Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Fiji
Oge E Ji Akpọgharị Ndị Ọbịa
Mọnde ruo Fraịdee
8:00 ụtụtụ ruo 11:00 ụtụtụ na 1:00 ehihie na 4:00 mgbede
Ọ na-ewe otu awa
Ihe A Na-eme
A na-ahazi ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ na Fiji, Kiribati, Nauru, Tuvalu, nakwa na Vanuatu. A na-asụgharịkwa akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Bislama, Fijian, Kiribati, Nauruan, Rotuman, na Tuvaluan.

