Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme na Nọvemba Iji Kwusaa Alaeze Chineke

Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme na Nọvemba Iji Kwusaa Alaeze Chineke

Jizọs kwusara “ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 4:43) Ọ kụzikwaara ndị mmadụ ka ha na-ekpe ekpere maka Alaeze ahụ. (Mat. 6:​9, 10) N’ọnwa Nọvemba, anyị ga-eme mkpọsa pụrụ iche iji kwusaa Alaeze Chineke n’ebe niile. (Mat. 24:14) Hazie oge gị ka i nwee ike iso mee mkpọsa a. Ndị niile ga-arụ ọsụ ụzọ inye aka n’ọnwa ahụ nwere ike ịhọrọ inye awa iri atọ ma ọ bụ iri ise.

Gụọrọ onye ọ bụla i nwere ike otu amaokwu Baịbụl kwuru gbasara Alaeze Chineke n’ókèala unu. Mgbe ị na-ahọrọ amaokwu Baịbụl ị ga-agụrụ mmadụ, chee gbasara ihe onye ahụ kweere. Ọ bụrụ na mmadụ enwee mmasị na nke mbụ i ziri ya ozi ọma, nye ya Ụlọ Nche Ọhaneze nke 2, nke afọ 2020. Egbula oge ịgaghachi na nke onye ahụ ma gbalịa jiri otu n’ime ihe dị n’ihe ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Oge fọrọ ka Alaeze Chineke gwepịa ọchịchị niile na-emegide ya na-akụzi kwarapụ kwarapụ. (Dan. 2:44; 1 Kọr. 15:​24, 25) N’ihi ya, ka anyị jiri ohere ọma a anyị ga-eji eme mkpọsa a pụrụ iche gosi na anyị na-akwado Jehova na Alaeze ya.

Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs