eburu bọket ise, gaa na pọmpụ mmiri ọha, nke na-ewe ije ije minit ise site n’ụlọ ya. Ebe ọ bụ na mmiri na-agba nanị n’agbata elekere anya 4:00 nke ụtụtụ na elekere anya 6:00 nke ụtụtụ, ọ ghaghị ịkwụnye n’ahịrị n’oge. Mmiri o bulatara na bọket ya aghaghị izuru ya ụbọchị ahụ nile. Ọtụtụ ndị India ibe ya—na otu ijeri ndị ọzọ nọ na mbara ala—enweghị ihe ndabara ọma dị otú ahụ. Ha enweghị pọmpụ mmiri, osimiri, ma ọ bụ olulu mmiri dị nso n’ebe obibi ha.

Abdullah, bụ́ nwata nwoke bi n’ógbè Sahel nke Africa, bụ otu n’ime ndị dị otú ahụ. Otu saịn bọọdụ nke na-egosi na e rutela obodo nta ha na-akọwa ya dị ka ala mmiri dị n’ọzara; ma mmiri ahụ emiela ala kemgbe, ọ fọkwara nke nta ka a ghara ịhụ osisi ọ bụla. Abdullah nwere ọrụ nke ikutere ezinụlọ ya mmiri site n’otu olulu mmiri dị ihe karịrị otu kilomita site n’ebe obibi ha.

N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ọchịchọ a na-achọ mmiri dị mma ma dị ọcha amalitelarị ịkarị ókè a na-enweta. Ihe kpatara ya doro anya: Akụkụ dị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ bi n’ebe kpọrọ nkụ ma ọ bụ ebe a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo, bụ́ ebe mmiri kọworo ụkọ eri ogologo oge. (Lee map dị na peeji nke 15.) Dị ka Ụlọ Ọrụ Stockholm Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi si kwuo, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa ebirilarị n’ebe ndị na-enwetụ ụkọ mmiri ma ọ bụ oké ụkọ mmiri. Ọchịchọ a na-achọkwa mmiri ejiriwo ihe karịrị okpukpu abụọ rịa elu karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ọnụ ọgụgụ mmadụ ji arị elu.

N’ụzọ bụ́ isi, mmiri e nwere, n’aka nke ya, adịghị etinyetụ ihe. Olulu mmiri ndị ka mie emie na ọdọ mmiri ndị ọhụrụ pụrụ ime ka ihe ka mma ruo nwa oge, ma n’ụzọ bụ́ isi ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri na-ezo n’elu ala na ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri a na-echekwa n’ime ala na-abụkarị otu ihe ahụ. Ya mere, ndị ọkà mmụta ihu igwe na-agụkọ na n’ime afọ 25, ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri onye ọ bụla nọ n’ụwa na-enweta n’otu n’otu pụrụ ibelata ruo ọkara.

Mmetụta Ọ Na-enwe n’Ahụ Ike Nakwa n’Ihe Oriri

Olee otú ụkọ mmiri si emetụta ndị mmadụ? Nke mbụ, ọ na-ebibi ahụ ike ha. Ọ bụghị na ha ga-anwụ n’ihi akpịrị ịkpọ nkụ; kama, adịghị ọcha nke mmiri ndị e ji esi nri na ndị a na-aṅụ aṅụ pụrụ ime ka ha rịawa ọrịa. Elizabeth Dowdeswell na-ekwu na “ọ bụ mmiri e metọrọ emetọ na-akpata ihe dị ka pasent 80 nke ọrịa nile a na-arịa na ihe karịrị ọnwụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị nile na-anwụ ná mba ndị ka na-emepe emepe.” Ná mba ndị a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo na ha ndị dị n’akụkụ ụwa ka na-emepe emepe, a na-ejikarị nsị̀ mmadụ na nke anụmanụ, ọgwụ ahụhụ, fatịlaịza, ma ọ bụ mmiri ọgwụ ndị a na-emepụta n’ụlọ ọrụ emetọ mmiri. Ezinụlọ dara ogbenye nwere ike ha agaghị enwe ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ bụghị iji mmiri ndị ahụ e metọrọ emetọ na-eme ihe.

Dị nnọọ ka mmiri dị ahụ anyị mkpa iji wepụ ihe ndị ahụ na-achọghị, mmiri dị ukwuu dị mkpa iji debe ihe ọcha n’ụzọ kwesịrị ekwesị—mmiri nke na-adịghị nnọọ adị nye ihe dị ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ. Ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị usoro idebe ihe ọcha zuru ezu rịrị elu site n’ijeri 2.6 na 1990 ruo ijeri 2.9 na 1997. Nke a fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị nọ na mbara ala. Idebe ihe ọcha bụ n’ụzọ nkịtị okwu metụtara ọnwụ na ndụ. Ná nkwupụta ha gbakọrọ aka mee, ndị ọrụ òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ Carol Bellamy na Nitin Desai dọrọ aka ná ntị, sị: “Mgbe ụmụaka na-enweghị mmiri dị mma ọṅụṅụ na usoro idebe ihe ọcha, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ahụ ike na uto ha na-adị n’ihe ize ndụ.”

