Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ka Ha Gbanwee n’Ezie—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?

Ime Ka Ha Gbanwee n’Ezie—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?

Ime Ka Ha Gbanwee n’Ezie—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?

“Ọ dịghị onye pụrụ ime ka onye ọzọ mee mgbanwe na-abụghị obi ya. Mgbanwe aghaghị isite n’ime onye ahụ, ọ ga-abụkwa ọchịchọ ya.”—VIVIEN STERN, N’AKWỤKWỌ BỤ́ A SIN AGAINST THE FUTURE—IMPRISONMENT IN THE WORLD.

ISI ihe dị oké mkpa maka ime ka ndị mkpọrọ gbanwee n’ezie bụ mmụta na ime mgbanwe n’ihe ndị e ji akpọrọ ihe na n’echiche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ dị ndị nwere obi eziokwu na-eme mgbalị ịkụziri ndị mkpọrọ ihe na inyere ha aka. Ọtụtụ ndị mkpọrọ nwere ekele n’ezie maka ọrụ ọma na achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke ndị dị otú ahụ.

Ndị ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na a pụghị ịgbanwe ụlọ mkpọrọ n’ozuzu ya nakwa na o siri nnọọ ike ndị mkpọrọ ịgbanwe n’ebe dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na nanị ịtụ mkpọrọ adịghị akụnye ụkpụrụ ọhụrụ, ntụziaka Bible enyeworo ndị ụfọdụ aka ịgbanwe ndụ ha. Nke a na-egosi na ndị mmadụ pụrụ ịgbanwe n’otu n’otu.

Taa, site n’enyemaka nke Bible, ndị mkpọrọ ụfọdụ na-eme mgbanwe ndị na-eme ka ha na-eche ezi echiche ma na-akpa àgwà ziri ezi. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Olee otú e si emezu nke a?

Òkè Bible Na-ekere

Ọtụtụ ndị na-eche na okpukpe pụrụ ikere òkè dị ukwuu n’inyere ndị mkpọrọ aka ichegharị n’omume mbụ ha. Otú ọ dị, nsogbu bụ́ isi e nwere na nke a bụ na mgbanwe n’omume ọ bụla e mere n’ụlọ mkpọrọ pụrụ ịkwụsị ozugbo a tọhapụrụ onye mkpọrọ ahụ. Otu onye e ji eji kwuru ya otú a, sị: “Ọtụtụ ndị na-achọta Kraịst n’ebe a—ma mgbe ha si ebe a pụọ, ha na-ahapụ Kraịst ebe a lawa!”

Ahụmahụ egosiwo na ezi mgbanwe aghaghị iwere ọnọdụ n’ime mmadụ—n’uche na n’obi omempụ ahụ—nakwa na ọ ghaghị ịdabere n’ezi nchegharị site n’ihe ọjọọ o mere n’oge gara aga. Ọrụ nkụzi Bible pụrụ inyere mmadụ aka ịmata otú Chineke si ele mmebi iwu anya na ihe mere o ji dị njọ. Nke a pụrụ ime ka o nwee ezi ihe ndị mere ọ ga-eji ghara ịchọ ịnọgide n’ụzọ dị otú ahụ.

Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ dị otú ahụ nke ịkụzi Bible n’ọtụtụ ụlọ mkpọrọ ndị dị n’ụwa nile, ọ na-arụpụta ezigbo ihe. (Lee peeji nke 10.) “E nyeworo anyị aka ịmata ihe Bible na-ekwu banyere nzube nke ndụ na ngọzi ndị ọdịnihu ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ,” ka otu onye mkpọrọ kwuru, na-ekwukwasị: “Ọ bụ mmụta dị ịrịba ama!” Onye ọzọ e ji eji kwuru, sị: “Anyị na-eme mkpebi ndị dabeere na ndụmọdụ Chineke. . . . Anyị na-ahụ mgbanwe n’ime onwe anyị. Anyị maara ihe ndị a ga-ebute ụzọ ná ndụ.”

Otú ọ dị, mkpa e nwere maka mgbanwe metụtara ndị na-anọghị n’ụlọ mkpọrọ. Ihe ga-agwọta nsogbu ụlọ mkpọrọ n’ezie bụ ịkwụsịcha ihe ndị ahụ na-eme ka e nwee mkpa maka ụlọ mkpọrọ. E gosipụtara otu n’ime eziokwu ndị dị ebube nke Bible bụ́ nke ruworo ọtụtụ ndị mkpọrọ n’obi ná nkwa Chineke bụ́: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:9, 29.

