Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Hungary
Oge E Ji Akpọgharị Ndị Ọbịa
Mọnde ruo Fraịdee
10:00 ụtụtụ 11:00 ụtụtụ na 3:00 ehihie
Ọ na-ewe otu awa na nkeji iri na ise
Ihe A Na-eme
A na-ahazi ọrụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị 278 na-arụ na Hungary, na-ahazikwa otú ihe si aga n’ọgbakọ anyị na-eji asụsụ Hungarian amụ ihe na Slovakia nakwa na Ukraine. A na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Hungarian nakwa n’asụsụ Lovári. A na-emepụta ihe ndị a na-egere egere n’asụsụ Hungarian, na-emepụtakwa vidio n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Hungary.

