Gaa n'Isiokwu

Iwu Zuru Ụwa Ọnụ Banyere Ihe A Ga-eji Ihe Mmadụ Kwuru Gbasara Onwe Ya Mee

Iwu Zuru Ụwa Ọnụ Banyere Ihe A Ga-eji Ihe Mmadụ Kwuru Gbasara Onwe Ya Mee

IHE ANYỊ GA-EJI IHE Ị GWARA ANYỊ GBASARA ONWE GỊ EME

I nwere ike ịhụ ọtụtụ ihe dị na jw.org n’ebughị ụzọ mepee akaụnt ma ọ bụkwanụ gwa anyị ihe ụfọdụ gbasara onwe gị. Ma, ndị nwere ike ịhụ ihe ndị ọzọ dị na jw.org bụ ndị mepere akaụnt na jw.org, ndị si na jw.org zitere anyị fọm ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ gbasara onwe ha, ma ọ bụkwanụ ndị ọgbakọ Ndịàmà Jehova zitere ihe gbasara ha. Ihe ndị anyị ga-eji ihe ndị ị gwara anyị mee bụ naanị ihe ndị gbasara ihe ị chọrọ ka anyị meere gị. Ma mgbe ụfọdụ, ị sịgodị anyị na i nyeghịzi anyị ikike ileba anya n’ihe ị gwara anyị banyere onwe gị, anyị ka nwere ike inwe ihe iwu kwadoro mere anyị ga-eji leba ya anya.

Ihe ndị anyị ga-eji ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị mee bụ naanị ihe ndị ahụ anyị gwara gị na anyị ga-eji ha mee mgbe ị na-ezitere anyị ya. Ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ:

Akaụnt. Anyị nwere ike iji adres iimel i nyere anyị mgbe ị na-emepe akaụnt gị kpọtụrụ gị maka akaụnt gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị gwa anyị na i chefuru aha iji abanye n’akaụnt gị ma ọ bụ paswọd gị, anyị ga-ezitere gị ozi n’adres iimel gị gwa gị ihe ị ga-eme.

Idejupụta Fọm. I nwere ike isi na jw.org zitere anyị fọm i dejupụtara, ma ọ bụkwanụ ọgbakọ gị ezitere anyị fọm gbasara gị. Anyị ga-eji ihe ndị ahụ i dejupụtara meere gị naanị ihe ị chọrọ ka e meere gị nakwa n’ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ọ bụrụ na anyị elebawa anya na fọm i zitere, anyị nwekwara ike izigara alaka ụlọ ọrụ anyị ndị ọzọ ihe ndị i dere na fọm ahụ ma ọ bụkwanụ zigara ya ụlọ ọrụ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ná mba dị iche iche.

Onyinye. Ọ bụrụ na i si na jw.org nye onyinye, anyị ga-ewere aha gị na ihe ndị anyị nwere ike iji kpọtụrụ gị. Mmadụ nwekwara ike iji kaadị e ji azụrụ ihe n’aka nye onyinye. Ụlọ ọrụ ndị anyị na-esi n’aka ha enweta onyinye mmadụ ji kaadị ya nye bụ ụlọ ọrụ ndị a maara nke ọma na ha na-ekwu eziokwu nakwa na ha na-echekwa ihe nke ọma ka ndị ọzọ ghara ịhụ ya. Anyị nwere ike ịjụ gị maka ihe ndị dị ka, nọmba kaadị i ji azụrụ ihe n’aka, ma ọ bụ nọmba akaụnt ụlọ akụ̀ gị ka anyị nwee ike ịnara onyinye gị. Anyị ga-ezigaziri ụlọ ọrụ ndị ga-eme ka onyinye gị rute anyị aka ihe ndị dị ha mkpa. Anyị mewe ihe ọ bụla gbasara onyinye gị, anyị agaghị eme ka ndị na-ekwesịghị ịma banyere ya mata banyere ya. Anyị ga-eso ihe e kwuru n’iwu gbasara iji kaadị azụ ihe n’aka nke a na-akpọ Payment Card Industry Data Security Standard (“PCI DSS”). Anyị ga-edebe ihe ndị gbasara onyinye gị ruo afọ iri ma ọ bụ karịa. Ihe ndị ahụ bụ akara ụbọchị i nyere onyinye gị, ego ole i nyere na otú i si nye ya. Anyị ga-eme ya otú a n’ihi na ọ bụ otú e si eme ma a bịa n’ihe gbasara ndekọ ego. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịza gị ajụjụ ọ bụla i nwere ike ịjụ gbasara onyinye gị n’oge ahụ. Anyị agaghị akpọtụrụ gị ka inye anyị onyinye ọzọ.

