Igbo
Ilegharị Anya n’Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova Dị na Gana
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1011232/univ/art/1011232_univ_sqr_xl.jpg

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Gana

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị otu awa tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.

Adres Ya

Near Nungua Junction Mall

Hse. No. J 348/4

Tema Beach Road

Nungua

ACCRA

GHANA

Digital Address: G2-064-54-72

+233 30-271-2456

Ihe A Na-eme

Ha na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Ahanta, Dagaare, Dagbani, Dangme, Ewe, Fante, Frafra, Ga, Asụsụ Ndị Ogbi nke Gana, asụsụ Nzema, Sehwi, Twi (Akuapem), na Twi (Asante). Ha na-arụ ihe karịrị otu narị Ụlọ Nzukọ Alaeze kwa afọ. Na-ebugakwa ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ebe dị iche iche na Gana.

Danloduo Akwụkwọ Ga-akọkwuru Gị Ihe Ndị Ọzọ