Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ekpere M?

Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ekpere M?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ekpere M?

“Ana m ekpe ekpere banyere ihe nile n’ihi na Jehova bụ enyi m, amakwaara m na ọ ga-enyere m aka ma m nwee nsogbu.”—Andrea.

ANDREA na-eto eto ji n’aka na Chineke na-anụ ekpere ya. Ma ọ bụghị ndị nile na-eto eto nwere obi ike otú ahụ. Ụfọdụ ndị na-eche na ha nọpụrụ ebe dị nnọọ anya site n’ebe Chineke nọ nke na ọ ga-esiri ha ike ịgakwuru ya. Ha pụrụ ọbụna iche ma Chineke ọ̀ na-echecha banyere ha nke ga-eme ka o kwesị ekwesị ka ha kpegara ya ekpere.

Gịnị bụ isi ihe na-eme ka ekpere rụpụta ihe? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ ime ka gị na Chineke bụrụ enyi n’ezie. Ọbụ abụ ahụ kpere ekpere, sị: “Ndị maara aha Gị ga-atụkwasị Gị obi.” (Abụ Ọma 9:10) Gịnị banyere gị? Ị̀ maara Chineke nke ọma nke na ị pụrụ ikpegara ya ekpere ma tụkwasị ya obi na ọ ga-aza gị? Tupu ị gụrụ gaa n’ihu, biko gbalịa ịza ajụjụ ndị dị n’igbe ahụ isiokwu ya bụ́ “Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ị Maara Chineke?” Ole ka ị pụrụ ịza?

RUO ÓKÈ HÀ AṄAA KA Ị MAARA CHINEKE? Azịza ha dị na peeji nke 31

1. Gịnị bụ aha Chineke, gịnịkwa ka ọ pụtara?

2. Gịnị ka Bible na-ekpughe na ha bụ àgwà anọ bụ́ isi nke Chineke?

3. Gịnị bụ ngosipụta kasị ukwuu nke ịhụnanya nke Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ?

4. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ enyi Chineke?

5. Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị mgbe anyị na-ekpere ekpe?

Ì nwere ike ịza ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ ugbu a, ọbụna tupu ị gụtọpụ isiokwu a? Ya bụrụ otú ahụ, ị maraworị Chineke karịa ka ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ maara. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na azịza gị na-egosi na ọ dị gị mkpa inwetakwu ihe ọmụma banyere ya, ịbịa mara ya nke ọma karị. (Jọn 17:3) Iji mee nke ahụ, tụlee nanị ihe ole na ole n’ime ihe ndị Bible na-akụziri anyị banyere “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.

Chineke Bụ Onye Dị Adị n’Ezie

Nke mbụ, Bible na-enyere anyị aka ịghọta na Chineke abụghị ikike na-abụghị onye. Ọ bụ onye nke nwere aha, bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) N’asụsụ Hibru aha ahụ pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ọ pụrụ ịghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ iji mezuo nzube ya. Ikike dị ukwuu na-abụghị onye apụghị ime nke ahụ! Ya mere mgbe i kpere ekpere, ị pụrụ ijide n’aka na ọ bụghị ike na-adịghị adị ma ọ bụ ikuku ka ị na-agwa okwu. Ọ dị onye ị  na-agwa okwu, onye nke pụrụ ịṅa ntị n’ekpere gị na ịza ya.—Ndị Efesọs 3:20.

N’ihi ya, Diana na-eto eto na-ekwu, sị: “Ama m na ebe ọ bụla m nọ, Jehova ga-ege m ntị.” Iji nwee obi ike ahụ, Chineke aghaghị ịbụ onye dadn’ezie nye gị! “Onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị,” ka Bible na-ekwu.—Ndị Hibru 11:6.

Isi Iyi nke Amamihe na Ike

Chineke pụrụ n’ezie inyere anyị aka n’ihi na ike ya dị ebube. A kparaghị ike ahụ ókè, dị ka ịdị ukwuu na ịdị mgbagwoju anya nke eluigwe na ala a na-ahụ anya na-egosi. Bible na-ekwu na Jehova maara aha kpakpando ọ bụla—n’agbanyeghị na ha dị ijeri kwuru ijeri! Karịa nke ahụ, ọ bụ ya bụ isi iyi nke ike nile dị na kpakpando ndị ahụ. (Aịsaịa 40:25, 26) Nke ahụ ọ́ dịghị ịtụnanya? Ma n’agbanyeghị otú eziokwu ndị a dịruru ịtụnanya, Bible na-ekwu na “ndị a bụ nanị akụkụ ndị dị nta nke ike ya”!—Job 26:14, Today’s English Version.