Ikwu Ka A Mụwara Gị Baịbụl ma Ọ Bụ Ihe Ndị Ọzọ. I nwekwara ike isi na jw.org gwa anyị ka anyị bịa mụwara gị Baịbụl n’efu ma ọ bụkwanụ jụọ anyị ihe ndị ọzọ. Anyị ga-eji ihe ị gwara anyị gbasara onwe gị mee naanị ihe ndị ị gwara anyị jiri ha mee. Anyị nwere ike izigara ụlọ ọrụ anyị ndị ọzọ ihe ndị ahụ ị gwara anyị ma ọ dị mkpa iji mee ihe ị gwara anyị meere gị.

Ihe Ndị Ọzọ. I nwere ike ịgwa anyị ihe ụfọdụ gbasara onwe gị (dị ka aha gị, ebe i bi, na akara ekwentị gị) maka iji ya eme ihe ndị ọzọ na-abụghị naanị iji ya emepe akụnt, izite fọm ma ọ bụ inye onyinye. Anyị ga-agwa gị ihe anyị chọrọ iji ya eme kpọmkwem. Anyị agaghị eji ihe ndị ị gwara anyị mee ihe ndị anyị na-agwaghị gị na anyị ga-eji ha eme mgbe ị na-ede ihe ndị ahụ.

Anyị na-anata ihe ndị gbasara gị, chekwaa ha ma jiri ha mee ihe ndị i kwuru ka e jiri ha mee. Anyị ga-edebe ihe ndị ahụ naanị mgbe anyị ji ha na-eme ihe ndị ahụ i kwuru nakwa mgbe ọ dị mkpa iji ha eme ihe ndị ọzọ iwu kwadoro. Mana, ọ bụrụ na o nwere ihe gbasara onwe gị ị na-achọghị ịgwa anyị, o nwere ike ime ka ị ghara ịbanyeli n’ebe ụfọdụ na jw.org ma ọ bụ mee ka anyị ghara imere gị ihe ị gwara anyị meere gị.

Ọ bụ naanị ndị ga-eleba anya n’ihe ị gwara anyị gbasara onwe gị na ndị na-ahụ maka kọmputa anyị ji arụ ọrụ nwere ike ịhụ ihe ndị i kwuru gbasara onwe gị. Naani ihe ga-eme ka anyị gwa mmadụ ihe i kwuru gbasara onwe gị bụ (1) ma ọ̀ dị mkpa iji ya meere gị ihe i kwuru, ya abụrụkwa na anyị gwara gị gbasara ya; (2) ma ọ bụrụ na o doro anyị anya na ọ dị mkpa iji ya eme ihe iwu kwadoro; (3) ma ọ bụrụ na gọọmenti agwa anyị mee otú ahụ; ma ọ bụkwanụ (4) ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka anyị mee otú ahụ iji gbochie ndị ọzọ igwu gị wayo ma ọ bụ iji aha gị egwu wayo. Ị bata na jw.org, ọ pụtara na i kwetala ka a gwa ndị ọzọ ihe ị gwara anyị gbasara onwe gị ma a chọọ iji ha eme ihe ndị a anyị kwuru. E nweghị ihe ga-eme ka anyị ree ihe ndị ị gwara anyị banyere onwe gị ma ọ bụkwanụ gbazinye ya mmadụ.

IZIGA IHE NDỊ Ị GWARA ANYỊ MBA ỌZỌ

Anyị nwere ụlọ ọrụ dị iche iche anyị ji arụ ọrụ n’ụwa niile. Ụfọdụ kọmputa anyị ndị na-eme ka jw.org na-arụ ọrụ nke ọma dị n’ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka. Anyị nwere ike iziga ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị mba ọzọ. Mba ndị ahụ nwere ike ịbụ mba ndị iwu gbasara ichekwa ihe mmadụ kwuru banyere onwe ya dị iche na nke mba gị. Anyị chọwa izipụ ihe ị gwara anyị gbasara onwe gị, anyị ga-eme ihe ndị anyị kwesịrị ime ka ndị na-ekwesịghị ịma banyere ya ghara ịma. Anyị na-atụ anya na ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ na ụlọ ọrụ niile na-akwado ọrụ anyị ga-eme ihe ndị anyị kwuru gbasara ichekwa ihe ndị mmadụ kwuru gbasara onwe ha ka ndị na-ekwesịghị ịhụ ya ghara ịhụ ya. Anyị na-atụkwa anya na ha ga-eme ihe iwu obodo kwuru gbasara ichekwa ihe mmadụ kwuru gbasara onwe ya ka ndị ọzọ ghara ịhụ ya.

