Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

 Ikiri Ụwa

Ụmụaka Na-amụ Ije na TV

Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Ụmụaka nke America na-atụ aro ka ụmụaka na-erubeghị afọ abụọ ghara ikiri telivishọn, ka The Toronto Star na-akọ. Nchọpụta e mere banyere ntolite ụbụrụ ụmụaka na-egosi na inwe mmekọrịta nke ha na ndị mụrụ ha na nke ndị nlekọta ọzọ dị ụmụ ọhụrụ na ụmụaka na-amụ ije mkpa. Ikiri TV pụrụ “igbochi mkpakọrịta nke na-enye aka ịzụlite ikike ha isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe, nke mmetụta uche na nke ịmata ihe.” Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ọkachamara nile kwenyere. Dị ka ihe atụ, Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Ụmụaka nke Canada na-ekwu na ikiri ihe omume ndị dị mma nke ndị mụrụ ha na-elekọta ruo ihe na-akarịghị minit 30 n’otu ụbọchị na-enye nwatakịrị “ohere ịbụ onye nne ma ọ bụ nna ya na-akụziri ihe.” Otú ọ dị, òtù abụọ ahụ kweere na ụmụaka ekwesịghị inwe telivishọn ma ọ bụ kọmputa n’ọnụ ụlọ ihi ụra ha nakwa na e kwesịghị iji TV mere ihe na-elekọta nwa. Ebe ọ bụ na ikiri TV pụrụ imetụta ahụ ike ụmụaka, a na-atụ aro ka “a na-agba ụmụaka ume igwu egwu n’èzí, ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ ịzụ okwe.”

Inwe Nkụda Mmụọ n’Ebe Ọrụ

N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ji ewe iwe ọkụ ma ọ bụ ọbụna eme ihe ike n’ebe ọrụ? Dị ka ọkà n’akparamàgwà mmadụ, bụ́ Sam Klarreich, nke nọ na Toronto si kwuo, ihe kpatara ya nwere ike ghara ịbụ nanị nchekasị kama anagidelighị nkụda mmụọ. O kwenyere na ọnọdụ a na-amalite n’etiti ụfọdụ ndị e were n’ọrụ na-eche na a “na-eme ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ ma na-achọpụtazi na uru ha na-erite na ihe ha na-arụ ahaghị nhata,” ka akwụkwọ akụkọ Globe and Mail na-akọ. Klarreich na-adọ aka ná ntị na iwe dịtere aka bụ “ọnọdụ uche na-adịghị nnọọ mma” nke pụrụ ịkpata ọrịa strok ma ọ bụ nkuchi obi. Ọ na-agba ndị e were n’ọrụ ume ịmụta ụzọ isi na-anakwere nkụda mmụọ, nakwa iji nwayọọ soro ndị were ha n’ọrụ kparịta ókè ọrụ ha pụrụ ịrụ n’ezie. N’aka nke ọzọ, Klarreich na-adụ ndị were mmadụ n’ọrụ ọdụ ilebara ndị ha were n’ọrụ anya bụ́ ndị yiri ka ha na-enwe oké ike ọgwụgwụ ma nyekwuoro ha aka, napụ ha ibu ụfọdụ, ma ọ bụ tụọ aro ka ha hapụ ịbịa ọrụ otu ụbọchị.

Ịbụ Abụ Na-eme Ka E Nwee Ọṅụ

Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na ịbụ abụ na-eme ka mmiri ahụ dịrị n’ụbụrụ bụ́ nke na-eme ka ị nọrọ jụụ ma nwee obi ụtọ, ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Stuttgarter Nachrichten na-akọ. Ndị nchọpụta na-ekwu na ịbụ abụ na-akpalite “mmetụta uche” nke dị n’ụbụrụ. N’ihi ya, “e kwuru na ịbụ abụ abụghị nanị iji gosipụta mmetụta nke uche kama ọ bụkwa iji nwee ya,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ndị nkụzi egwú na-ekwu na ọtụtụ mmadụ taa na-eche na ịbụ abụ bụ “ihe mgbe ochie” ma ọ bụ na olu ha adịchaghị mma, ya mere ha na-ahapụkwara usoro mgbasa ozi ịbụ abụ na ịgụ egwú. Otú ọ dị, nchọpụta a na-egosi na ndị mmadụ na-erite uru mgbe ha na-abụ abụ n’onwe ha.

