Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntụgharị Uche nke Bara Uru

Ntụgharị Uche nke Bara Uru

 Echiche nke Bible

Ntụgharị Uche nke Bara Uru

“KA OKWU NILE NKE ỌNỤ M NA NTỤGHARỊ NKE OBI M BỤRỤ IHE NA-ATỌ ỤTỌ N’IHU GỊ, JEHOVA, BỤ́ OKÉ NKUME M, NA ONYE MGBAPỤTA M.”ABỤ ỌMA 19:14.

GỊNỊ ka ‘ntụgharị uche’ pụtara nye gị? Ọ bụrụ na i kweere n’ozizi nke okpukpe ụfọdụ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ị pụrụ ikweta na ọ bụ ihe na-eme ka ihe doo anya karị ma ọ bụ nke na-enye nghọta pụrụ iche. Ntụgharị uche a na-eme n’okpukpe Buddha na-akwado iwepụ ihe nile dị n’uche. A na-ekwu na ụdị ntụgharị uche ndị ọzọ na-akwado mmadụ iji “eziokwu nke amamihe zuru ebe nile” emejupụta uche ya.

Echiche nke Bible banyere ntụgharị uche dị iche ná ndị a. N’ụzọ dị aṅaa? Tụlee ihe atụ dị na Bible banyere otu nwoke aha ya bụ Aịsak, bụ́ onye nwere ọtụtụ ihe ọ ga-atụgharị uche na ha mgbe ọ dị afọ 40. Jenesis 24:63 na-ekwu, sị: “Aịsak wee pụọ ịtụgharị uche ya n’ọhịa na mgbe anyasị.” O nweghị ihe mere a ga-eji chee na Aịsak wepụrụ ihe nile dị ya n’uche ma ọ bụ na ọ nọ na-eche nanị banyere ‘eziokwu nke amamihe zuru ebe nile’ bụ́ nke na-edoghị anya. O yiri ka ò nwere ihe ndị Aịsak na-eche banyere ha kpọmkwem, dị ka ọdịnihu ya, ọnwụ nne ya, ma ọ bụ onye nwunye ya ga-abụ. O ji oge nanị ya nọ n’anyasị na-atụgharị uche, ma eleghị anya n’ihe ndị dị otú ahụ dị mkpa. Na Bible, ntụgharị uche karịrị nanị ịmụ anya arọ nrọ.

E Nwere Ihe Ndị Ọzọ Ntụgharị Uche Gụnyere

Tụlee ihe atụ nke ọbụ abụ bụ́ Devid. O chere ọtụtụ nsogbu yiri ka ha siri oké ike ihu, ọ makwaara nke ọma na dị ka mmadụ na-ezughị okè, ọ chọrọ enyemaka Chineke iji mee ihe ziri ezi. Gịnị nyere Devid obi ike n’oge ọ nọ n’ọnọdụ ndị siri ike? Dị ka e dekọrọ ya n’Abụ Ọma 19:14, Devid kwuru, sị: “Ka okwu nile nke ọnụ m na ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Gị, Jehova, bụ́  oké nkume m, na onye mgbapụta m.” Okwu Hibru a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘ntụgharị uche’ sitere n’okwu bụ́ isi pụtara n’ụzọ nkịtị “mmadụ ịgwa onwe ya okwu.” Ee, Devid ‘gwara onwe ya okwu’ banyere Jehova, ihe omume ya, ọrụ ya, iwu ya, na ezi omume ya.—Abụ Ọma 143:5.

N’otu aka ahụ, ndị Kraịst mbụ weere iwepụta oge maka ịtụgharị uche n’ihe ime mmụọ dị ka akụkụ nke ezi ofufe. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ka ihe bụ́ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.” (Ndị Filipaị 4:8) Otú ọ dị, iji na-eche echiche banyere ihe ndị na-ewuli elu, ọ ga-adị mkpa ka “ihe” ndị a Pọl kwuru banyere ha banye n’uche anyị ka oge na-aga. N’ụzọ dị aṅaa?

Ọbụ abụ ahụ na-enye azịza ya. Abụ Ọma 1:1, 2 na-agụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu . . . N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” Ee, ọbụ abụ ahụ na-agụchi iwu Chineke anya. Ọ na-atụgharị uche n’ihe ndị ọ mụtara banyere Onye Okike.

Ịtụgharị Uche Taa

Ịgụ Bible bara oké uru, ma mgbe anyị gụsịrị ya, anyị aghaghị ịtụgharị uche, chesie echiche ike, ma ọ bụ “gwa onwe anyị okwu” banyere ihe anyị gụworo. Dị nnọọ ka mgbari nke nri dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-erite uru zuru ezu ná nri anyị na-eri, ntụgharị uche dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta ihe anyị na-agụ na Bible. Ntụgharị uche kwesịrị ekwesị na-eme ihe karịrị nanị iwepụ echiche ndị na-ezighị ezi. Ọ na-emekwa ka anyị tụlee ihe ngwọta ndị dabeere na Bible maka nsogbu anyị. Ntụgharị uche dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide nchegbu a na-enwe kwa ụbọchị.—Matiu 6:25-32.

Ọbụ abụ bụ́ Devid maara ọrụ ntụgharị uche na-arụ n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. O kwuru, sị: “Ọnụ onye ezi omume na-ekwu okwu amamihe, dị ka onye na-atụgharị uche.” (Abụ Ọma 37:30) Ee, ntụgharị uche bụ ihe e ji amata onye ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe. Ịbụ onye Chineke gụrụ dị ka onye ezi omume bụ ezi ngọzi, ọ na-ewetakwa abamuru ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu na “okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) N’ihi ya, onye Kraịst na-erube isi bụ́ onye “na-ekwu okwu amamihe” pụrụ ịtụ anya ịghọtakwu Bible.

Bible na-adụkwa ndị Kraịst ọdụ ịtụgharị uche n’ibu ọrụ ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “[Na-atụgharị uche, NW] n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ. Rịba onwe gị na ozizi gị ama. Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.” (1 Timoti 4:15, 16) Ee, ihe ndị anyị na-ekwu ma na-eme pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ebe ndị ọzọ nọ.

N’ụzọ doro anya, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-atụgharị uche n’ụzọ miri emi n’ihe ndị dị mkpa. Ọ dị mkpa ka anyị na-atụgharị uche n’ahụmahụ ndị anyị nwere n’oge gara aga, na-atụgharị uche n’ihe ndị dị ugbu a ma na-atụgharị uche banyere ọdịnihu. Ma karịsịa, ntụgharị uche anyị ga-eme ka anyị nwee nghọta kasị ukwuu ma ọ bụrụ na echiche anyị hiwere isi n’amamihe Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke.

[Foto dị na peeji nke 26]

“Onye Na-atụgharị Uche,” nke Rodin kpụrụ