Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Gịnị mere na Ndị Kraịst ekwesịghị iji Baịbụl mere ọtụmọkpọ?

Ụfọdụ na-ebu n’obi na ọ bụrụ na ha emeghee Baịbụl ha, amaokwu ọ bụla ha bu ụzọ hụ ga-agwa ha ihe ha kwesịrị ime. Ezi Ndị Kraịst anaghị achọ ihe mgbaàmà maka ọdịnihu. Kama, ha na-amụ Baịbụl iji mụta eziokwu dị na ya, matakwa ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme.—12/15, peeji nke 3.

Olee “ụwa” nke ga-agabiga?

“Ụwa” nke ga-agabiga bụ ụmụ mmadụ na-anaghị erubere Chineke isi. (1 Jọn 2:17) A gaghị ebibi ma ụwa a anyị bi na ya ma ndị ezi omume.—1/1, peeji nke 5-7.

Olee otú Ebel si agwa anyị okwu n’agbanyeghị na ọ nwụrụ anwụ? (Hib. 11:4)

O si n’okwukwe ya agwa anyị okwu. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’okwukwe ya ma na-agbalị inwe ụdị okwukwe o nwere. A ka ji okwukwe ya ama atụ.—1/1, peeji nke 12.

Olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso?

Ụfọdụ n’ime ha bụ: Ọrụ ego, ihe anyị kpebiri iji na-atụrụ ndụ ma ọ bụ iji na-egwuri egwu, otú anyị si emeso onye ezinụlọ anyị a chụrụ n’ọgbakọ, ihe anyị na-eji kọmputa na ihe ndị yiri ya eme, otú anyị kpebiri ka e si gwọọ anyị ọrịa, iche na ọ bụ ego kacha mkpa, na ikwe ka ihe anyị chere ma ọ bụ ọrụ e nyere anyị buwe anyị isi.—1/15, peeji nke 12-21.

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Mozis si dị umeala n’obi?

Kama ikwe ka ọkwá ya buwe ya isi, mee ka o mewe ihe masịrị ya, ọ tụkwasịrị Chineke obi. Anyị ekwesịghị ikwe ka isi buwe anyị n’ihi ọkwá anyị nwere ma ọ bụ n’ihi na ụbụrụ na-aghọ anyị nkọ; kama anyị kwesịrị ịna-atụkwasị Jehova obi. (Ilu 3:5, 6)—2/1, peeji nke 5.

Ebee ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-anọ?

Otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ga-aga eluigwe. Ma, a ga-akpọlite ọtụtụ ndị n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—3/1, peeji nke 6.

Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ndị Izrel bụ “ndị a na-ebighị úgwù n’obi”? (Jere. 9:26)

Ha nupụụrụ Jehova isi. Ha kwesịrị iwepụ ihe mere ha ji kpọchie obi ha, ya bụ, echiche ha, ihe na-agụ ha agụụ, ma ọ bụ ihe ha chọrọ ime, bụ́ ihe ndị mere ka ha leghara iwu Chineke anya. (Jere. 5:23, 24)—3/15, peeji nke 9-10.

Olee otú Jizọs si bụrụ onye anyị ga-eṅomi n’ihe gbasara ibi ndụ bara uru?

O mere uche Chineke. Ọ hụrụ nna ya n’anya, hụkwa ndị mmadụ n’anya. Jizọs makwa na nna ya hụrụ ya n’anya nakwa na ya na-eme ihe masịrị Nna ya. Ọ bụ ihe ndị a na-eme ka ndụ mmadụ baa uru.—4/1, peeji nke 4-5.

Olee ndị so ná ndị ohu Chineke n’ụwa?

Òtù Na-achị Isi, kọmitii alaka, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye ọgbakọ, na ndị nkwusa.—4/15, peeji nke 29.

Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na obi ataghị Chineke mmiri n’agbanyeghị na o bibiri ndị ajọ omume?

Ọnwụ onye ajọ omume adịghị atọ Jehova ụtọ. (Ezik. 33:11) Ihe ndị o mere n’oge gara aga gosiri na ọ na-ebu ụzọ adọ ndị ajọ omume aka ná ntị tupu ya ebibie ha. Ọ na-eme ka anyị nwee olileanya na Chineke agaghị ebibi anyị mgbe ọ ga-ebibi ndị ajọ omume n’ọdịnihu.—5/1, peeji nke 5-6.

Ndị Izrel oge ochie hà na-akwụgbu ndị omekome n’osisi?

Mba. N’oge ochie, mba ndị ọzọ si otú ahụ egbu ndị omekome, ma ndị Izrel anaghị eme otú ahụ. N’oge a na-ede Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-ebu ụzọ eji nkume tụgbuo onye mere ihe ọjọọ. (Lev. 20:2, 27) E nweziri ike ịkwụwa ozu onye ahụ n’osisi iji dọọ ndị ọzọ aka ná ntị.—5/15, peeji nke 13.

Gịnị mere na ụmụ mmadụ enweghị ike ime ka udo dị n’ụwa?

N’agbanyeghị na ụmụ mmadụ emepụtala ọtụtụ ihe magburu onwe ha, Chineke ekeghị ha ka ha na-achị onwe ha. (Jere. 10:23) Ọ bụ Setan na-achị ụwa. N’ihi ya, ụmụ mmadụ enweghị ike ime ka udo dị. (1 Jọn 5:19)—6/1, peeji nke 16.