ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Ọktoba 2014

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Disemba 1 ruo Disemba 28, 2014.

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Taịwan

Ihe karịrị otu narị Ndịàmà Jehova akwatala n’ebe a a chọkwuru ndị nkwusa. Gụọ ihe ndị ha kọrọ na ihe ndị nyeere ha aka ịna-eje ozi ha.

Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke

Jehova ji ọgbụgba ndụ isii mee ka obi sie anyị ike na Alaeze ya ga-emezu nzube ya. Olee otú ọgbụgba ndụ ndị ahụ ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?

Unu ga-abụ “alaeze nke ndị nchụàjà”

Ọgbụgba ndụ atọ ndị ikpeazụ anyị ga-eleba anya ga-eme ka anyị tụkwasị Alaeze Chineke obi, meekwa ka anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma gbasara ya.

AKỤKỌ NDỤ

Ihe Ndị Dị Mkpa Merenụ n’Ozi M Na-ejere Jehova

Mildred Olson efeela Jehova ihe karịrị afọ iri asaa na ise. O ji ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri abụọ na itoolu jee ozi ala ọzọ n’El Salvadọ. Gịnị mere ka ọ dị gara gara?

Jiri Ọrụ Gị na Jehova Na-arụkọ Kpọrọ Ihe

Gịnị mere ndị na-efe Jehova ji ahapụtụ ịna-achụ ihe ndị na-amasị ha?

“Na-atụkwasịnụ Uche n’Ihe Ndị Dị n’Elu”

Gịnị mere uche ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa kwesịrị iji dịrị n’ihe ndị dị n’elu? Olee otú ha ga-esi eme ya?