Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Omume Ọ̀ Dị Njọ Ugbu A Karịa Otú Ọ Dị n’Oge Gara Aga?

Omume Ọ̀ Dị Njọ Ugbu A Karịa Otú Ọ Dị n’Oge Gara Aga?

Omume Ọ̀ Dị Njọ Ugbu A Karịa Otú Ọ Dị n’Oge Gara Aga?

Ọ BỤRỤ na ị jụọ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, sị: “Omume ndị mmadụ ọ̀ dị mma ka ọ dị njọ ugbu a karịa otú ọ dị n’oge gara aga?” ụfọdụ pụrụ ịza gị na o siri ike iji omume nke otu oge tụnyere oge ọzọ. Ha pụrụ iche na a ghaghị ikpebi otú oge nke ọ bụla dị na-adabere n’ihe ndị mere na ha.

Dị ka ihe atụ, tụlee mmalite nke mpụ ime ihe ike na Europe kemgbe narị afọ nke 16. Igbu mmadụ abụchaghị ihe a na-adịghị ahụkebe n’afọ 400 gara aga. Ndị mmadụ leghaara iwu anya, iro ezinụlọ na ezinụlọ zukwara ebe nile.

Ka o sina dị, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Arne Jarrick na Johan Söderberg dere n’akwụkwọ bụ́ Människovärdet och makten (Ùgwù na Ike Mmadụ) na n’agbata afọ 1600 na 1850 “e nwere ezi ọganihu ná ndụ ndị mmadu” n’ebe ụfọdụ. Ndị mmadụ enwewo ọganihu n’ichebara mkpa ndị ọzọ echiche—ha na-enwezi ọmịiko karị. Dị ka ihe atụ, ndị ọzọ na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na a hụkebeghị izu ohi na mmebi ihe onwunwe na narị afọ nke 16 dị ka a na-ahụ ha taa. E nwekebeghị òtù ndị ohi a haziri ahazi, karịsịa n’etiti ndị bi n’ime ime obodo.

Otú ọ dị, ịgba ohu dị adị, ọ kpatakwara ụfọdụ n’ime mpụ ndị kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme—ntọrọ ndị Europe na-agba mgbere ahịa tọọrọ ndị mmadụ n’Africa na ọnụ e mekpọrọ ọtụtụ nde ndị ohu a ná mba ebe a kpọgara ha.

N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị eleghachi anya azụ ọtụtụ narị afọ gara aga, anyị nwere ike ịchọpụta na ọ bụrụ na e lee ihe anya otú ha si mee n’ezie, ụfọdụ ọnọdụ ka mma, ebe ndị ọzọ ka njọ. Ka o sina dị, ihe dị nnọọ iche ma dị oké njọ—ihe a na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ—mere n’ezie na narị afọ nke 20, ọ ka na-emekwa.

Narị Afọ nke 20—Oge Oké Mgbanwe

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jarrick na Söderberg na-ekwu, sị: “N’afọ ndị 1930 igbu ọchụ mụbara ọzọ, ọ dịkwa mwute ikwu na kemgbe ahụ omume a anọgidewo na-aga n’ihu kemgbe ihe karịrị ọkara narị afọ.”

Dị ka ọtụtụ ndị na-enye nkọwa sị kwuo, e nwere oké ndakpọ nke omume ọma na narị afọ nke 20. Otu edemede banyere omume, na-ekwu, sị: “Mmadụ pụrụ ịhụ n’ụzọ doro anya na ụzọ ọha mmadụ si ele mmekọahụ na omume ziri ezi anya agbanwewo nke ukwuu site n’afọ 30 ruo 40 gara aga—site n’ọha mmadụ iji iwu ndị siri ike mee ka omume ziri ezi pụta ìhè, ruo n’echiche ka ukwuu nke nnwere onwe na nke mmadụ ime ihe masịrị ya.”

Nke a pụtara na omume mmekọahụ na omume ndị ọzọ bụ ihe ndị ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-echezi na ha pụrụ ikpebiri onwe ha. Iji maa atụ nke a, edemede ahụ depụtara ọnụ ọgụgụ na-egosi na na 1960 a mụrụ nanị pasent 5.3 nke ụmụaka nile nọ na United States n’alụghị di na nwunye. Na 1990 ọnụ ọgụgụ ahụ bụ pasent 28.