Izu Ihe Dị n’Ubi

N’ọtụtụ steeti Germany, ndị ọrụ ubi na-eme mkpesa banyere iri elu nke izu ihe dị n’ubi, ka Siegener Zeitung na-akọ. Ndị ohi na-eji bọket ekporo cucumber, na-ejikwa obere ụgbọala ekporo akwụkwọ nri asparagus. N’otu mgbe ha zuuru osisi strawberry 7,000. Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ izuru ihe oriri n’ihi ọnọdụ ego ha na-akawanye njọ, o yiri ka ndị ọzọ hà na-ele ya anya dị ka ihe omume ntụrụndụ. Ndị ọrụ ubi na-akọ na ha na-ahụ “ụdị ụgbọala dị iche iche” n’akụkụ ubi ndị ahụ e zuuru ihe na ha. Ubi ndị ahụ na-adịkarị anya site n’ebe ndị nwe ha bi, ndị ohi na-emekwa otú masịrị ha karị n’ubi ndị a. Otu onye ọkachamara tụrụ aro ka ndị ọrụ ubi jiri nri ala na-ekpuchi ihe ubi ha iji mee ka ndị ohi ahụ kwụsị ịbịa.

Ndị Na-eso Ndị Ọzọ Emekọrịta Ihe Pụrụ Ịdị Ogologo Ndụ Karị

Dị ka nchọpụta Mahadum Harvard mere na nso nso a si dị, ndị mere okenye bụ́ ndị na-ekere òkè n’ihe omume ọha na eze, dị ka ịga chọọchị, ụlọ nri, egwuregwu, na ihe nkiri sịnịma, na-eji nkezi nke afọ abụọ na ọkara adị ogologo ndụ karịa ndị na-adịghị esokarị ndị ọzọ emekọ ihe. A nọwo na-eche na ọ bụ akụkụ ndị e ji ọkpụkpụ aka eme n’ihe omume ndị dị otú ahụ nyeere ndị mmadụ aka, ka Thomas Glass nke Harvard, bụ́ onye ndú nke ndị mere nchọpụta ahụ kwuru. Otú ọ dị, o kwukwara na nchọpụta a na-eme ka e nwee “ihe a na-eche na ọ bụ ihe àmà kasị zuo ezuo e nwere ugbu a na inwe nzube nke bara uru n’oge mmadụ mere agadi na-eme ka ndụ dịkwuo ogologo.” Glass kwuru na imekwu ihe, n’agbanyeghị ihe omume ọ bụ, mere ka ndụ dịkwuo ogologo n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla e nyochara.

 Ụgbọ Okpukpu Ndị Kasị Ochie n’Ụwa

Ndị ọkà mmụta ihe ndị dị n’oké osimiri achọtawo ụgbọ mmiri Finisia abụọ kpuru n’ihe dị ka 750 T.O.A., ka magazin France bụ́ Sciences et avenir na-akọ. Ụgbọ mmiri abụọ ahụ dị mita 15 na mita 18, bụ́ ndị dị n’ụsọ oké osimiri Israel nke ịdị ogbu ya dị ihe dị ka mita 500, bụ ụgbọ mmiri ndị kasị ochie a chọpụtatụrụla n’oké osimiri. Ụgbọ mmiri ndị ahụ si n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Taịa buru udu e ji agbanye mmanya na-aga ma eleghị anya Ijipt ma ọ bụ obodo Carthage nke dị n’Ebe Ugwu Africa. Dị ka e hotara n’International Herald Tribune, onye chọpụtara ụgbọ mmiri ndị ahụ, bụ́ Robert Ballard, kwuru, sị: “Ịdị ogbu nke oké osimiri, enweghị ìhè anyanwụ, oké nrugharị, yiri ka ha na-echebe akụkọ ihe mere eme karịa otú anyị chere.” Ndị nnyocha ahụ kwuru na nchọpụta a e mere “pụrụ inye aka inwe ihe ọmụma dị nnọọ ọhụrụ n’ime nchọpụta banyere ụzọ e si jiri ụgbọ mmiri mee ihe n’oge ochie.”

Nhọrọ Mbụ Maka Izu Ike

Ná nnyocha e mere na nso nso a, a jụrụ 1,000 mmadụ ná mba 30 dị iche iche ihe omume ha na-ahọrọ iji belata ma ọ bụ kwụsị nchekasị. N’ụwa dum, pasent 56 nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ gosiri na egwú bụ ihe mbụ ha na-ahọrọ, ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi Reuters na-akọ. N’Ebe Ugwu America, pasent 64 họọrọ egwú ịbụ ihe mbụ, ma e jiri ya tụnyere pasent 46 nke ndị bi ná mba ndị mepere emepe n’Esia. N’ozuzu ya, ikiri TV nọ n’ọnọdụ nke abụọ, ebe ịsa ahụ na-esochi. “Mgbe i chere ihe a na-ere egwú na nnweta a na-enweta ya na redio, TV, CD ndị mmadụ, Internet na ọtụtụ ebe ndị ọzọ a na-enweta egwú,” ka Tom Miller, bụ́ onye ndú nke nnyocha ahụ ụlọ ọrụ Roper Starch Worldwide mere, na-ekwu, “ọ bụghị ihe ijuanya na ihe karịrị ọkara ndị bi n’ụwa na-ege egwú iji zuru ike.”

