Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ubube Eme Ihe—Ị̀ Na-eme Nnyocha Ndị A Iji Zere Mmerụ Ahụ?

Iji Ubube Eme Ihe—Ị̀ Na-eme Nnyocha Ndị A Iji Zere Mmerụ Ahụ?

Iji Ubube Eme Ihe—Ị̀ Na-eme Nnyocha Ndị A Iji Zere Mmerụ Ahụ?

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Ireland

Ọ DỊ Paul mkpa ịgbanwe bọlb ọkụ eletrik dị n’ihu ụlọ ya. Ọ dịkwa ya mkpa ihicha windo ndị dị n’ụlọ elu site n’èzí—nwunye ya ekwuwo nke a ọtụtụ ugboro. Ma Paul nọgidere na-eyigharị oge ọ ga-arụ ọrụ ndị a. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eji ubube rụọ ha.

O nwere ezi uche ịtụ egwu dị otú ahụ. Ọ maara na isi n’elu ubube daa pụrụ ịkpata mmerụ ahụ dị ukwuu, ọbụnakwa ọnwụ. Mgbe mgbe nke a na-eme n’ihi na onye na-arụ ọrụ echeghị echiche nke ọma banyere ụzọ ziri ezi e si eji ubube eme ihe.

Tupu ọ rụọ ọrụ ndị a, gịnị dị mkpa ka Paul tụlee banyere ubube? Ndị a bụ aro iri nyeere ya aka ime ihe n’emerụghị ahụ.

Ubube ahụ Ọ̀ Dị Mma?

1 Na-eji ubube kwesịrị ekwesị. Ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị ịgbatị onwe gị gabiga ókè ma ọ bụrụ na ubube ahụ dịkarịrị mkpụmkpụ. Ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị ịgbabiwe ya n’ebe dị ize ndụ ma ọ bụrụ na ọ dịkarịrị ogologo. Zere iji ubube a na-apịachi apịachi arịba n’uko ụlọ gị. Debe ubube kwesịrị ekwesị a ga na-eji arịba n’uko ụlọ gị, ma ọ bụ na-eji ubube a na-agbabewe agbabewe arịba.

2 Na-enyocha ubube gị nke ọma. È debere ya n’èzí? Ubube e ji osisi rụọ na-agbasa mgbe o dere mmiri, ọ na-akpachikọlatakwa mgbe ọ kọrọ mmirị. Ka oge na-aga, ebe ndị a na-azọdo ya ụkwụ nwere ike ghara isikwa ike, na-eme ka ubube ahụ na-aṅagharị aṅagharị. Ọ̀ dị nke ọ bụla n’ime ebe ndị a na-azọdo ya ụkwụ gbawara agbawa, ma ọ bụ ọ̀ dị ihe na-egosi na ha ereela? A na-enwekarị ígwè na-adị n’okpuru osisi nke ọ bụla a na-azọdo ụkwụ iji mee ka o sie ike. Ò nwere ya, ò sikwara ike? Ntú ndị e ji kụdo ihe ndị a na-azọdo ụkwụ n’ubube, hà agbajiela ma ọ bụ taa nchara? Ubube abụọ e jikọtara ọnụ pụrụ inwe ihe mkpọre na eriri. Ihe mkpọre ndị ahụ hà na-arụ ọrụ nke ọma? Ọ̀ dị ihe na-egosi na eriri ahụ akaala, ọ̀ ka dịkwa ogologo otú kwesịrị ekwesị? Rụzie ihe nile chọrọ nrụzi ma ọ bụ gbanwee ihe nile chọrọ mgbanwe ozugbo.

A na-etinyekarị oghere ndị na-eme ka ụkwụ mmadụ ghara ịmịchapụ n’ihe ndị ahụ a na-azọdo ụkwụ. Hụ na i wepụrụ unyi ọ bụla pụrụ ijupụta n’ime oghere ndị ahụ. Ubube nile kwesịrị inwe ihe ndị e tinyere n’ụkwụ ha na-egbochi ha ichipụ echipụ. Mee nnyocha iji hụ na ha dị ya nakwa na ha emebibeghị emebi n’ụzọ dị ukwuu.

3 Na-ebu ubube otú ọ na-agaghị akpata mmerụ ahụ. Ọ bụrụ na i ji ụgbọala buru ubube, kegide ya n’ihe kwesịrị ekwesị a na-ekedo ihe, ma ọ bụ kegide ya n’ụzọ ebe abụọ ma ọ dịkarịa ala n’ihe ụgbọala na-adọkpụ. Ubube dị ogologo pụrụ ịpụta n’azụ ụgbọala, n’ihi ya kegide ákwà ịdọ aka ná ntị n’azụ ya ka ọ dịrị onye na-eso gị n’azụ mfe ịhụ ya.

