Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nna—Ihe Mere Ha Ji Agbahapụ Ụmụ Ha

Ndị Nna—Ihe Mere Ha Ji Agbahapụ Ụmụ Ha

 Ndị Nna—Ihe Mere Ha Ji Agbahapụ Ụmụ Ha

“Echetaghị m mgbe ọ bụla mama m na papa m lụrụ ọgụ ma ọ bụ rụọ ụka. Nanị ihe m maara bụ na papa m nọ ya, otu ụbọchị—na mberede!—ọ nọghịzi ya. Amaghị m ebe papa m nọ ruokwa taa. Amaara m na o nweghị ihe jikọrọ mụ na ya.”—Bruce.

“Ọ bụ nanị m bụ nwatakịrị nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị na-enweghị nne na nna, na-ebighịkwa n’ụlọ . . . Mgbe nile ọ na-adị m ka m gbapụrụ iche. M na-enwekarị mmetụta dị iche site na nke ndị nile mụ na ha bụ ọgbọ.”—Patricia.

NSOGBU nke ezinụlọ ndị na-enweghị nna malitere n’oge mgbanwe usoro mmepụta ihe. Ka ịrụ ọrụ ụlọ mmepụta ihe malitere ịdọpụta ndị ikom n’ebe obibi ha, mmetụta nna na-enwe n’ebe ezinụlọ nọ malitere ibelata; ndị nne malitere ikere òkè ka ukwuu n’ịzụ ụmụaka. * Ka o sina dị, ọtụtụ ndị bụ́ nna agbahapụghị ezinụlọ ha. Otú ọ dị, n’etiti afọ ndị 1960, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm na United States malitere ịrị elu nke ukwuu. Ihe ndị metụtara okpukpe, akụ̀ na ụba, na mmekọrịta ọha mmadụ bụ́ ndị na-egbochi ịgba alụkwaghịm malitere ịdakpọsị. N’ịbụ ndị ndụmọdụ nke ndị kpọrọ onwe ha ndị ọkachamara bụ́ ndị kwusiri ike na ịgba alụkwaghịm abụghị nanị na ọ dịghị emetụta ụmụaka n’ụzọ dị njọ kamakwa na ọ pụrụ ịbara ha uru n’ezie kwaliri, ọtụtụ di na nwunye kpebiri ịgba alụkwaghịm n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. Akwụkwọ bụ́ Divided Families—What Happens to Children When Parents Part, nke Frank F. Furstenberg, Jr., na Andrew J. Cherlin dere na-ekwu, sị: “Na Belgium, France, nakwa na Switzerland, ọnụ ọgụgụ ndị [na-agba alụkwaghịm] ejiwo okpukpu abụọ rịa elu [kemgbe afọ ndị 1960], ebe o jiworo okpukpu atọ rịa elu na Canada, England, na Netherlands.”

Ọ bụ ezie na ụmụaka na-esokarị nne ha mgbe a gbasịrị alụkwaghịm, ihe ka ọtụtụ ná ndị nna bụ́ ndị na-apụ n’ezinụlọ na-achọ ịnọgide soro ụmụ ha na-enwe mmekọrịta. Inwekọ ikike ịkpọrọ nwa bụ otu ihe ngwọta a mazuuru n’ebe nile. Ma, ọ na-eju anya na ihe ka ọtụtụ ná ndị nna a gbara alụkwaghịm  adịghị ahụkebe ụmụ ha anya. Otu nnyocha e mere kpughere na nanị 1 nwatakịrị n’ime ụmụaka 6 na-ahụ nna ya a gbara alụkwaghịm kwa izu. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ụmụaka ahụ ahụbeghị nna ha n’ime otu afọ zuru ezu!

Nsogbu Dị n’Inwekọ Ikike Ịkpọrọ Nwa

Ka di na nwunye gbara alụkwaghịm nwekọọ ikike ịkpọrọ nwa, ọ na-achọ imekọ ihe ọnụ na ntụkwasị obi dị ukwuu—àgwà ndị a na-adịghị enwekebe. Ndị nnyocha bụ́ Furstenberg na Cherlin tinyere ya otú a: “Ihe bụ́ isi mere ndị nna ji akwụsị ịhụ ụmụ ha bụ na ha achọghị ihe ga-ejikọ ha na onye bụbu nwunye ha. Ọtụtụ ndị inyom na-emesokwa onye bụbu di ha otú ahụ.”

