Ebe ụmụnna na-enye mmadụ broshọ Obi Ụtọ na Jọjịa

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Nọvemba 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu kụziere mmadụ nke bụ́ eziokwu banyere aha aha Chineke. Dee otú ị ga-esi eme nke gị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Chọọnụ Jehova, Ka Unu Wee Dịrị Ndụ”

Gịnị ka ịchọ Jehova pụtara? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú ụmụ Izrel si jụ ịchọ Jehova?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga⁠-⁠Esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ime Nletaghachi

Olee otú i nwere ike isi na-emekwu nke ọma ná nletaghachi? Na-akpali mmasị onye ahụ, buru ihe ị chọrọ ime ná nleta nke ọ bụla n’obi, echefukwala ihe mere i ji na-aga ná nke ya.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Mụta Ihe n’Ihe Ndị I Mejọrọ

Akụkọ Jona gosiri na Jehova anaghị ajụ anyị kpamkpam ma anyị mejọọ ya. Kama, ọ na-achọ ka anyị si n’ihe anyị mejọrọ mụta ihe.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Anyị Ga-amụta n’Akwụkwọ Jona

Ichebara ihe ndị mere Jona echiche ga-enyere anyị aka ima ihe anyị ga-eme ma ihe anyị na-atụghị anya ya mee, meekwa ka ozi ọma na-atọ anyị ụtọ. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịna-ekpekwu ekpere maka enyemaka.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Anyị?

Olee ihe jikọtara ofufe anyị na-efe Chineke na mmekọrịta anyị na ụmụnna anyị?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova

Mbibi ahụ e kwuru na Babịlọn ga-ebibi Juda nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume. Ma, ihe ọ sọkwara ya mee, amụma a ga-emezurịrị. Habakọk kwesịkwara ịna-atụ anya mmezu ya.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova n’Oge Ihe Gbanweere Gị

Ọ bụrụ na mgbanwe achọwa ịkpa ofufe anyị aka ọjọọ, chọọkwa imebi adịm ná mma anyị na Jehova. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya na ịna-anụ ọkụ n’obi?