ILEGHARỊ ANYA N’ỤLỌ ỌRỤ ANYỊ

Ilegharị Anya n’Alaka Ụlọ Ọrụ Dị na Hungary

Igbo
Ilegharị Anya n’Alaka Ụlọ Ọrụ Dị na Hungary
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1011232/univ/art/1011232_univ_sqr_xl.jpg

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Hungary

BUDAPEST

Kövirózsa u. 1.

H-1163

HUNGARY

+361 401-1100

Oge E Ji Akpọgharị Ndị Ọbịa

Mọnde ruo Fraịdee

10:00 ụtụtụ 11:00 ụtụtụ na 3:00 ehihie

Ọ na-ewe otu awa na nkeji iri na ise

Ihe A Na-eme

A na-ahazi ọrụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị 278 na-arụ na Hungary, na-ahazikwa otú ihe si aga n’ọgbakọ anyị na-eji asụsụ Hungarian amụ ihe na Slovakia nakwa na Ukraine. A na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Hungarian nakwa n’asụsụ Lovári. A na-emepụta ihe ndị a na-egere egere n’asụsụ Hungarian, na-emepụtakwa vidio n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Hungary.

Danloduo akwụkwọ ga-akọkwuru gị ihe ndị ọzọ.