N’ezie, ọtụtụ ndị nna a gbara alụkwaghịm na-ahụkwa ụmụ ha mgbe nile. Ma n’ihi na ha na ụmụ ha adịghịkwa akpachi anya kwa ụbọchị, ọ na-esiri ụfọdụ ike ịkpa àgwà dị ka ndị nna mgbe ha na ha nọ. Ọtụtụ na-ahọrọ ịbụ ndị ha na ụmụ ha na-egwuri egwu, na-etinye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ oge nile ha na ha na-anọkọ ná ntụrụndụ ma ọ bụ n’ịzụta ihe. Ari dị afọ 14 na-akọwa nleta nna ya na-eleta ya ná ngwụsị izu, sị: “Ọ dịghị usoro ihe omume a kapịrị ọnụ, ọ dịghị ihe dị ka ‘Lọta ma o jiri ọkara gafee elekere anya ise.’ Ọ dịghị ihe mgbochi dịnụ. Ọ dịghị ihe a machibidoro iwu. Papa m na-azụtakwara m ihe mgbe nile.”—How It Feels When Parents Divorce, nke Jill Krementz dere.

Nna na-ahụ n’anya kwesịrị ‘ịmata inye ụmụ ya ezi onyinye.’ (Matiu 7:11) Ma a gaghị eji onyinye dochie anya nduzi na ọzụzụ dị ha mkpa. (Ilu 3:12; 13:1) Mgbe mmadụ hapụrụ ọrụ nna ma wegharazie ọrụ onye ya na ụmụaka na-egwuri egwu ma ọ bụ onye ọbịa, mmekọrịta na-adị n’etiti nna na nwa ga-emebirịrị. Otu nnyocha kwubiri, sị: “Ịgba alụkwaghịm pụrụ ibibi mmekọrịta na-adị n’etiti nna na nwa kpam kpam.”—Journal of Marriage and the Family, May 1994.

N’ịbụ ndị iwe ji n’ihi ịbụ ndị na-adịkwaghị eso ụmụ ha akpakọrịta—ma ọ bụ ma eleghị anya ịbụ ndị na-enweghị mmasị—ndị ikom ụfọdụ na-agbahapụ ezinụlọ ha, ghara inye nkwado ego dị ha mkpa. * (1 Timoti 5:8) “Ọ dịghị ihe ọ bụla m na-echeta banyere papa m na-amasị m,” ka otu nwa okoro nọ n’afọ iri na ụma iwe ji na-ekwu. “N’ezie ọ dịghị ihe ọ na-eme, ọ dịghị akwado anyị ma ọlị, echekwara m na nke ahụ jọgburu onwe ya.”

Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Na-alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye

Ọnụ ọgụgụ a na-enwetụbeghị mbụ nke ịmụ nwa mkpuke akpatawo mmụba kasị elu nke ụmụaka na-enweghị nna. “Ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụ a na-amụ na [United States] na-abụzi nke ndị na-alụghị di,” ka akwụkwọ bụ́ Fatherless America na-ekwu. N’ime ihe dị ka ụmụ ọhụrụ 500,000 nke ndị dị site n’afọ 15 ruo 19 na-amụ kwa afọ, ọ bụ pasent 78 nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-alụbeghị di na-amụ ha. Otú ọ dị, ntụrụ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ. Ihe omume ndị na-akụzi mgbochi afọ ime ma ọ bụ ndị na-akwado izere mmekọahụ agbanwebeghị otú ndị nọ n’afọ iri na ụma si enwe mmekọahụ.

Akwụkwọ bụ́ Teenage Fathers, nke Bryan E. Robinson dere, na-akọwa, sị: “Ịtụrụ ime n’alụghị di adịghịzi akpata ihere na mmechuihu ọ na-akpata n’afọ ndị 1960 n’ihi àgwà ụmụ mmadụ nke  ịnabatakwu mmekọahụ na ịtụrụ ime tupu alụmdi na nwunye. . . . Ọzọkwa, a na-egosi ndị ntorobịa nke taa otú e si enwe mmekọahụ ná mkpọsa ngwá ahịa, n’egwú, na sinima, nakwa na telivishọn n’ọ̀tụtụ̀ dị ukwuu. Usoro mgbasa ozi nke America na-agwa ndị nọ n’oge uto na mmekọahụ bụ ahụmahụ na-akpali akpali ma na-atọ ụtọ n’egositụghị ha n’ezie ihe ndị na-esi ná mmekọahụ dabeere nanị ná mkpali nakwa nke na-ekwesịghị ekwesị apụta.”