Ịda Ogbenye—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Onyeisi Ụlọ Akụ̀ Ụwa, bụ́ James D. Wolfensohn, kwuru na nso nso a banyere nchegbu ọ na-enwe banyere ịda ogbenye na-aga n’ihu n’ụwa. Wolfensohn kwuru na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ijeri mmadụ isii bi n’ụwa ka bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka akwụkwọ akụkọ Mexico City bụ́ La Jornada na-akọ. O kwukwara na ọkara nke ndị bi n’ụwa na-eri ihe na-erughị dollar abụọ n’otu ụbọchị; otu ijeri na-erikwa ihe na-erughị otu dollar. Ọ bụ ezie na o nwere obi ụtọ maka ọganihu Ụlọ Akụ Ụwa nweworo n’ọgụ ọ na-alụso ịda ogbenye, Wolfensohn nyere ihe àmà ndị na-egosi na nsogbu a dị ebe nile ma bụrụ nke a na-edozibeghị. O kwuru, sị: “Anyị aghaghị ịnakwere na ịda ogbenye bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ.”

Ọ Bụrụ na Obi Akaghị Gị, Tụfuo Ya

Ebu ụfọdụ, dị ka ndị na-ama na blue cheese, dị mma oriri. Ma ndị ọzọ pụrụ ịdị ize ndụ, karịsịa nye ndị na-arịa ọrịa, ka UC Berkeley Wellness Letter na-adọ aka ná ntị ya. Ebu ndị mara na bred nakwa ihe ndị e ji ọka mee so ná ndị kasị nwee nsí. Ebu a na-ahụ anya na-enwekarị mkpọrọgwụ ndị na-erubanye n’ime nri. Ọzọkwa, isi nri n’ọkụ adịghị egbuli nsí na-adị n’ebu. Wellness Letter na-atụ aro sị:

▪ Tinye ihe ahụ na friji ma o kwe mee, ma jiri ya mee ihe tupu ebu amaa ya.

▪ Tụfuo obere mkpụrụ osisi, dị ka tomato ma ọ bụ grepụ mara ebu. Saa mkpụrụ osisi mmiri nanị mgbe ị chọrọ ịta ya, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịma ebu ma ọ dịrị miri mmiri.

▪ A pụrụ iji nlezi anya bepụ ebe ndị ebu mara ná mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị buru ibu ma sie ike, dị ka apple, poteto, cauliflower, ma ọ bụ yabasị. E kwesịrị ịtụfu mkpụrụ osisi dị nro mara ebu dị ka peach na melon.

▪ A pụrụ iji akụkụ ụfọdụ nke cheese siri ike ebu mara mee ihe site n’isi n’akụkụ elu elu nke ebe ebu mara bepụ ma ọ dịkarịa ala ihe dị ka sentimita 3. Ma tụfuo cheese dị nro na yogurt ebu mara nakwa bred, anụ, nri ndị e rifọrọ erifọ, akị, ahụekere a kwọrọ akwọ, syrup, na ihe oriri a gbara ná mkpọ.

Ịmịkpọ Ihe n’Ụzọ Ka Mma

“Anụ na-egheghị eghe na-abụkarị ihe na-akpata nchegbu n’ime ka nri bụrụ nke na-adịghị akpata ọrịa, ma n’afọ ndị na-adịbeghị anya, isife ihe ókè—karịsịa ịmịkpọ anụ, ọkụkọ, na azụ̀—abụrụwo ihe a na-ele anya dị ka ihe ndị so na-akpata ọrịa na-adịte aka,” ka akwụkwọ akụkọ National Post nke Canada na-ekwu. Mgbe e ji ọkụ na-enwusi ike sie anụ, a na-emepụta heterocyclic amines (HCA) na-akpata ọrịa cancer. Akụkọ ahụ na-atụ aro na iji nanị ihe ndị na-agbanwe ụtọ ihe “dị ka mmiri oroma nkịrịsị, mmiri oroma, ma ọ bụ vinegar,” eme ihe pụrụ imekwu ka ịmịkpọ anụ ghara ịdị ize ndụ. Ná nnwale ndị e mere ugboro ugboro, ndị nnyocha nọ n’Ụlọ Ọrụ Maka Nnyocha Ọrịa Cancer nke America “chọpụtara na nri ndị e tinyere ihe ndị na-agbanwe ụtọ ha ji pasent 92 ruo pasent 99 nwee HCA dị ala karịa ndị a na-etinyeghị ihe ndị na-agbanwe ụtọ ha—o nweghịkwa ihe o mere ma è tinyere ha ihe ndị na-agbanwe ụtọ ha ruo minit 40 ma ọ bụ ụbọchị abụọ.”