Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị

To provide you with the best possible experience, we use cookies and similar technologies. Some cookies are necessary to make our website work and cannot be refused. You can accept or decline the use of additional cookies, which we use only to improve your experience. None of this data will ever be sold or used for marketing. To learn more, read the Global Policy on Use of Cookies and Similar Technologies. You can customize your settings at any time by going to Privacy Settings.

Anụ ọhịa nke nwere isi asaa na mpi iri, nke aha ya ma ọ bụ nọmba ya bụ akara 666.

Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?

Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?

Ihe Baịbụl kwuru

 Akwụkwọ ikpeazụ na Baịbụl kwuru na akara 666 bụ nọmba ma ọ bụ aha otu anụ ọhịa nwere isi asaa na mpi iri nke si n’oké osimiri pụta. (Mkpughe 13:​1, 17, 18) Anụ ọhịa a nọchịrị anya ọchịchị niile dị n’ụwa, bụ́kwa nke na-achị “ebo niile na ndị niile na asụsụ niile na mba niile.” (Mkpughe 13:7) Akara ahụ bụ 666 gosiri na ọchịchị ụwa a kụrụ afọ n’ala kpamkpam n’anya Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo ya?

  Ọ bụghị akara nkịtị. Aha ndị Chineke n’onwe ya nyere na-enwe ihe ha pụtara. Dị ka ihe atụ, Chineke nyere Ebram, nke pụtara “Nna Bụ Ihe Ukwu,” aha bụ Ebreham, nke pụtara “Nna nke Ìgwè Mmadụ.” Ọ bụ mgbe Chineke kwere Ebreham nkwa na ya ga-eme ka ọ ghọọ “nna nke ìgwè mba dị iche iche” ka o nyere ya aha ọhụrụ a. (Jenesis 17:5) Otú ahụkwa ka Chineke si nye anụ ọhịa ahụ akara bụ́ 666 ka e jiri ya kọwaa ụdị ihe ọ bụ.

  Nọmba bụ́ isii nọchiri anya ihe na-ezughị okè. Ọtụtụ mgbe na Baịbụl a na-eji nọmba anọchi anya ihe. Nọmba bụ́ asaa na-anọchikarị anya ihe zuru okè. Ebe ọ bụ na isii ji otu ghara iru asaa, a na-ejikarị isii akọwa ihe na-ezughị ezu, ma ọ bụ ihe na-ezughị okè n’anya Chineke. A na-ejikwa ya akọwa ndị bụ́ ndị iro Chineke.​—1 Ihe E Mere 20:6; Daniel 3:1.

  E kwuru ya ugboro atọ iji mesie okwu ike. Na Baịbụl a chọọ imesi okwu ike, a na-ekwu ya ugboro atọ. (Mkpughe 4:8; 8:13) N’ihi ya, akara ahụ bụ́ 666 na-eme ka anyị ghọta nnọọ na Chineke na-ele ọchịchị ụwa anya ka ihe kụrụ afọ n’ala kpamkpam. Ha enwebeghị ike ime ka e nwee udo ga-adite aka n’ụwa ma ọ bụ ka obi ruo ndị mmadụ ala. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-emeli ihe ndị a.

Akara nke anụ ọhịa

 Baịbụl kwuru na ndị mmadụ na-enweta “akara nke anụ ọhịa” n’ihi na ha ji “oké mmasị” na-eso anụ ọhịa ahụ ruo nke na ha na-efe ya ofufe. (Mkpughe 13:​3, 4; 16:2) Otú ha si eme nke a bụ ife mba ha, ihe ndị e ji mara mba ha, na ngwá agha mba ha kwakọbara. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion kwuru, sị: “Mmadụ ịhụ obodo ya n’anya aghọọla ụdị okpukperechi nke ya n’ụwa ugbu a.” a

 Olee otú e si aka mmadụ akara anụ ọhịa n’aka nri ma ọ bụ n’egedege ihu? (Mkpughe 13:16) Mgbe Chineke na-enye mba Izrel iwu, ọ sịrị ha: “Keekwa ha n’aka unu dị ka ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa ihe unu ga na-ekegide n’egedege ihu unu.” (Diuterọnọmi 11:18) Ihe ebe a na-ekwu abụghị na ndị Izrel ga-eji ihe kee n’aka ha nakwa n’egedege ihu ha nkịtị, kama ihe ọ pụtara bụ na okwu Chineke ga na-eduzi ma echiche ha ma ihe niile ha na-eme ná ndụ. Otú ahụkwa ka ọ dị akara 666, ọ bụghị akara nkịtị a kanyere n’ahụ́, kama akara anụ ọhịa bụ ihe atụ e ji ama ndị kwere ka ọchịchị ụwa a bụrụ ihe na-eduzi ndụ ha. Ndị nwere akara anụ ọhịa na-eme onwe ha ka ha bụrụ ndị iro Chineke.​—Mkpughe 14:​9, 10; 19:​19-21.

a Gụọkwa Nationalism in a Global Era, peeji nke 134, na Nationalism and the Mind: Essays on Modern Culture, peeji nke 94.