Ọtụtụ ndị na-eto eto yiri nnọọ ka ọ bụ na ha amaghị ihe ọjọọ ndị na-esi ná mmekọahụ rụrụ arụ apụta. Rịba ama ihe ụfọdụ Robinson, bụ́ onye na-ede akwụkwọ, nụrụ: “‘O yighị ụdị onye [ga-atụrụ ime]’; ‘Anyị na-enwe mmekọahụ nanị otu ugboro n’izu’; ma ọ bụ ‘Echeghị m na ị pụrụ ịtụrụ ime na nke mbụ.’” Otú ọ dị, ndị na-eto eto ụfọdụ maara nke ọma na mmekọahụ pụrụ ịkpata afọ ime. Akwụkwọ bụ́ Young Unwed Fathers na-ekwu, sị: “Nye ọtụtụ ụmụ okoro [nọ n’ime obodo], mmekọahụ bụ ihe dị mkpa e ji amata ọnọdụ mmadụ n’ógbè; inwe mmeri ná mmekọahụ na-aghọ ihe e ji eme ọnụ. Ọtụtụ n’ime ụmụ agbọghọ na-enwe mmekọahụ dị ka onyinye ha na-enye maka ọchịchọ ha na-achọ ịdọta mmasị nwa okorobịa.” N’ime obodo ụfọdụ, a pụrụ ime ụmụ okorobịa na-amụbeghị nwa akaje maka ịbụ “ndị na-amaghị nwanyị”!

Akụkọ a ọbụna na-ajọgbukwu onwe ya ná njọ mgbe ị tụlere ihe a chọpụtara ná nnyocha e mere n’afọ 1993 nke ụmụaka toruworo ogo ịga akwụkwọ bụ́ ndị mụworo ụmụ na California. A chọpụtara na ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ụmụ agbọghọ tụrụwooro ime abụghị ndị enyi ha nwoke nọ n’afọ iri na ụma tụwara ha ime kama ọ bụ ndị ikom gafeworo afọ 20! N’eziokwu, nnyocha ụfọdụ na-egosi na ọtụtụ ndị nne nọ n’afọ iri na ụma, na-alụghị di bụ ndị e dinara n’ike mgbe ha na-etorubeghị ogo mmadụ—ma ọ bụ ọbụna ndị e dinara mgbe ha bụ ụmụaka. Nrigbu dị otú ahụ nke zuru ebe nile na-ekpughe ókè omume ọha mmadụ nke oge a jọruworo ná njọ ma rụọ arụọ.—2 Timoti 3:13.

Ihe Mere Ụmụ Okorobịa Ji Apụ

Ụmụ okoro nọ n’afọ iri na ụma na-amụ ụmụ adịghị elekọtakebe ụmụ ha ruo ogologo oge. Otu nwa okoro nke enyi ya nwanyị tụụrụ ime kwuru, sị: “Nanị ihe m gwara ya bụ, ‘Ka ọ dịnụ.’” Otú ọ dị, dị ka otu isiokwu dị n’akwụkwọ bụ́ Family Life Educator na-akọwa, “ihe ka ọtụtụ ná ndị nna na-eto eto na-egosipụta ọchịchọ siri ike ha nwere iso ụmụ ha na-enwe mmekọrịta chiri anya.” Dị ka otu nnyocha e mere ndị nna na-eto eto na-alụghị nwunye gosiri, pasent 70 letara nwa ha otu ugboro n’izu. “Otú ọ dị,” ka isiokwu ahụ na-adụ ọdụ, “ka ụmụ ahụ na-eto, ugboro ole a na-eleta ha na-ebelata.”

Otu nna dị afọ 17 chịkọtara ihe mere o ji dị otú ahụ, na-asị: “A sị nnọọ na m maara ókè ọ ga-esiru n’ike, agaraghị m ekwe ka nke a mee.” Ọ bụ ndị ntorobịa ole na ole nwere ma ntozu okè n’ụzọ mmetụta uche ma ahụmahụ dị mkpa iji mezuo ihe ịbụ nna na-achọ. Ọtụtụ agụghị akwụkwọ ma ọ bụ nwee nkà ọrụ dị mkpa iji nweta ihe e ji ebi ndụ. Kama ịnagide mweda n’ala nke emetaghị ihe ha, ọtụtụ ụmụ okorobịa na-agbahapụ ụmụ ha. “Ndụ m jupụtara ná nsogbu,” ka otu nna na-eto eto na-ekwupụta. Ọzọ na-akwa arịrị, sị: “Elekọtalibeghị m onwe m; amaghị m ihe m ga-eme ma ọ bụrụ na aghaghị m ilekọtakwa [nwa m nwoke].”