Ọ na-akasị mma ma mmadụ abụọ buru ubube dị ogologo. Ma ọ bụrụ na ị ga-eburịrị ya nanị gị ma chọọ ịgbatị ya agbatị ka i bu ya na-aga, were otu aka jidesie ya ike n’ubu gị, jiri aka nke ọzọ na-eme ka ọ kwụzie. Iji zere ịkụ ya mmadụ, bulie ebe ihu ya elu ka ọ gafee ogo mmadụ. Otú ọ dị, buru n’uche na ebe azụ ya na ebe ihu ya hà n’ogologo! Mgbe a kụrụ mmadụ ubube, ihe nkiri ndị na-atọ ọchị na-eme ka o yie ihe na-atọ ọchị. Otú ọ dị, a bịa n’ihe na-eme eme n’ezie, nke a adịghị atọ ọchị—karịsịa ma ọ bụrụ gị ka e mere ya.

Mgbe i guzowere ubube ọtọ ma buru ya na-aga, mee ka arọ ya dịrị n’ubu gị, jiri otu aka jide ya n’ubu gị, weliekwa aka nke ọzọ elu iji jide ya n’elu ka ọ kwụrụ. Lezie anya maka waya, bọlb ọkụ, na saịn bọọdụ ndị dị n’elu!

4 Na-edozi ubube edozi. Iji zere mmerụ ahụ, e kwesịghị ịgbabewe akụkụ ubube n’ihe, ọ ghaghịkwa iji degree 75 gbabere n’ihe.

5 Na-eji ihe ejide ya n’elu ma na-ehiwe ihe n’ala ala ya. Kpachara anya maka ebe ị na-agbabewe ebe elu ubube. Jide n’aka na ebe e guzowere ubube dị larịị nakwa na ọ dịghị amị amị. Ya adịla mgbe ị ga-eguzowe ubube n’elu ugegbe ma ọ bụ plastik. Mgbe o kwere mee, kegidesie ya ike n’ihe a rụnyere arụnye, mee ka ebe elu ya jiri otu mita gafee ebe a gbabewere ya.

Kpachara nnọọ anya ịhụ na i kegidere ebe elu ya n’ihe mgbe ị rịgoro ya nke mbụ. Nrịgo nke mbụ ahụ pụrụ ịkpata mmerụ ahụ, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa nke ikpeazụ, bụ́ mgbe ị ga-arịdata ka ị ketusịrị ya n’elu. Iji mee ka nrịgo nke mbụ na nke ikpeazụ bụrụ nke na-adịkarịghị ize ndụ, gwa mmadụ ka o nyere gị aka jide ubube ahụ n’ebe ala ala ya ka ị na-arịgo. Otú ọ dị, nke a na-adị irè nanị mgbe ubube ahụ na-akarịghị mita ise n’ogologo.

Ọ bụrụ na ala kpọdara akpọda site n’ụlọ ahụ, debe ihe dị arọ n’ala ala ubube ahụ ma ọ bụ kegide ihe nke mbụ a na-azọdo ụkwụ n’ihe a rụnyere arụnye. Ọ bụrụ na ala ahụ adịghị larịị ma bụrụ nke siri ike, hinye ya ihe n’okpuru ka o guzoro n’ebe dị larịị. Jiri ibé osisi ma ọ bụ ihe yiri ya mere ihe siri ike ị ga-eguzowe ya na ya ma ọ bụrụ na ala ahụ na-emi emi.

Ọ bụrụ na i ji ubube a na-apịachi apịachi na-eme ihe, jide n’aka na ụkwụ anọ ahụ nile gbadosiri ike n’ala, gbasaa ubube abụọ ahụ nke ọma ma pịchie ihe ọ bụla na-egbochi ya ịpịachi n’ike nke ọma.

Ị̀ Nọ ná Nchebe?

6 Na-enyocha akpụkpọ ụkwụ gị. Tupu ị rịgoro ubube, hụ na okpuru akpụkpọ ụkwụ gị dị kọrọ kọrọ. Wepụ ihe ọ bụla, dị ka apịtị, nke pụrụ ime ka ụkwụ gị mịchapụ.

7 Na-eji nlezianya ebu ihe. Iji mee ka aka gị bụrụ nanị maka ịrịgo elu, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, tinye ngwá ọrụ n’ime akpa i ji belt kegide n’úkwù gị. Gbalịa ịchọta ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi na-ebugo ihe ndị na-adịghị mfe obubu, ma ọ bụrụ na ị ga-ejirịrị ubube, were aka nke ị na-ejighị buru ihe na-ejide ubube ahụ mgbe nile site n’ịdị na-achị ya n’akụkụ ubube ahụ ka ị na-arịgo. Jiri nwayọọ ma na-arị ya otu otu otú ahụ e si rụọ ya, arikwala ya ọsọ ọsọ.