N’otu okwu ihu ọha o kwuru na Mahadum Notre Dame, Omeiwu bụ́ Joe Lieberman nke United States kọwara omume nke oge anyị dị ka “nke na-enweghị ụkpụrụ, . . . bụ́ ebe echiche oge ochie nke ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi jiworo nwayọọ nwayọọ na-adakpọ.” Dị ka Lieberman si kwuo, omume ọhụrụ a “anọwo na-etolite n’ime oge ka ukwuu n’ime ọgbọ abụọ.”

Ịgbaso Echiche Ụwa

Gịnị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọzọ na-eme nnyocha na-ekwu na ọ bụ ya kpatara oké ihe a mere na narị afọ nke 20? “Otu n’ime mgbanwe ndị kasị ukwuu e nwere n’ebe ọha mmadụ nọ n’ime narị afọ abụọ gara aga bụ ịgbaso echiche ụwa,” ka akwụkwọ bụ́ Människovärdet och makten na-ekwu. Ịgbaso echiche ụwa pụtara na “a ga-enye ndị mmadụ ohere iji aka ha gosi ebe ha kwụ n’echiche dị iche iche. Echiche a . . . malitere n’etiti ndị ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 18 bụ́ ndị so n’Òtù Ndị Ọkà Ihe Ọmụma, bụ́ ndị mbụ . . . na-ekweghị na ọ bụ nanị Bible bụ isi iyi nke eziokwu.” N’ihi ya, a dịghị adabere n’ebe okpukpe dị iche iche nọ, karịsịa ndị nke Krisendọm, maka nduzi n’ihe banyere omume dị ka e mere n’oge gara aga.

Ma n’ihi gịnị ka nkà ihe ọmụma e chepụtara na narị afọ nke 18 ji wee ihe karịrị afọ 200 tupu o zuo ebe nile? “Echiche ndị a adịghị adị mfe ịgbasara ha ọha na eze,” ka akwụkwọ ahụ e kwuru okwu ya n’elu na-ekwu. “Ihe e mere iji gbasoo echiche ụwa gara nwayọọ nwayọọ.”

Ọ bụrụgodị na omume ịchọ ịgbahapụ ụkpụrụ omume na ụkpụrụ ndị Kraịst oge ochie gara nwayọọ nwayọọ ruo ihe ka ukwuu n’afọ 200 gara aga, ọ gara nnọọ ngwa ngwa na narị afọ nke 20. Nke a abụwo eziokwu karịsịa n’ime iri afọ ole na ole gara aga. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

Ịchọ Ọdịmma Onwe Onye Nanị na Anyaukwu

Ihe so nnọọ kpata ya bụ ọganihu dị ngwa ọha mmadu nwere na nkà na ụzụ na akụ̀ na ụba na narị afọ nke 20. Otu isiokwu dị na magazin Germany bụ́ Die Zeit kwuru na anyị na-ebi ‘n’ọgbọ nwere ọganihu, ọ bụghịkwa n’ụwa nke a maara dị ka nke a na-enweghị ọganihu na ya, dị ka ọ dị n’ọtụtụ narị afọ gara aga.’ Isiokwu ahụ kọwara na nke a emewo ka e nwee usoro azụmahịa onye ọ bụla pụrụ ikere òkè na ya, bụ́ nke dabeere n’asọmpi ma bụrụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akwalite.

“Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị a,” ka isiokwu ahụ gara n’ihu ikwu, “abụghị nke ihe ọ bụla pụrụ ịkwụsị. Ọ na-arụpụta obi ọjọọ nke kara ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị akara, nakwa nrụrụ aka, bụ́ nke ọbụna aka gọọmenti dị na ya n’ọtụtụ mba. Ndị mmadụ na-eche banyere onwe ha na imecha ihe ndị bụ ọchịchọ ha.”

Ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Robert Wuthnow, nke Mahadum Princeton, chọpụtara ná njụta echiche o wedara anya n’ala mee, na ndị America na-etinye uche n’ego ugbu a karịa ka ha tinyere n’ọgbọ gara aga. Dị ka nnyocha ahụ gosiri, “ọtụtụ ndị America na-atụ egwu na ọchịchọ a na-achọ ego ekpuchiwo ụkpụrụ ndị ọzọ, dị ka ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù, ime ihe n’eziokwu n’ọrụ na ikere òkè n’ógbè ha.”

Anyaukwu nke ọha mmadụ amụbakwuwo n’ihi na ọtụtụ ndị isi ọrụ amụbawo ụgwọ ọnwa ha na ego ha ga na-enweta mgbe ha lara ezumike nká nke ukwuu ma na-agwa ndị ha were n’ọrụ ka ha ghara ịdị na-ana ụgwọ ọnwa buru ibu. “Nsogbu dị ná nchụso ndị isi ọrụ na-achụso uru bụ na ndị ọzọ na-amụta àgwà ha, ha na-emekwa ihe ndị megidere ụkpụrụ omume ndị mmadụ n’ozuzu,” ka Kjell Ove Nilsson, bụ́ osote prọfesọ nke ụkpụrụ omume na onye nduzi nkà mmụta okpukpe nke Òtù Ndụmọdụ Ndị Kraịst nke Sweden na-ekwu. “Otú ọ dị, nke a na-enwe mmetụta dị njọ n’omume—n’ọha mmadụ nakwa n’ahụ ndị mmadụ n’otu n’otu.”

Usoro Mgbasa Ozi

Ihe ọzọ bụ́ isi so na-akpata ndakpọ nke omume ọma na-adakpọ n’ike n’ike ná ngwụsị ọkara narị afọ nke 20 bụ usoro mgbasa ozi. “Ndị na-egosizi ụkpụrụ omume a ga-agbaso bụ ndị na-eduzi ihe omume na telivishọn, ndị a ma ama n’ihe nkiri sịnịma, ndị na-akpọsa uwe ọhụrụ, ndị na-eti egwú rap, na ọtụtụ ndị ọzọ a ma ama n’usoro mgbasa ozi,” ka Omeiwu bụ́ Lieberman na-ekwu. “Ndị a na-akụzi ụkpụrụ omume ọhụrụ na-achịkwa nnọọ omenala anyị nakwa ụmụ anyị karịsịa, ọtụtụ mgbe kwa ha adịghị egosipụta mmetụta banyere ụkpụrụ na-emerụ ahụ ha na-esetịpụ.”

Dị ka ihe atụ, Lieberman hotara otu egwú nke òtù egwú rock na-ada oké ụda bụ́ nke a na-akpọ Cannibal Corpse, tiri. Ndị gụrụ ya kọwara n’uju, ndina e dinara otu nwanyị n’ike ka e ji mma na-eyi ya egwu. Ya na onye òtù ya rịọrọ ụlọ ọrụ mepụtara egwú ahụ ka ha kwụsị ikesa ya. Ma dị ka Lieberman si kọọ, ha ekweghị.

Ya mere, ndị nne na nna maara ihe taa na-agbasi mgba ike megide usoro mgbasa ozi iji hụ na ọ gaghị achịkwa ma zụlite ụmụ ha. Ma gịnị banyere ezinụlọ ndị nne na nna ha na-amaghị ihe? “Ná ndị nke ahụ,” ka Lieberman na-ekwu, “a na-anabata usoro mgbasa ozi dị ka ihe na-esetịpụ ụkpụrụ omume, ihe nwatakịrị na-amụtakwa na telivishọn, ihe nkiri sịnịma na ngwá egwú CD na-abụ ihe kasị akpụzi echiche ya nke ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi na ihe ndị kasị mkpa ná ndụ ya.” N’oge na-adịbeghị anya, a pụkwara itinye Internet ná ndepụta ahụ.

Iwetaghachi “Omume Ọgbọ Nkume”

Olee otú mmetụta nke ihe ọjọọ ndị a si apụta ìhè n’etiti ndị na-eto eto? Otu ihe bụ na ọtụtụ ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma emesowo ụmụaka ndị ọzọ nakwa ndị toworo eto ajọ ihe ike n’afọ ndị na-adịbeghị anya.