Mkpụrụ Vine Na-achaghị Acha

N’oge Bible ndị Juu na-atụ otu ilu na-ekwu, sị: “Ndị nne na nna ahụ riri mkpụrụ vine na-achaghị acha, ma ọ bụ ụmụ ha ka ọ gbara na nti.” (Ezikiel 18:2, Today’s English Version) Chineke gwara ndị Juu na o kwesịghị ka ọ dị otú ahụ, na e kwesịghị imeghachi njehie ndị gara aga n’ọdịnihu. (Ezikiel 18:3) Ka o sina dị, ọtụtụ nde ụmụaka taa yiri ka hà na-anụ ụtọ ọjọọ nke “mkpụrụ vine na-achaghị acha” ndị mụrụ ha riri—na-enweta ntaramahụhụ maka etozughị okè, erughị eru, na ndakpọ nke alụmdi na nwunye ndị mụrụ ha. Nnyocha ahụ pụtara nnọọ ìhè n’igosipụta na a na-ekpughepụ ụmụaka ndị na-etolite n’enweghị nna nye oké ihe ize ndụ nke anụ ahụ na mmetụta uche. (Lee igbe dị na peji nke 7.) Nke kasị enye nsogbu n’obi bụ eziokwu ahụ bụ́ na a na-enyefekarị ihe nketa nke ezinụlọ na-enweghị nna site n’otu ọgbọ ruo n’ọzọ—nsogbu na-adịgide adịgide nke ihe mgbu na nhụjuanya.

Nsogbu ọ̀ bụ akara aka nke ezinụlọ ndị na-enweghị nna? Ọ dịghị ma ọlị. N’ezie, akụkọ ọma e nwere bụ na a pụrụ ịkwụsị nsogbu nke ezinụlọ ndị na-enweghị nna na-enwe. Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle otú a ga-esi mee ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ dị mma ịmara na tupu e nwekwuo ụlọ ọrụ mmepụta ihe, akwụkwọ ndị na-ekwu banyere ịzụ ụmụaka na United States na-elekwasịkarị ndị nna anya, ọ bụghị ndị nne.

^ par. 10 Dị ka ndị nnyocha bụ́ Sara McLanahan na Gary Sandefur si kwuo, na United States, “ihe dị ka pasent 40 nke ụmụaka e kwuru na ha ruru eru inweta ego nkwado enweghị ikike [ụlọikpe nyere] inweta ego nkwado ụmụaka ma ọlị, otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị nwere ikike ahụ adịghịkwa enweta ihe ọ bụla. Ọ bụ ihe na-erughị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụaka na-anata ego ole e kwesịrị inye ha.”

 [Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

IHE IZE NDỤ NKE ITOLITE N’ENWEGHỊ NNA

Itolite n’enweghị nna na-etinye ụmụaka n’oké ihe ize ndụ. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma ndị na-esonụ pụrụ igbu ụfọdụ ndị mgbu n’obi ịtụle, ịmata ihe ize ndụ ndị dị na ya bụ nzọụkwụ mbụ a ga-ewere n’igbochi ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ibelata mbibi ọ na-akpata. Ghọtakwa na ndekọ ọnụ ọgụgụ e nwetara ná nnyocha ahụ bụ maka ndị mmadụ n’ìgwè n’ìgwè ọ bụghị ndị mmadụ n’otu n’otu. Ọtụtụ ụmụaka na-etolite n’ezinụlọ ndị na-enweghị nna ma ghara inweta nke ọ bụla n’ime nsogbu ndị a. Dị ka isiokwu ikpeazụ anyị ga-egosi, ntinye aka nke ndị mụrụ ụmụ na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ibelata ihe isi ike ndị ọ pụrụ ịkpata. Tụlezie ụfọdụ n’ime ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdịnụ bụ́ ndị nwa na-enweghị nna pụrụ iche ihu.

Ihe Ize Ndụ Ka Ukwuu nke Mmetọ n’Ụzọ Mmekọahụ

Nnyocha e mere na-egosi n’ụzọ doro anya na ịnọ n’enweghị nna na-amụba ohere nwatakịrị nwere ịbụ onye e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ. Otu nnyocha na-egosi na n’ime ụmụaka 52,000 e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ, “ndị mejupụtara pasent 72 bụ ụmụaka nọ n’ezinụlọ na-enweghị nna ma ọ bụ nne na nna mụrụ ha.” Akwụkwọ bụ́ Fatherless America na-ekwusi ike na: “Ihe bụ́ isi na-eme ka ohere mmadụ nwere ịbụ onye e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ n’oge ọ bụ nwatakịrị buwanye ibu n’ọgbọ anyị bụ ịrị elu nke enweghị ndị lụrụ nwunye na ịrị elu nke ndị nna nkuchi, ndị enyi nwoke, na ndị ikom ndị ọzọ na-enweghị ihe jikọrọ ha na nke nwanyị.”

