Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị otú eluigwe dị, gịnị ka ị ga-aza ya?

Amaokwu Baịbụl: Jọn 8:23

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu Ụlọ Nche a kọwara ihe Jizọs na Nna ya kọrọ banyere eluigwe.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Ì kwetara na Baịbụl buru ihe ndị na-eme n’ụwa taa n’amụma?

Amaokwu Baịbụl: 2 Tim. 3:1-5

Eziokwu: Ebe ọ bụ na ihe ndị Baịbụl buru n’amụma na-emezu taa, obi kwesịkwara isi anyị ike na ndị nke o kwuru ga-eme n’ọdịnihu ga-emezukwa.

OLEE URU ỊMỤ BAỊBỤL GA-ABARA GỊ? (Vidio)

Ihe i nwere ike ikwu: Anyị na-egosi ndị mmadụ otu obere vidio kwuru ebe anyị ga-esi nweta azịza ajụjụ ndị dị anyị mkpa. Lee ya. [Kpọnyere ya vidio ahụ.]

Otú a ga-esi enye ya: Akwụkwọ a kwuru ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke ga-esi dozie nsogbu ụwa a. [Nyezie ya akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị.]

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.