Imepụta nri na-adabere na mmiri. N’ezie, ọ bụ mmiri ozuzo na-agba ọtụtụ ihe a kụrụ akụ mmiri, ma n’oge na-adịbeghị anya, ịgba ala mmiri aghọwo ihe dị oké mkpa n’ịzụ ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị bi n’ụwa. Taa, pasent 36 nke owuwe ihe ubi n’ụwa na-adabere n’ịgba ihe a kụrụ akụ mmiri. Ma ebe nile a kụrụ ihe n’ụwa bụ́ ndị a na-agba mmiri ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu n’ihe dị ka afọ 20 gara aga, ọ nọgidewokwa na-ebelata kemgbe ahụ.

Ọ bụrụ na mmiri na-esi na pọmpụ ọ bụla dị n’ụlọ anyị agbapụta n’ụba, ọ bụrụkwa na anyị nwere ọ́kwá mposi dị ọcha nke na-eji mmiri ebupụ n’ụzọ dị mfe ihe ndị si anyị n’ahụ pụta, ọ pụrụ isi ike ikweta na ụwa anaghịzi enweta mmiri zuru ezu. Otú ọ dị, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ nanị pasent 20 nke ihe a kpọrọ mmadụ na-anụ ụtọ ihe ọma dị otú ahụ. N’Africa, ọtụtụ ndị inyom na-eji ihe ruru nnọọ awa isii echu mmiri kwa ụbọchị—ọ na-abụkarịkwa nke e metọrọ emetọ. Ndị inyom a na-aghọta n’ụzọ doro nnọọ anya karị otu eziokwu dị mwute: Mmiri dị ọcha, nke na-adịghị ize ndụ, dị ụkọ, ọ na-adịwanyekwa ụkọ.

Nkà na ụzụ ọ̀ pụrụ ịgwọta nsogbu ahụ? À pụrụ ijikwu nwayọọ nwayọọ na-eji mmiri eme ihe? Olee ebe mmiri ahụ nile gaworo? Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Igbe/Ihe Osise dị na peeji 16]

EBE MMIRI DỊ MMA DỊ

Ihe dị ka pasent 97 nke mmiri dị n’elu ala dị n’oké osimiri ma na-atọ nnu nnu nke ukwuu nke na a pụghị ịṅụ ya anụ, iji ya arụ ọrụ ugbo, na iji ya emepụta ihe.

Ọ bụ nanị pasent 3 nke mmiri dị n’ụwa dị mma. Ma, ihe ka ukwuu n’ime ya adịghị n’ebe aka ga-eru n’ụzọ dị mfe, dị ka ihe osise na-esonụ na-egosi.

[Ihe Osise]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ice na snow na-adịgide adịgide 68.7%

Mmiri dị n’ime ala 30.1%

Ime ala kpụkọrọ akpụkọ n’ihi oyi, ice dị n’ime ala 0.9%

Ọdọ mmiri, osimiri, na ala apịtị 0.3%

[Igbe dị na peeji nke 17]

NSOGBU MMIRI

MMETỌ Na Poland, nanị pasent 5 nke mmiri dị n’osimiri dị mma ọṅụṅụ, e metọkwara pasent 75 n’ime ya emetọ nke na a pụghị ọbụna iji ya eme ihe n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe.

MMIRI NDỊ BI N’EBE MEPERE EMEPE NA-ENWETA Na Mexico City, bụ́ isi obodo nke abụọ kasị ukwuu n’ụwa, elu mmiri nke dị n’ime ala, bụ́ ebe e si enweta pasent 80 nke mmiri obodo ukwu ahụ na-eji eme ihe, na-agbadata agbadata n’esepụghị aka. Mmiri a na-adọrọ na-eji ihe karịrị pasent 50 akarị nke mmiri ozuzo na-edochi. Beijing, nke bụ́ isi obodo China, nwere nsogbu yiri nke ahụ. Ọdọ mmiri ya dị n’ime ala atalatawo ruo ihe karịrị otu mita n’afọ, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke olulu mmiri ya atawokwa.

ỊGBA ALA MMIRI Nnukwu ọdọ mmiri dị n’ime ala Ogallala nke dị na United States atalatawo nnọọ nke ukwuu nke na ala a na-agba mmiri n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Texas ejiriwo otu ụzọ n’ụzọ atọ belata n’ihi ụkọ mmiri. Ma China ma India, bụ́ ndị nke abụọ na nke atọ kasị emepụta ihe oriri, na-eche nsogbu yiri nke ahụ ihu. N’ebe ndịda steeti India bụ́ Tamil Nadu, ịgba ala mmiri emewo ka elu mmiri nke dị n’ime ala gbadaa ruo ihe karịrị mita 23 n’ime afọ iri.

OSIMIRI NDỊ NA-APỤ N’ANYA N’oge ọkọchị, nnukwu osimiri Ganges adịghịzi asọru n’oké osimiri, ebe ọ bụ na a na-eche mmiri ya nile ihu gaa n’ebe ọzọ tupu mgbe ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa Osimiri Colorado dị n’Ebe Ugwu America.

[Map dị na peeji 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

EBE MMIRI NA-ADỊGHỊ EZU EZU

Ebe ndị e nwere ụkọ mmiri