Ihe Ize Ndụ Ka Ukwuu nke Ịmalite Inwe Mmekọahụ na Nwata

Ebe ọ bụ na o yiri ka a dịghị enwekebe nlekọta nke ndị nne na nna n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna, ndị na-eto eto na-enwe ohere karị itinye aka n’omume rụrụ arụ. Enwekebeghị ọzụzụ ndị nne na nna pụkwara ịbụ ihe ọzọ na-akpata ya. “Ụmụ agbọghọ na-enweghị nna bụ́ ndị na-achịkwa ndụ ha, ji okpukpu abụọ na ọkara yie ka hà ga-atụrụ ime,” ka Ngalaba Ahụ Ike na Ijere Ọha na Eze Ozi nke United States na-ekwu.

Ịda Ogbenye

Otu nnyocha e mere ụmụ agbọghọ ndị isi ojii nọ n’afọ iri na ụma na South Africa gosiri na ịbụ nne n’alụghị di na-akpatakarị ịda ogbenye. “N’ihe dị ka 50% nke ndị dabara n’ọnọdụ a,” ka ndị mere nnyocha ahụ na-ekwu, “onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma adịghị alaghachi n’ụlọ akwụkwọ,” ọtụtụ ndị nne na-alụghị di na-emesịkwa gbawa akwụna ma zụwa ahịa ọgwụ ọjọọ. Ọnọdụ ahụ nwere ike ghara ịka nnọọ mma ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. Na United States, “pasent 10 nke ụmụaka nọ n’ezinụlọ ndị nwere nne na nna, dara ogbenye [na 1995], ma e jiri ya tụnyere pasent 50 nọ n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne.”—America’s Children: Key National Indicators of Well-Being 1997.

Nleghara Anya

N’ịbụ ndị a manyere ilekọta onwe ha, ndị nne ma ọ bụ nna ụfọdụ nanị ha na-azụ ụmụ na-enwe nnukwu ibu ọrụ, ha adịghịkwa ewepụta oge zuru ezu iji soro ụmụ ha nọkọọ. Otu nwanyị a gbara alụkwaghịm na-echeta, sị: “Ana m arụ ọrụ n’ehihie ma na-aga akwụkwọ n’abalị—na-arụgbụ onwe m n’ọrụ. Eleghaara m ụmụ m anya.”

Mkpaghasị Uche

N’adịghị ka ihe ndị ọkachamara ụfọdụ na-ekwu nke bụ na ụmụaka na-enweta onwe ha ngwa ngwa a gbasịrị alụkwaghịm, ndị nnyocha, dị ka Dr. Judith Wallerstein, achọpụtawo na ịgba alụkwaghịm na-akpata mkpaghasị uche na-adịte aka. “Ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa nọ n’agbata afọ iri na itoolu na iri abụọ na itoolu adịghị enwekebe ma ọ bụ enwe ọchịchọ inwe ọganihu mgbe afọ iri nke ịgba alụkwaghịm nke ndị mụrụ ha gasịrị. Ha adịghị enwe ihe mgbaru ọsọ ná ndụ . . . ha na-enwe mmetụta nke enweghị enyemaka.” (Second Chances, nke Dr. Judith Wallerstein na Sandra Blakeslee dere) A chọpụtara na ọtụtụ ụmụ nke ndị gbara alụkwaghịm enweghị ùgwù onwe onye, ha na-ada mbà n’obi, na-enupụ isi, na-ewekwa iwe mgbe nile.

Akwụkwọ bụ́ The Single-Parent Family na-ekwu, sị: “Ọtụtụ nnyocha na-egosi na ụmụ okoro ọ bụ nanị nne zụlitere n’enweghị nwoke bụụrụ ha ihe nlereanya ná ndụ adịghị atụkwasị obi n’ịbụ nwoke ha, ha na-enwe ùgwù onwe onye dị ala, mgbe ha mere okenye, ọ na-esikwara ha ike ịmalite mmekọrịta chiri anya. Nsogbu ụmụ agbọghọ pụrụ inwe n’ihi ịnọ n’enweghị ndị nwoke bụụrụ ha ihe nlereanya adịghị apụtakarị ìhè ruo mgbe ha batara n’oge uto ma ọ bụ mgbe ha mere okenye, ọ na-agụnyekwa inwe ihe isi ike n’inwe mmekọrịta na-aga nke ọma nke nwoke na nwanyị mgbe ha toruru ogo mmadụ.”