Mgbe nke ahụ mere, ọchịchị a na-apụghị ibibi ebibi nke na-ahụ n’anya nakwa nke guzosiri ike, bụ́ Alaeze eluigwe nke Chineke n’okpuru Kraịst—ọchịchị a kụziiri ndị Kraịst ikpe ekpere maka ya, ga-ahụ na a gbasoro ụkpụrụ ndị ka elu nke Chineke. (Matiu 6:10) N’ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-eme ka ndị nile bi na ya gbanwee site na ha ịmụta iwu ndị ka elu nke Chineke. Mgbe ahụ ọ ga-abụ eziokwu karịa mgbe ọ bụla ọzọ na “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Gịnị ga-esi na ya pụta? Ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ, bụ́ ndị na-erube isi n’iwu ga-abụ ndị ‘ịba ụba nke udo ga-atọ ụtọ.’—Abụ Ọma 37:11.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]

Inye Ha Ohere Inwe Olileanya

Ruo ihe karịrị afọ 20, ndị ozi afọ ofufo nke Ndịàmà Jehova enwewo ihe ịga nke ọma n’ọrụ izi ihe bụ́ nke dabeere na Bible n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta, Georgia, U.S.A. N’oge ahụ, e nyeworo ihe karịrị mmadụ 40 e ji eji aka ịghọ ndị ozi e mere baptism nke Ndịàmà Jehova, ihe karịkwara mmadụ 90 ọzọ e ji eji eritewokwa uru n’ọmụmụ Bible ha na-enwe mgbe nile.

N’oge na-adịbeghị anya Teta! na ọtụtụ ndị na-ezi Bible kwurịtara okwu bụ́ ndị jiworo achọghị ọdịmma onwe onye nanị rụọ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ.

N’ihi gịnị ka mmụta Bible ji dị nnọọ irè n’ịkwali ndị ụfọdụ e ji eji ịgbanwe ndụ ha?

David: E gosighị ọtụtụ ndị mkpọrọ ịhụnanya, ọbụna mgbe ha bụ ụmụaka. Ya mere mgbe ha bịara mata na Chineke hụrụ ha n’anya nakwa mgbe ha gwara ya obi ha n’ekpere, ọ zaakwa ekpere ha, ọ na-aghọ onye dị adị n’anya ha. Obi ha na-akwali ha igosikwa ya ịhụnanya.

Ray: E metọrọ otu n’ime ndị e ji eji m duziiri ọmụmụ ihe mgbe ọ bụ nwatakịrị. Mgbe m jụrụ ya ihe dọtara ya n’ebe Jehova nọ, ọ sịrị na mgbe mmadụ mụtara eziokwu Bible, ọ ga-achọpụta na Jehova ghọtara n’ezie ihe e mere ya. Nke a mere o ji chọọ ịmụtakwu banyere àgwà nke Chineke dị otú ahụ na-ahụ n’anya.

Ndị ụfọdụ pụrụ ikwu na ndị mkpọrọ na-eji okpukpe akpọrọ ihe n’ihi ebumnobi na-ezighị ezi—iji mee ka e gbubilata oge ha ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ nanị iji gbuo oge. Gịnị ka ahụmahụ i nweworo mere ka ị ghọta?

Fred: Mgbe ndị e ji eji bịara soro anyị na-amụ ihe, anyị adịghị akpali mmetụta uche ha. Nanị ihe anyị na-eme bụ iduziri ha ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya, ha na-amata na anyị gaje ịkụziri ha Bible nakwa na nke a bụ nanị ihe anyị na-eme. Ọ na-adị mgbe ha na-abịakwute m ma rịọ ka m nyere ha aka n’okwu ikpe ha. Adịghị m esoro ha ekwurịta banyere nke a. N’ihi ya, ndị nke na-eso n’ìgwè ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe ma nọrọ ruo oge ụfọdụ chọrọ n’ezie ịmụta ihe Bible na-ekwu.

Nick: Otu ihe m na-achọpụta bụ mgbanwe ndị ụfọdụ ndị e ji eji na-eme ka ha nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ụfọdụ n’ime ha aghọwo ndị ozi e mere baptism, ha atawokwa ahụhụ dị ukwuu n’ihi ndị ọzọ e ji eji. Nke ahụ na-esiri ha nnọọ ike. Ọ bụrụ na Bible emetụghị ha n’obi, ha agaraghị enwe ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọnọdụ ndị ahụ.

Israel: Ọtụtụ n’ime ha chọsiri ike ịmụta banyere Jehova, ha na-egosipụtakwa ya n’ụzọ na-emetụ n’ahụ. Ị pụrụ ịhụ na o sitere n’obi ha.

Joe: Ndị nke ghọrọ ezi ndị Kraịst abịawo ghọta ihe mere na ihe agazighị agazi ná ndụ ha. Ha na-aghọtakwa na e nwere olileanya maka mgbanwe—a na-enye ha ohere inwe olileanya. Ugbu a ha pụrụ iji obi eziokwu na-atụ anya mmezu nke nkwa Jehova maka ọdịnihu.

N’ihi gịnị ka ụlọ mkpọrọ nanị na-agaghị eji nwee ike ịgbanwe ndị mkpọrọ?

Joe: Nzube nke usoro iwu maka inye ntaramahụhụ abụghị ime ka ndị omempụ gbanwee kama ọ bụ iji wepụ ha n’etiti ọha mmadụ. Nke ahụ bụ ebe nsogbu ahụ hiwere isi—echiche ụlọ mkpọrọ nwere n’ebe ndị a nọ.

Henry: Ụlọ mkpọrọ apụghị ịgbanwe obi ndị omempụ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị a ga-emeghachi mpụ ha meburu ma ha si n’ụlọ mkpọrọ pụọ.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

E nyeworo ọtụtụ ndị e ji eji aka ịmụta eziokwu nke Bible