Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Agba Ochie” Ọ̀ Ka Bara Uru?

“Agba Ochie” Ọ̀ Ka Bara Uru?

“Agba Ochie” Ọ̀ Ka Bara Uru?

NA 1786, otu onye French bụ́ dọkịta bipụtara otu akwụkwọ bụ́ Traité d’anatomie et de physiologie (Ahụ́ Mmadụ na Otú O Si Arụ Ọrụ). E lere akwụkwọ ahụ anya dị ka akwụkwọ kasị mma e nwere n’oge ahụ nke na-akụzi otú akwara dị n’ahụ́ si arụ ọrụ. N’oge na-adịbeghịkwa anya, e rere otu n’ime akwụkwọ a dị nnọọ ezigbo ụkọ n’ahịa ugbu a ihe karịrị puku dọla iri abụọ na asaa! Ma, ọ bụ ndị ọrịa ole na ole taa ga-ekwe ka dọkịta ka ji akwụkwọ mgbe ochie dị otú ahụ eme ihe gwọọ ha. Na akwụkwọ ahụ bara uru dị ukwuu n’oge gara aga ma bụrụ nke e ji kpọrọ oké ihe agaghị eme ka ọ baara onye ọrịa uru taa.

Ọtụtụ ndị si otú a ele akụkụ Bible a na-akpọ Agba Ochie anya. Ọ na-atọ ha ụtọ ịgụ akụkọ ndị a kọrọ na ya banyere mba Izrel na ọmarịcha uri ndị e dekọrọ n’ime ya. Ma ha ekwetaghị na ọ bara uru ịgbaso ntụziaka e nyere kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ na narị afọ anọ gara aga. Nkà mmụta sayensị, otú e si azụ ahịa, na ọbụna otú ezinụlọ si ebi ndụ taa dị nnọọ iche n’otú ha dị mgbe e dere Bible. Philip Yancey, onye bụbu onye nchịkọta akụkọ nke akwụkwọ akụkọ bụ́ Christianity Today, dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Bible Jesus Read, sị: “Ihe ndị dị [n’Agba Ochie] adịchaghị ekwe nghọta, ndị nke na-ekwetụ nghọta n’ime ya na-agbakasị ndị oge a ahụ́. N’ihi nke a na n’ihi ihe ndị ọzọ, ndị mmadụ adịghị agụ Agba Ochie, nke bụ́ ụzọ atọ nke Bible ma ọ bụrụ na e kee Bible ụzọ anọ.” Ọ bụghị Yancey bụ onye mbụ chere otú a.

Ihe na-erughị afọ iri ise ka Jọn onyeozi nwụsịrị, n’ihe dị ka n’afọ 100 O.A., otu ọgaranya aha ya bụ́ Marcion kwuru n’ihu ọha na Ndị Kraịst ekwesịghị ịgụ Agba Ochie. Dị ka onye England na-ede akụkọ banyere ihe ndị mere eme bụ́ Robin Lane Fox si kwuo, Marcion kwuru na “‘Chineke’ nke Agba Ochie bụ ‘onye obi fere azụ’ nke nyeere ndị agamevu na ndị na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ, dị ka Eze Devid nke Izrel, aka. Ma Kraịst bịara kọọrọ anyị banyere Chineke ọhụrụ ka Chineke nke Agba Ochie mma ma dịrị nnọọ iche.” Fox dere na ihe ndị a Marcion kwuru mesịrị “ghọọ ihe a na-akpọ ‘Marcionism,’ ruokwa mgbe narị afọ nke anọ gwụwara, a nọgidere na-enwe ọtụtụ ndị kwenyere na ya, karịsịa n’etiti ndị na-asụ asụsụ Syria n’ebe Ọwụwa Anyanwụ ụwa.” Ọtụtụ ndị ka kweere n’echiche a. N’ihi ya, ihe karịrị otu puku na narị afọ isii ka e mesịrị, Philip Yancey dere, sị: “Ọnụ ọgụgụ nke Ndị Kraịst na-ejighịzi ihe e dere n’Agba Ochie kpọrọ ihe ji ike na-amụba taa, ọ fọkwara obere ka a ghara ịdị na-ekwutezi okwu ya n’ọtụtụ ebe n’oge a.”

Ọ̀ bụ eziokwu na e jizi Agba Ọhụrụ dochie Agba Ochie? Olee otú ọ ga-esi kwe omume na “Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha” e kwuru okwu ya n’Agba Ochie bụ ya bụ “Chineke nke ịhụnanya na nke udo” e kwuru okwu ya n’Agba Ọhụrụ? (Aịsaịa 13:13; 2 Ndị Kọrint 13:11) Agba Ochie ọ̀ pụrụ ịbara gị uru taa?