Otu nke na-awụ akpata oyi n’ahụ mere na Sweden na 1998. Ụmụaka nwoke abụọ, dị afọ ise na afọ asaa, gbagidere nwatakịrị dị afọ anọ ha na ya so na-egwuri egwu aka n’akpịrị o wee nwụọ! Ọtụtụ ndị jụrụ ajụjụ ahụ bụ́: Ọ̀ bụ na ụmụaka enweghị ihe ha bu pụta ụwa na-agwa ha ka ha kwụsị mgbe ha na-achọ imebiga ihe ókè? Otu dibịa na-agwọ ọrịa uche ụmụaka kwuru ihe a ezi uche dị na ya: “Iguzogide ọchịchọ imebiga ihe ókè bụ ihe a na-aghaghị ịmụta amụta,” ka o kwuru. “Ọ pụrụ ịbụ ihe banyere . . . ndị bụụrụ ụmụaka ihe nlereanya na ihe ndị ha na-amụta n’aka ndị toworo eto ha na ha nọ.”

A pụrụ ịhụ omume yiri nke ahụ n’ebe ndị omempụ nọ. Dị ka Sten Levander, bụ́ prọfesọ nkà mmụta ọrịa uche na Sweden si kwuo, n’agbata pasent 15 na 20 nke ndị nile nọ n’ụlọ mkpọrọ taa na-arịa ọrịa uche—ndị na-eche nanị banyere onwe ha gabiga ókè, na-enweghị mmetụta ọmịiko, na-enweghịkwa ike ma ọ bụ na-adịghị njikere ịghọta ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọbụna n’etiti ụmụaka na ndị ntorobịa yiri ndị na-akpazi àgwà, ndị nyochara ha chọpụtara na ha enwechaghị echiche omume ọma. “Anyị eweghachila omume Ọgbọ Nkume,” ka Christina Hoff Sommers, bụ́ prọfesọ nkà ihe ọmụma na-ekwusi ike. O kwuru na mgbe obere ụmụ akwụkwọ ya chere ajụjụ banyere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi ihu, ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-enwe obi abụọ. Mgbe ahụ ha na-azaghachi na e nweghị ihe dị ka ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi. Ha kwenyere na onye ọ bụla aghaghị ịtụle ihe ga-aka amasị ya.

N’oge ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ya ekwenyeghị n’ụkpụrụ nke ùgwù na ịdị mkpa pụrụ iche nke ndụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, mgbe a jụrụ ha ihe ha ga-eme ma ọ bụrụ na a sị ha họrọ ịzọpụta ndụ anụ ha ji mere enyi ma ọ bụ ndụ mmadụ ibe ha ha na-amaghị, ọtụtụ kwuru na ha ga-ahọrọ anụmanụ ha.

“Nke bụ nsogbu abụghị na ndị na-eto eto amaghị ihe, adịghị atụkwasị mmadụ obi, nwere obi ọjọọ, ma ọ bụ dị aghụghọ,” ka Prọfesọ Sommers na-ekwu. “N’ikwu ihe ọ bụ kpọmkwem, ha enweghị echiche nke ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” Ọ na-ekwusi ike na ọtụtụ ndị na-eto eto taa na-arụ ụka n’ezie ma è nwere ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, ọ na-echekwa na omume a bụ otu n’ime ihe ndị kasị eyi ọha mmadụ egwu.

N’ihi ya, mmebi nke omume ọma n’oge anyị dị adị n’ezie. Ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ na ọ pụrụ ịkpata oké ihe ọjọọ. Isiokwu ahụ dị na Die Zeit bụ́ nke e zoro aka na ya ná mmalite na-ekwu na azụmahịa onye ọ bụla pụrụ ikere òkè na ya taa pụrụ iji nwayọọ nwayọọ “dakpọọ otu ụbọchị ma eleghị anya dị ka ọchịchị socialist si dakpọọ n’oge na-adịbeghị anya.”

Gịnị ka ihe a nile pụtara? Ọdịnihu dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịtụ anya ya?

[Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

“Ndị na-egosizi ụkpụrụ omume a ga-agbaso bụ ndị na-eduzi ihe omume na telivishọn, ndị a ma ama n’ihe nkiri sịnịma, ndị na-akpọsa uwe ọhụrụ, ndị na-eti egwú rap . . . ”