Tụleekwa amamihe a na-akparaghị ókè nke Jehova. Bible na-ekwu na echiche ya “miri emi nke ukwuu.” (Abụ Ọma 92:5) Ọ bụ ya kere ihe a kpọrọ mmadụ, n’ihi ya kwa ọ na-aghọta anyị karịa ka anyị na-aghọta onwe anyị. (Abụ Ọma 100:3) Ebe ọ bụ na ọ dị adị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi,” o nwere ahụmahụ a na-akparaghị ókè. (Abụ Ọma 90:1, 2) Ọ dịghị ihe ọ na-apụghị ịghọta.—Aịsaịa 40:13, 14.

Olee otú Jehova si eji ike na amamihe ahụ nile eme ihe? Ihe E Mere nke Abụọ 16:9 na-ekwu, sị: “Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” Ọ dịghị nnọọ nsogbu ị pụrụ inwe nke Chineke na-apụghị idozi ma ọ bụ nyere gị aka ịnagide. Kayla na-eto eto na-echeta, sị: “N’oge na-adịbeghị anya, mgbe mụ na ezinụlọ m nwere nsogbu, ekpegaara m Jehova ekpere, echekwara m na o nyeere anyị aka ịnagide ọnọdụ, nsogbu, na mmetụta ndị na-agaraghị ekwe nnagide ma e wezụga ekpere.” Mgbe ị na-agwa Chineke okwu, ọ bụ isi iyi nke amamihe ka ị gakwuuru. Ọ dịghị ihe ọzọ ka mma ị pụrụ ime!

Chineke nke Ikpe Ziri Ezi na Ịhụnanya

Ma olee otú i si mara na Chineke chrinyere gị aka? N’ihi na Jehova ekpebiwo ime ka a mata onye ọ bụ, ọ bụghị nnọọ site n’ike ya ma ọ bụ amamihe ya dị ukwuu ma ọ bụ ọbụna site n’ikpe ziri ezi ya na-adịghị agha agha. Kama nke ahụ, e ji àgwà Jehova bụ́ ịhụnanya mara ya karịsịa. “Chineke bịhụnanya,” ka 1 Jọn 4:8 na-ekwu. (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ịhụnanya ahụ nke dị ukwuu mere ka ekpere nwee ike o nwere. Ngosipụta kasị ukwuu nke ịhụnanya ya bụ onyinye o nyere Ọkpara ya dị ka àjà mgbapụta ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9, 10.

Ebe ọ bụ na Chineke bụ ịhụnanya, ọ dịghị gị mkpa mgbe ọ bụla ịtụ egwu na ọ ga-eleghara gị anya ma ọ bụ mesoo gị n’ụzọ na-ezighị ezi. “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi,” ka Deuterọnọmi 32:4 na-ekwu. Ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ị nọ na-eme ka i jide n’aka na ọ na-ege ntị nke ọma n’ihe ị na-ekwu. Nke a na-eme ka anyị nwee obi ike ịgwa ya echiche na mmetụta onwe onye anyị.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

 Ịbụ Enyi Chineke

N’ezie, Jehova na-akpọ anyị òkù ịgwa ya okwu. Ọ chọghị ịbụ onye ala ọzọ n’ebe anyị nọ. Kama nke ahụ, n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ Jehova anọwo na-akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bụrụ enyi ya. N’ime ndị bụworo enyi Chineke, bụ́ ndị ihe ha dị ya mma n’obi, e nwere ndị ikom na ndị inyom, nwata na okenye. Ha gụnyere ndị dị ka Abraham, Eze Devid, na Meri, bụ́ nne Jisọs.—Aịsaịa 41:8; Luk 1:26-38; Ọrụ 13:22.

Gị onwe gị kwa pụrụ ịbụ otu n’ime ndị enyi Jehova. Otú ọ dị, ọbụbụenyi dị otú ahụ apụtaghị na i kwesịrị ile Chineke anya dị ka mmụọ karịrị ike mmadụ bụ́ nke ị pụrụ ịkpọku nanị mgbe ọ dị ihe ị chọrọ inweta ma ọ bụ mgbe i nwere nsogbu. Ekpere anyị ekwesịghị ịbụ nanị maka mkpa nke anyị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ enyị Chineke, anyị aghaghị inwe mmasị n’ihe ọ na-achọ—ọ bụghị nanị na nke anyị—anyị aghaghịkwa n’ezie ime ihe Chineke na-achọ. (Matiu 7:21) N’ihi ya, Jisọs ziri ndị na-eso ụzọ ya ime ka ekpere ha bụrụ maka ihe ndị dị mkpa n’ebe Chineke nọ. O kwuru, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Ekpere anyị kwesịkwara ijupụta n’otuto na ekele nye Chineke!—Abụ Ọma 56:12; 150:6.