Ọ bụrụ na i ji ngwá ọrụ ji ike eletrik eme ihe na-arụ ọrụ, ya adịla mgbe ị ga-eji aka abụọ jide ya ka ị na-arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ngwá ọrụ eletrik e ji akpọpu ihe pụrụ ịtọ n’ike ma ọ bụ mịchapụ, wee mee ka ị nọhie ọnọdụ ma daa. Ya adịla mgbe ị ga-agbachi ha mgbe ị ka ji ha na-arụ ọrụ na-aga n’ihu; ha pụrụ ịda mgbe ha ka na-arụ ọrụ.

8 Na-echebara ndị ọzọ echiche. Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ n’ebe ndị mmadụ na-agafe, mee ka e nwee ike ịhụ ubube ahụ ngwa ngwa, ọ bụrụkwa na ọ ga-ekwe mee, jiri eriri gebichie ebe ahụ ka mmadụ ghara isi na ya gafee. Ọ bụrụ na ị ghaghị iburu ubube ahụ gafee ebe gbagọrọ agbagọ, mara na ọ ga-enweta ndị ọzọ na mberede. Kwuo okwu n’ụzọ dị mma iji mee ka ndị mmadụ mara, leekwa ma ọ̀ dị onye nọchiri ụzọ.

Mgbe i bu ngwá ọrụ rịgoo n’ubube, buru n’uche na ọbụna obere screwdriver pụrụ ịkpata mmerụ ahụ ma o si n’elu daa. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịpụ n’ihi otu ihe nakwa na i nweghị ike ikegide ubube ahụ n’ihe nke ọma, gwa mmadụ ka o legide ya anya, ma ọ bụ tọgbọ ubube ahụ n’ala otú ọ na-agaghị emerụ mmadụ ahụ ruo mgbe ị lọghachiri. Ahapụla ya n’enweghị onye legidere ya anya.

9 Na-atụle ọnọdụ ahụ ike gị. Ebe ọ bụ na nkwụzi na ime ihe n’usoro na-enye aka nke ukwuu n’ihe banyere ịrị elu, arịla elu ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa ma ọ bụ mgbe agbọ na-enu gị ma ọ bụ ọ bụrụ na ájụ̀ na-ebu gị ma ị nọrọ n’elu lee anya n’ala.

10 Na-arị elu n’ụzọ na-agaghị akpatara gị mmerụ ahụ. Na-ezere mmerụ ahụ mgbe nile. Ya adịla mgbe ị ga-ekwe ka mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa rịa elu otu ubube otu mgbe. Ya adịla mgbe ị ga-arị ya ma e nwee oké ifufe. Ya adịla mgbe ị ga-eguzo n’elu ebe a na-edebe ihe n’ubube a na-apịachi apịachi ma ọ bụ n’ihe nke anọ a na-azọdo ụkwụ site n’ebe elu elu nke ubube dị ogologo. Ya adịla mgbe ị ga-agbatị otu n’ime ubube abụọ ndị e jikọtara ọnụ gabiga ókè; hụ mgbe nile na ihe ndị a na-azọdo ụkwụ bụ́ ndị dị n’ubube nke ọ bụla ga-afọdụ atọ ma ọ dịkarịa ala. Ya adịla mgbe ị ga-eme ihe n’ebe ị ga-amatịbiga aka gị ókè. Ọ bụrụ na ị gbatịbiga onwe gị ókè ka ị nọ n’elu ubube, ọ dị mfe na ị ga-anọhie ọnọdụ ma daa. Kama ime ihe ga-eme ka i merụọ ahụ, bugharịa ubube ahụ, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ ga-ewe oge karịrị oge ị ga-eji rụọ ọrụ ahụ. Mgbe ị na-arịgo, na-ele anya n’elu.

N’agbanyeghị ókè ị na-akpacharu anya, ị ga na-enwe ihe ize ndụ mgbe ọ bụla i ji ubube mee ihe. Ikekwe aro ndị a pụrụ inyere gị aka ibelata ha. Ha nyeere Paul aka. Site n’ịgbaso ha, o tinyere bọlb ọhụrụ ahụ n’ọkụ eletrik ahụ a rụnyere n’ihu ụlọ n’emerụghị ahụ. Gịnikwa banyere ihicha windo ahụ? Ọ ga-eme nke ahụ n’oge ọzọ . . . ma eleghị anya!

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

1 Na-eji ubube kwesịrị ekwesị

2 Na-enyocha ubube gị nke ọma

3 Na-ebu ubube otú ọ na-agaghị akpata mmerụ ahụ

4 Na-edozi ubube edozi

5 Na-eji ihe ejide ya ma na-ehiwe ihe n’ala ala ya

6 Na-enyocha akpụkpọ ụkwụ gị

7 Na-eji mkpachara anya ebu ihe

8 Na-echebara ndị ọzọ echiche

9 Na-atụle ọnọdụ ahụ ike gi

10 Na-arị elu n’ụzọ na-agaghị akpatara gị mmerụ ahụ