Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NEHỌM 1–HABAKỌK 3

Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova

Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova

Hab. 1:5, 6

Mbibi ahụ e kwuru na Babịlọn ga-ebibi Juda nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume, n’ihi na Juda nọ n’okpuru ọchịchị mba Ijipt bụ́ mba siri ezigbo ike. Ndị Kaldia esighị ike ka Ijipt. Ihe ọzọ bụkwa na ọtụtụ ndị Juu ekwetaghị na Jehova ga-agbachi nkịtị ka e bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Ma, ihe ọ sọkwara ya mee, amụma a ga-emezurịrị. Habakọk kwesịkwara ịna-atụ anya mmezu ya, mụrụ anya ma dịkwa uchu n’ozi Jehova.

Olee ihe mere m ji kwetasie ike na mbibi nke usoro ihe a adịla ezigbo nso?

Olee otú m ga-esi mụrụ anya ma na-anụ ọkụ n’obi n’ofufe Jehova?