Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Site n’Ugwu Mgbawa Dị Egwu Gaa n’Àgwàetiti Dị Jụụ

Site n’Ugwu Mgbawa Dị Egwu Gaa n’Àgwàetiti Dị Jụụ

Site n’Ugwu Mgbawa Dị Egwu Gaa n’Àgwàetiti Dị Jụụ

KA ỤGBỌ mmiri anyị tụgharịrị nke ikpeazụ ya iche ihu n’ọdụ ụgbọ mmiri àgwàetiti Gris bụ́ Santorini, anyị hụrụ ihe juru anyị anya. E nwere akụkụ ugwu dị oké elu bụ́ nke fọrọ nke nta ka o jiri mita 300 dị elu karịa elu oké osimiri. A rụrụ ụlọ ndị na-acha nnọọ ọcha n’elu ugwu ahụ. Ọdịdị pụrụ iche nke àgwàetiti a, onwunwe ọ na-enweghị ụdị ụsọ mmiri na-adịkarị n’àgwàetiti, akụkụ ugwu ndị gbalitere elu—ihe ndị a yiri ka hà na-egosi na nnukwu ihe mere n’ebe a. O mere. Àgwàetiti Santorini bụ otu akụkụ fọdụrụ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ugwu gbawara agbawa, anyị jikwa ụgbọ mmiri na-aga na mmiri sọjuru n’olulu nke mgbawa ugwu ahụ gwuru!

Mmalite nke Otu Àgwàetiti

N’oge ochie a na-akpọ àgwàetiti Santorini—nke a makwaara taa dị ka Santorin ma ọ bụ Thíra—Strongyle, nke pụtara “Gburugburu.” Àgwàetiti ahụ dịkwa gburugburu. Ma dị ka ndị ọkachamara si kwuo, otu nnukwu mgbawa ugwu gbanwere ọdịdị àgwàetiti ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 3,500 gara aga. Ihe àmà na-egosi na otu mgbawa dị egwu mere ka olulu buru ibu dịrị n’etiti àgwàetiti ahụ, na-eme ka e nwee oghere dị omimi, oké osimiri ahụ rubanyere n’ime ya.

Ụfọdụ ndị ọkà n’ihe banyere ugwu mgbawa na-ekwu na ụda ọ dara mgbe ọ gbawara ruru Europe, Esia, na Africa nakwa na ọ kwaturu ụlọ ndị dị n’ebe dị ihe dị ka kilomita 150 site n’ebe ahụ. Ha na-ekwu na ọ ghaghị ịbụ na anwụrụ ọkụ gbochiri ìhè anyanwụ ịchakwasị ógbè Mediterranean ruo ọtụtụ ụbọchị. Ná ngụkọta, square kilomita 80 nke àgwàetiti ahụ pụrụ n’anya ma ọ bụ bụrụ nke mmiri rikpuru. E kpochapụrụ ihe nile dị ndụ.

Ka oge na-aga, ndị bi n’elu ala batara wee biri n’ebe fọdụrụnụ na Strogyle, a gụgharịrị àgwàetiti ahụ Calliste, nke pụtara “Ebe Kasị Maa Mma.” Ma ibi n’elu ugwu mgbawa tinyere ndụ ndị ahụ bi na ya n’ihe ize ndụ. N’agbata 198 T.O.A na 1950 O.A., ọ gbawara ugboro 14. Mgbe nke ahụ gasịrị, na 1956 ala ọma jijiji bibiri ọtụtụ n’ime ebe obibi ndị dị n’àgwàetiti ahụ. “Ala nọ na-ama jijiji dị ka akamụ,” ka Kyra Eleni, bụ́ agadi nwanyị lanarịrị ọdachi ahụ, kwuru. “Ọ dị ụzọ jupụtara n’ajịrịja nkume dị n’ihu ụlọ m, bụ́ nke a rụrụ n’elu otu akụkụ gbalitere elu nke ugwu ahụ. Na mberede ọ dabara n’oké osimiri ahụ, na-eme ka ọ fọdụ nke nta ka ụlọ m koro n’elu! Anyị aghaghị ịhapụ ụlọ ahụ ma wuo nke ọhụrụ n’ala siri ike karị.”

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị ndị si mba ọzọ mere ngwa ngwa wughachi obodo nta ndị bibiri ebibi. Taa Santorini na-enwe ọtụtụ puku ndị nleta na-enubata n’ebe ahụ n’oge okpomọkụ ọ bụla. E wezụga Santorini, àgwàetiti bụ́ Thirasía na-eburughị ibu ka ya na obere àgwàetiti mmadụ na-ebighị bụ́ Aspronísi ka dị.