Ị gahaala na jw.org, si na ya zitere anyị ihe gbasara onwe gị, ọ pụtara na i kwetara na anyị nwere ike izigara ụlọ ọrụ anyị dị ná mba ọzọ ihe gbasara gị.

IHE NDỊ I NWERE IKIKE IME

Mgbe ọ bụla anyị na-eleba anya n’ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị, anyị na-akpachara anya ka anyị ghara ịgbanwe ihe ọ bụla na ya. Anyị na-etinyekwa ihe ọhụrụ ọ bụla ị gwara anyị gbasara onwe gị. Anyị ga-eji ya eme naanị ihe anyị kwuru na anyị ga-eji ya eme. Ihe ndị a dị n’okpuru ebe a bụ ihe ndị i nwere ikike ime gbasara ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị. Mana, o nwekwara ike ịdịtụ iche n’iwu obodo ebe i bi:

  • I nwere ike ikwu ka a kọwaara gị ihe a chọrọ iji ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị eme, nke iwu obodo unu kwadoro;

  • I nwere ike ikwu ka e nye gị ikike ịhụ ihe ndị i kwuru gbasara onwe gị dị ka i dezie ha, ma ọ bụ wepụ ha ma ọ bụrụ na o nwere ebe ha si rie mperi;

  • Anyị bido ileba anya n’ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị, i nwere ike ikwu ka anyị kwụsị ileba ha anya ma ọ bụrụ na e nwere ezigbote ihe ị gbakwasịrị ụkwụ na ya kwuo otú ahụ.

Ọ bụrụ na ị chọrọ idezigharị ma ọ bụ wepụ ihe ị gwara anyị gbasara onwe gị, ya abụrụkwa na iwu obodo ị nọ na ya nyere gị ikike ime otú ahụ, i nwere ike ịhụ onye i nwere ike ịkpọtụrụ maka ya n’ebe e dere Ndị Ị Ga-akpọtụrụ Maka Ihe Ị Gwara Anyị Gbasara Onwe Gị.

Anyị nwetahaala ozi i zitere, gị akọwaakwara anyị onye ị bụ nke ọma, kọwaakwara anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata ihe ndị ahụ i kwuru gbasara onwe gị, otu n’ime ndị ọrụ anyị ga-eleba ya anya. Ọ ga-agbalị imere gị ihe ị chọrọ, mana, ọ ga-akpachapụkwa anya ka ọ ghara ime ihe ga-akpatara anyịnwa nsogbu. Dị ka ihe atụ, ọ ga-achọpụta ma imere gị ihe ahụ ọ̀ ga-eme ka a machie Ndịàmà Jehova ịna-arụ ọrụ ha na ịna-efe Chineke ha. Anyị dezigharịa ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị, anyị ga-agwakwa ụlọ ọrụ ndị ọzọ anyị zigaara ihe banyere gị ka ha dezie nke ha.

Biko buru n’uche na o nwere ike anyị agaghị ewepụ ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị ma ọ bụrụ na iwu kwuru ka anyị leba ihe ndị ahụ anya ma ọ bụkwanụ na e nwere ihe ọzọ iwu kwadoro a ga-eji ha eme. Dị ka ihe atụ, ọgbakọ Ndịàmà Jehova anaghị ewepụ ihe ndị na-egosi na mmadụ bụ Onyeàmà Jehova. Iwepụ ihe dị otú ahụ megidere ihe ndị anyị kweere na ihe ndị anyị na-eme. Mmadụ kwuo na ya chọrọ ka e wepụ ihe ndị ọ gwara anyị gbasara onwe ya, anyị ga-eleba anya n’ihe iwu kwuru gbasara ichekwa ihe mmadụ kwuru banyere onwe ya tupu anyị emee otú ahụ. I nwekwara ike ịkọsara ụlọ ọrụ gọọmenti obodo ị nọ na ya na-ahụ maka ihe mmadụ kwuru gbasara onwe ya maka ihe ndị ị gwara anyị gbasara onwe gị na jw.org.