Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

2 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Ahụghị Anyị n’Anya?

2 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Ahụghị Anyị n’Anya?

2 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Ahụghị Anyị n’Anya?

Ihe ndị mmadụ na-ekwukarị: “Ọ bụrụ eziokwu na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, gịnị mere na ọ kwụsịbeghị ahụhụ niile na nsogbu niile dị n’ụwa? Ya bụrụgodị na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, o nweghị ihe o ji mụnwa kpọrọ.”

Ihe Baịbụl na-akụzi: Ọ bụghị Jehova Chineke na-akpata ihe ọjọọ dị n’ụwa. (Jems 1:13) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike iwepụ ihe ọjọọ niile ma ọ chọhaala ime otú ahụ, ọ hapụgodịrị ka ihe ọjọọ dịrị ka o wee dozie otu nsogbu biliterenụ obere oge e kechara mmadụ. Ọ ga-emecha gbatara ụmụ mmadụ ọsọ enyemaka, doziekwa nsogbu niile ndị jụrụ ọchịchị ya kpatarala n’ụwa.—Jenesis 3:1-6; Aịzaya 65:17. *

Ọ bụghị naanị na Chineke hụrụ mmadụ niile n’anya, kama ọ hụkwara onye ọ bụla n’ime anyị n’anya. Matiu 10:29-31 gosiri na ọ na-ahụ ihe ụfọdụ anyị na-amaghịdị banyere onwe anyị. Ebe ahụ sịrị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ. Ya mere, unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”

Uru ịmata nke bụ́ eziokwu ga-abara gị: Anyị anaghị achọkarị ka e nwee ihe ga-ejikọ anyị na ndị na-anaghị emetara ndị ọzọ ebere ma ọ bụ ndị na-anaghị echebara ndị ọzọ echiche. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na ụgha ahụ bụ́ na Chineke ahụghị anyị n’anya na-eme ka ọtụtụ ndị na-agbara Chineke ọsọ ma ọ bụ na-eme ka ha chewe na naanị mgbe ha ga-arịọ ya arịrịọ bụ mgbe ha na-amaghịzi ihe ọzọ ha ga-eme. Ịmata na Jehova Chineke hụrụ gị n’anya nwere ike ime ka ị chọọ ịmatakwu onye ọ bụ, meekwa ka ị chọọ ka gị na ya bụrụ enyi.

Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na e nweela mgbe i kpegaara Chineke ekpere ma gị ana-eche ma Chineke ọ̀ nụkwara ihe ị gwara ya ma ọ bụ ma ọ̀ ga-azakwa gị ekpere ahụ. Baịbụl kwuru na “Onye na-anụ ekpere” dị njikere mgbe niile ige onye ọ bụla ji obi ya niile na-ekpegara ya ekpere ntị.—Abụ Ọma 65:2.

Chineke na-agwa gị ka ị ‘na-atụkwasị ya nchegbu gị niile, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka, ọ sọkwa ya ya bụrụ n’oge ihe siiri anyị ezigbo ike, n’ihi na Okwu ya sịrị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Ọ bụrụ na Chineke ahụghị anyị n’anya, gịnị mere o ji gwa anyị ka anyị na-ekpegara ya ekpere?