Ọzọkwa, e nwere obere àgwàetiti abụọ sitere n’ugwu mgbawa bụ́ ndị dị n’etiti olulu ahụ buru ibu dị na Santorini—Néa Kaméni na Palaía Kaméni. A ka na-ahụ mmetụta nke mgbawa ugwu n’àgwàetiti ndị a malitere ịdị n’oge na-adịbeghị anya, ka ‘dike ahụ na-ehi ụra’ na-anọkata kopụwa anwụrụ ọkụ. Ọdịdị Santorini na-agbanwekarị agbanwe, nke na a ghaghị isegharị map ya site n’oge ruo n’oge.

Ibi n’Akụkụ Ya

Akụkụ olulu ahụ dị na Santorini akpọdaghị akpọda kama ọ gbalitere elu. Ọdịdị ya gbalitere elu na-eme ka ndị bi n’àgwàetiti ahụ nweta ụzọ kasị mfe isi wuo ụlọ: Gwuru ala banye n’ime okwute, wuo mgbidi n’ọnụ ya, ma kwaba n’ime ya. Ee, a kpọwapụtara ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ndị dị n’akụkụ olulu ahụ n’okwute.

N’ihu ebe obibi nke ọ bụla a na-enwe varanda chere ihu n’olulu ahụ. Varanda ụlọ dị n’elu bụ elu nke ụlọ dị n’okpuru. Ị pụrụ ịnọ na varanda ndị a kirie ọdịda anyanwụ na-adọrọ mmasị, na-ekiri anyanwụ na-acha odo odo ka o ji nwayọọ nwayọọ na-ada n’ụzọ dị ebube. Varanda ụfọdụ na-enwekwa obere kichin, otu mkpuke ọkụkọ ma ọ bụ abụọ, nakwa osisi ndị a kụrụ n’ite okooko osisi bụ́ ndị na-esi ísì ụtọ ma na-awa okooko.

Otu ihe e ji mara obodo nta ndị ahụ n’ozuzu ha karịsịa bụ na a dịghị ewu ụlọ ndị dị na ha n’otu ahịrị kwụ ọtọ. E nwedịghị elu ụlọ yiri ibe ya n’ebe ahụ. Ọtụtụ ahịrị kwụ ọtọ na ndị gbara ngọ, bụ́ ndị na-eme ka e nwee ọdịdị ndị a na-adịghị ahụkebe, na-eme ka ụlọ ndị e wukọtara ọnụ n’ebe ahụ maa mma, bụ́ nke dị ịtụnanya n’àgwàetiti ahụ na-adịghị larịị.

Mmiri adịtụghị na Santorini. Nanị mmiri a na-enweta ebe ahụ bụ mmiri ozuzo gbanyere n’olulu ndị e ji echeta mmiri. Ma ala ya na-eme ihe oriri. N’ihi ya, obere ala dị n’àgwàetiti ahụ na-emepụta ihe ọkụkụ dịgasị iche.

Nye ma ndị na-eme njem nleta ma ndị nwe ala, Santorini bụ ihe ncheta pụrụ iche nakwa nke dị ebube na-eme ka mbara ụwa anyị maa mma.

[Igbe dị na peeji nke 18]

IHE JIKỌRỌ YA NA ATLANTIS

Otu akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme bụ́ nke pụrụ ịmaliteworị n’Ijipt, nke e chekwara n’ihe odide ndị Gris oge ochie, bụrụkwa nke ndị Arab bụ́ ndị ọkà mmụta ọdịdị mbara ala mesịrị tinye n’akụkọ mgbe ochie, bụ banyere kọntinent furu efu, bụ́ àgwàetiti, ma ọ bụ obodo Atlantis. A na-eche na oké osimiri rikpuru Atlantis n’ihi ala ọma jijiji na idei mmiri. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ihe ochie na-ekwu na akụkọ ọdịbendị a malitere mgbe e nwere ugwu mgbawa na Santorini.

Ngwupụta a malitere igwupụta ihe n’ebe a na 1966/1967 mere ka a hụ obodo nwere akụ̀ bụ́ nke ndị eze Krit oge ochie, nke dị n’okpuru ihe ndị si ná mgbawa ugwu, bụ́ nke ka dị otú ọ dị n’oge ahụ ugwu ahụ gbawara. O yiri ka ịdọ aka ná ntị bịara n’oge mere ka ndị bi n’ebe ahụ gbapụ na ya n’oge. Ndị nchọpụta ụfọdụ na-eche na ọjụjụ ndị biri n’ebe ahụ jụrụ ikweta na ebe bụbu obodo ha mara mma adịkwaghị mere ka a malite akụkọ mgbe ochie bụ́ na Atlantis ka dị adị ma na-aga n’ihu dị ka obodo ukwu n’ala oké osimiri.

[Foto dị na peeji nke 16]

Santorini

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ ime nkwusa na Santorini

[Foto dị na peeji nke 18]

Ịnọ n’ebe dị elu na Santorini lee oké osimiri Aegean