Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”

“Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”

Akwụkwọ Ozi Si Dominican Republic

“Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”

NIURKA mere ihe omume mbụ ya nke si na Baịbụl n’ọgbakọ anyị n’izu a. Otú o si kwadebe ya bụ na o ji mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì depụta ihe ọ ga-ekwu wee buru ya n’isi. Ọ bụ mụ na ya so gaa n’elu ebe ọ nọ kwuo okwu ya, m wee nọrọ dị ka onye chọrọ ka a kụziere ya eziokwu dị na Baịbụl. Ihe ọ kwụnyere ná ntị mere ka ọ na-anụ ihe m ji ígwè okwu na-ekwu. Mgbe anyị mechara, ndị gere anyị ntị gosiri obi ekele ha site n’ịkụsi aka ike nke na ọ nụrụ aka ahụ ha kụrụ. Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị nke gosiri ọṅụ na afọ ojuju o nwere. Obi tọkwara m ụtọ. Ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ na-enye obi ụtọ nke ukwuu!

Echetara m ụbọchị mbụ m hụrụ Niurka. Ọ bụ afọ abụọ gara aga. M nyara ụgbọala n’okporo ụzọ gara ime obodo nke uzuzu juru ruo nkeji iri atọ tupu mụ ahụ ya. Ọ nọ ọdụ na veranda ụlọ ochie nke e ji osisi na blọk rụọ, nke gbamgbam ya tara nchara. Ewu, òké Bekee, na nkịta nọ na-eme ụzụ, meekwa ka ebe ahụ na-esi ísì. Niurka nọ ọdụ n’oche, kpudo ihu n’ala ka onye ike ndụ gwụrụla nke obi dara mbà. Ị gaghị ama na ọ dị naanị afọ iri atọ na anọ.

M metụrụ ya aka n’ubu, ya ewelite isi ya lee anya n’ebe anyị nọ, ọ bụ ezie na ọ naghị ahụ ụzọ kemgbe afọ iri na otu. M tisiri mkpu ike wee gwa ya aha m na aha onye mụ na ya so na-ekwusa ozi ọma. Anyị mechara chọpụta na Niurka na-arịa ọrịa Marfan, bụ́ ọrịa o butere n’aka nne ma ọ bụ nna ya site n’ọmụmụ, nke na-enye ya nsogbu nke ukwuu. Niurka na-arịasikwa ọrịa shuga ike nke na e kwesịrị ilebara ya anya mgbe niile ka ọ ghara ịdị oké njọ.

Mgbe m tinyere Baịbụl n’aka ya, ọ matara ihe ọ bụ wee kwuo na ịgụ Akwụkwọ Nsọ na-atọ ya ụtọ mgbe ọ na-ahụ ụzọ. Ma, oleekwanụ otú m ga-esi kụziere onye a na-anọ naanị ya, nke ọ na-enweghị ka ọ hà ya, nke ahụ́ na-adịghị, eziokwu nke Okwu Chineke nke na-eme ka obi ruo mmadụ ala? Ebe ọ maara A B CH D, m malitere itinye A B CH D e ji plastik rụọ n’aka ya. Ọ dịghị anya, ya matawa ha. M jiri aka m sụọ asụsụ ndị ogbi, ya emetụ m aka n’aka ghọta ihe m kwuru n’asụsụ ogbi nke America. O ji nwayọọ nwayọọ mụta okwu ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na m ka malitere ịmụ asụsụ ndị ogbi ahụ ọhụrụ, ịkwadebe ihe mụ na ya ga-amụ na-ewe m ọtụtụ awa. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na mụ na Niurka chọsiri ike ịmụta asụsụ ndị ogbi, ọ dịghị anya, anyị mewere nke ọma na ya.

Otu ihe nke nyeere Niurka aka ime nke ọma bụ na otu òtù ọrụ ebere nyere ya ihe ga-enyere ya aka ịnụ ihe. Ọ bụ ezie na ọ bụghị nke ọ gbara ọhụrụ, o nyeere ya aka nke ukwuu. Mgbe ọ nọchara ihe karịrị afọ iri n’ahụghị ụzọ, n’anụghịkwa ihe, ọ na-anọrọ onwe ya. Ma, mmụọ Jehova ruru n’obi na n’uche ya, mee ka o nwee ihe ọmụma, olileanya, na ịhụnanya. Ọ dịghị anya, Niurka malitere iji mkpara na-agakwuru ndị agbata obi ya na-agwa ha eziokwu dị na Baịbụl.

Niurka na-akụziri nwanne nne ya na nwa nwanne nne ya na nwunye nwanne nne ya Baịbụl. Ọ na-akwadebe nke ọma, ọ na-ebute ihe ọ ga-akụziri ha n’isi. Ọ bụrụ na onye ọ na-akụziri Baịbụl gụpụta ihe dị na paragraf ha na-amụ, Niurka ejiri akwụkwọ nke ya, nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, jụọ ya ajụjụ. Onye ya na Niurka so na-aga ozi ọma na-echenye Niurka ọnụ ná ntị gwa ya ihe onye ọ na-akụziri Baịbụl zara, ma ọ bụkwanụ jide ya n’aka were asụsụ ndị ogbi gwa ya ihe ọ zara.

Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ anyị na-enyere Niurka aka, na-agbakwa ya ume. Ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst ibe ya na-eburu ya abịa ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche. Ndị ọzọ na-eso ya eje ozi ọma. Niurka gwara m n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe e gosiri m ụdị ịhụnanya a.” Ọ na-atụ anya ka e mee ya baptizim ná mgbakọ distrikti anyị na-abịa abịa.

Ka anyị banyere n’ụzọ gara n’ụlọ Niurka, anyị hụrụ ya ka ọ nọ na veranda ụlọ ya na-anya anwụ. O welitere isi ya elu na-amụmụ ọnụ ọchị. M jụrụ ya ihe mere o ji na-amụmụ ọnụ ọchị. Ọ sịrị: “M nọ na-eche banyere ọdịnihu, mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Ọ dị m nnọọ ka mụ anọrọla na ya anọrọ.”

[Foto dị na peeji nke 25]

Niurka na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị, n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe Niurka na-agwa ndị ọzọ ihe ọ mụtara