Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Jizọs Si Lee Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Anya?

Olee Otú Jizọs Si Lee Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Anya?

Olee Otú Jizọs Si Lee Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Anya?

IHE Matiu, Mak, Luk na Jọn dere gosiri na mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, e nwere mgbe a chọrọ ka Jizọs tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dị ka ihe atụ, obere oge e mechara Jizọs baptizim, ya bụ, mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ, Ekwensu chọrọ ka ọ bụrụ onye na-achị ụwa. Mgbe ọ fọrọ obere ka o jechaa ozi ya n’ụwa, ndị mmadụ chọrọ ime ya eze ha. Ndị mmadụ mechakwara chọọ ka ọ bụrụ onye na-akwado ọchịchị. Gịnị ka Jizọs mere? Ka anyị tụlee ọkwá ndị a chọrọ inye ya ma o tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchichị.

Onye na-achị ụwa. Matiu na Luk kwuru na Ekwensu gwara Jizọs na ya ga-enye ya “alaeze niile nke ụwa.” Chegodị echiche ọtụtụ ihe ọma Jizọs gaara emere ndị mmadụ ahụhụ na-echi ọnụ n’ala ma a sị na o kwetara ịbụ onye na-achị ụwa! È nwere onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ ịkwụsị ahụhụ ndị mmadụ na-ata ga-ajụ ịbụ onye ọchịchị ụwa ma e nye ya ikike ịchị? Ma Jizọs ekweghị ịbụ onye na-achị ụwa.—Matiu 4:8-11.

Eze. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ ndị chọrọ onye ọchịchị ga-akwụsị ahụhụ niile ha na-ata. Mgbe ha hụrụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ, ha chọrọ ka ọ bụrụ eze ha. Jizọs ò kwetara ịbụ eze ha? Jọn kwuru, sị: “Ebe Jizọs maara na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri n’ugwu ahụ naanị ya.” (Jọn 6:10-15) O doro anya na Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Onye na-akwado ọchịchị. Ka anyị hụ ihe merenụ mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka e gbuo Jizọs. Ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na ndị na-eso ụzọ Herọd bịakwutere Jizọs. Ndị na-eso ụzọ ndị Farisii chọrọ ka ndị Juu chịwa onwe ha, ebe ndị na-eso ụzọ Herọd na-akwado ọchịchị ndị Rom. Ha chọrọ ịma ọchịchị nke Jizọs na-akwado. N’ihi ya, ha jụrụ ya ma ndị Juu hà kwesịrị ịna-akwụ ndị Rom ụtụ isi.

Mak dere ihe Jizọs zara ha. O dere, sị: “‘Gịnị mere unu ji na-ele m ule? Wetaranụ m mkpụrụ ego dinarịọs ka m lee.’ Ha wetara otu. O wee sị ha: ‘Ihe a ọ̀ bụ onyinyo onye na aha onye?’ Ha wee sị ya: ‘Ọ bụ nke Siza.’ Jizọs wee sị: ‘Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.’” (Mak 12:13-17) Akwụkwọ bụ́ Church and State—The Story of Two Kingdoms kwuru ihe mere Jizọs ji zaa ihe ahụ ọ zara ha. Akwụkwọ ahụ kwuru na Jizọs achọghị ịbụ onye ọchịchị. Jizọs gosikwara na e nwere iwu ndị ọchịchị anyị kwesịrị idebe nakwa na anyị kwesịrị idebe iwu ndị Chineke nyere.

Ọ bụ eziokwu na Kraịst etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata metụrụ ya n’obi. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mgbe Jizọs hụrụ ahụhụ ndị mmadụ na-ata, o wutere ya nke ukwuu. (Mak 6:33, 34) Ma, Jizọs akwụsịghị ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa, ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ chọrọ ka o tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ihe atụ ndị ahụ anyị tụlere mere ka o doo anya na Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma oleekwanụ maka Ndị Kraịst taa? Hà kwesịrị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?