Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Sebia
Oge E Ji Akpọgharị Ndị Ọbịa
Mọnde ruo Fraịdee
8:00 ụtụtụ ruo 11:00 ụtụtụ na 1:00 ehihie ruo 4:00 mgbede
Ọ na-ewe otu awa
Ihe A Na-eme
Alaka ụlọ ọrụ a na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma Ndịàmà Jehova dị 3,850 na Sebia nakwa Ndịàmà Jehova dị 448 na Mọntenigro na-arụ. Ha na-ahazikwa mgbakọ ukwu na mgbakọ sekit n’asụsụ Họngerian, Mọntenigrin, Romani, Sebian, na n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Sebia. Ha na-ahazi ụlọ akwụkwọ dị iche iche maka Ndịàmà Jehova. Na-asụgharị akwụkwọ ndi e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Mọntenigrin, Romenian (Vilak), Romani (Sebia), Sebian (ná mkpụrụ akwụkwọ Sirilik na ná mkpụrụ akwụkwọ Roman), nakwa n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Sebia. Ha na-emepụta vidio na ihe ndị a na-egere egere n’asụsụ ndị ahụ, na-ebipụtakwa akwụkwọ n’asụsụ ndị ìsì nke Sebia.

