Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Heiti
Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya
Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị.
Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa ilegharị anya, anyị ka nwere ike ikwe ka i legharịa anya. Ma, ka anyị nwee ike ịhazi ihe nke ọma, anyị na-agba gị ezigbo ume ka ị gwa anyị agwa tupu oge i ji abịa ilegharị’anya eruo.
Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.
Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”
Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”
Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.
Adres Ya
Santo 20, No. 9
Route de Croix-des-Bouquets
PORT-AU-PRINCE
HAITI
+509 2813-1560
+509 2813-1561
+509 2813-1562
Ihe A Na-eme
Ha na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Heshan Kriol. Na-ahazikwa ọrụ ikwusa ozi ọma243 ọgbakọ ndị dị na Heiti na-arụ.