Otú o sina dị, anyị ekwesịghị iche na mkpa anyị ma ọ bụ ihe ndị anyị na-eche banyere ha dị nnọọ nta ma ọ bụ ghara ịdị mkpa nke na anyị agaghị ekpewa ekpere banyere ha. “Ọ bụ ezie na m na-agbalị ịgwa ya ihe nile dị m n’obi,” ka Steve na-ekwu, “mgbe ụfọdụ m na-eche na ekwesịghị m inye Chineke nsogbu maka ihe ụfọdụ na-adịghị ihe ha bụ.” Mgbe ọ bụla ị malitere iche otú ahụ, gbalịa icheta ihe Jisọs ziri ndị na-eso ụzọ ya: “Á dịghị ere egwele ise na penny abụọ? ma a dịghị echezọ otu n’ime ha n’ihu Chineke. . . . Unu atụla egwu: ọnụ ahịa unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Luk 12:6, 7) Nke ahụ ọ́ dịghị emesi obi ike?

Mgbe ahụ, ọ dị mfe ịghọta na ka ị na-amata Jehova karị, otú ahụ ka a ga-akwali gị karị ịgakwuru ya n’ekpere, otú ahụkwa ka ị ga-enwe obi ike karị na Jehova pụrụ inyere gị aka nakwa na ọ ga-enyere gị aka. N’ihi ya, echiche uche dị aṅaa ka i kwesịrị inwe mgbe ị na-agakwuru Chineke n’ekpere? Ọ dị gị mkpa inwe nkwanye ùgwù, ịdị obi umeala, na ịghara ịchọ ọdịmma onwe gị nanị. Ì chere na ọ dị onye ọ bụla nọ n’ọkwá dị elu n’ụwa nke ga-ege gị ntị ma i jiri mpako ma ọ bụ enweghị nkwanye ùgwù rịọ ya ihe? Mgbe ahụ, o kwesịghị iju gị anya na Jehova na-atụkwa anya ka ị kwanyere ya na ụkpụrụ ya dị iche iche ùgwù tupu ọ zaa ekpere gị.—Ilu 15:29.

Ọtụtụ puku ndị ntorobịa na-atụ egwu Chineke amụtawo ịgwa Chineke obi ha. (Abụ Ọma 62:8) “Mgbe Jehova zara ekpere m,” ka Brett na-ekwu, “ọ na-eme ka m nwee obi ike na ọ ka bụ enyi m.” Gịnị banyere gị? Olee otú ị pụrụ isi nụ ụtọ ọbụbụenyị dị otú ahụ nke gị na Chineke? Ndị ntorobịa abụọ bụ́ ndị Kraịst kwuru ihe ndị na-esonụ:

Rachel: “Iji kpakwuo Jehova nso, m na-ahụ na ọ dị m mkpa ịmụ Okwu ya n’ụzọ miri emi karị, m na-agbalịkwa ịzụlite agụụ siri ike maka ịmụ ihe otú ahụ.”—1 Pita 2:2.

Jenny: “Echere m na ka ị na-etinyekwu onwe gị n’ijere ya ozi, otú ahụ ka ị ga na-enwe mmetụta nke ịnọ Jehova nso karị.”—Jemes 4:8.

Ọ̀ dịtụwo mgbe i chere banyere ókè ikpe ekpere baruru n’uru? Otu onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst na-ekwu, sị: “M ga-enwe mmetụta nke ịnọkwu Chineke nso ma ọ bụrụ na ọ ga-agwa m okwu ma ọ bụ zitere m ozi.” Ebe ọ bụ na Jehova adịghị azaghachi site n’ịgwa anyị okwu mgbe anyị kpere ekpere, olee otú ekpere si enyere anyị aka n’ezie? A ga-atụle nke a ná mbipụta a ga-enwe n’ọdịnihu.

[Igbe dị na peeji nke 31]

Azịza nye ajụjụ ndị dị na peeji nke 29

1. Jehova. Ọ pụtara “Ọ na-eme ka Ọ Ghọọ.”

2. Ịhụnanya, ike, ikpe ziri ezi, na amamihe.

3. O zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs, ka ọ nwụọ n’ihi anyị.

4. Site n’echeghị banyere mkpa nke anyị nanị kama site n’inwe mmasị n’ihe ndị Chineke na-achọ na ime ha.

5. Anyị kwesịrị ịdị obi umeala, na-enwe nkwanye ùgwù, gharakwa ịchọ ọdịmma onwe anyị nanị.

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Ịmụ Bible na ịmụta ihe site n’ihe e kere eke ga-enyere gị aka ịmata Chineke karị