Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmeri E Nwere n’Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe

Mmeri E Nwere n’Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe

Mmeri E Nwere n’Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe

NA JANUARY 11, 2007, Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe nke dị na Strasbourg, France, ji otu olu kpelaara Ndịàmà Jehova nọ na Russia ikpe, n’akwụkwọ ha gbara gọọmenti etiti Russia. Ụlọikpe ahụ kpebiri na Ndịàmà Jehova nweere onwe ha ikpe okpukpe ha, na e kwesịkwara inye ha ohere ịzara ọnụ ha. Ka anyị tụlee ihe dugara n’ikpe ahụ.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’obodo Chelyabinsk, Russia, bụ ndị ogbi. Ebe ha na-amụ ihe bụ ebe ha naara otu ụlọ akwụkwọ kọleji na-akụzi ọrụ aka ná ngo. Na Sunday, April 16, 2000, onyeisi, ma ọ bụ Kọmishọna, nke Òtù Na-ahụ Banyere Ihe Ndị Ruuru Ndị Mmadụ n’ógbè ahụ na ndị uwe ojii abụọ nọ n’ọkwá dị elu na otu onye uwe ojii yi uwe nkịtị tisasịrị ọmụmụ ihe ha. N’ihi ihe ọjọọ Kọmishọna ahụ karịsịa buuru Ndịàmà ahụ n’obi, ha tisara nnọkọ ahụ n’ihi ebubo na-enweghị isi bụ́ na iwu akwadoghị nzukọ ha. Na May 1, 2000, a chụpụziri Ndịàmà ahụ n’ebe ahụ ha na-anọ amụ ihe.

Ndịàmà Jehova kpesaara ọkàiwu nke obodo Chelyabinsk ihe ahụ merenụ, ma ọ dịghị ihe si na ya pụta. Iwu Mba Russia na Nkwekọrịta E Mere Maka Nchebe nke Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Nnwere Onwe Ndị Bụ́ Isi kwadoro nnwere onwe okpukpe na nnwere onwe iso ndị ọzọ anọkọ. N’ihi ya, Ndịàmà ahụ gbara Kọmishọna ahụ na ndị uwe ojii abụọ ahụ akwụkwọ n’ụlọikpe obodo ahụ ma mesịa wega okwu ahụ n’ụlọikpe mkpegharị ikpe dị n’ógbè ahụ. Tupu mgbe ahụ, na July 30, 1999, ụlọikpe kasị elu kpebiri n’ikpe ọzọ na “dị ka Iwu Mba Russia na-akwado nnwere onwe akọnuche na òtù okpukpe dị iche iche si kwuo, okwu ahụ bụ́ ‘n’enweghị ihe mgbochi’ pụtara na ndị mmadụ nweere onwe ha ime ememe okpukpe ha n’ebe ha na-anọ [eme ya] n’ebughị ụzọ nata ikike n’aka ndị ọchịchị.” (Ọ bụ ha tinyere akara ngebichi ahụ.) N’agbanyeghị mkpebi ikpe a, ụlọikpe obodo na ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ kagburu akwụkwọ ahụ Ndịàmà gbara.

Na December 17, 2001, e wegara ikpe ahụ n’Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe. E kpere ikpe ahụ na September 9, 2004. Ihe ndị na-esonụ bụ akụkụ ụfọdụ nke mkpebi ikpeazụ nke Ụlọikpe ahụ:

“Ụlọikpe a chọpụtara na a napụrụ ndị a mere mkpesa ikike ruuru ha ikpe okpukpe ha n’ihi na n’April 16, 2000, ndị ọrụ gọọmenti mere ka nzukọ okpukpe ha mechie mgbe oge ya na-erubeghị.”

“Ọ dịtụghị iwu kwadoro ntisa ahụ e tisara nzukọ okpukpe ahụ e nwere n’ebe ahụ ha naara ná ngo n’ụzọ iwu kwadoro maka nzukọ ahụ.”

“[Ụlọikpe a] chọpụtara na e nwere ọtụtụ ikpe ndị Ụlọikpe Kasị Elu nke Russia kperela gosiri na okpukpe ekwesịghị ịnata ikike n’aka ndị ọchịchị ma ọ bụ buru ụzọ gwa ha tupu ha enwee nzukọ okpukpe ha.”

“N’ihi ya, ntisa ahụ Kọmishọna na ndị òtù ya tisara nzukọ okpukpe nke Ndịàmà ahụ n’April 16, 2000, megidere Akụkụ nke 9 [banyere nnwere onwe ikpe okpukpe] nke Nkwekọrịta E Mere Maka Nchebe nke Ihe Ndị Ruuru Mmadụ.”

“Ụlọikpe a chọpụtakwara na ụlọikpe ógbè abụọ ahụ arụghị ọrụ dịịrị ha . . . igosi na ha nyere ndị nile ikpe a metụtara ohere ha nhata ịzara ọnụ ha. . . . Ha mere ihe megidere Akụkụ nke 6 [banyere ohere mmadụ nwere ịzara ọnụ ya] nke Nkwekọrịta ahụ.”

Ndịàmà Jehova na-ekele Chineke maka ime ka ha nwee mmeri n’Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe. (Abụ Ọma 98:1) Olee ndị mkpebi nke Ụlọikpe ahụ ga-emetụta? Joseph K. Grieboski, bụ́ onyeisi oche nke Òtù Na-ahụ Maka Okpukpe na Iwu Ndị Na-achịkwa obodo, kwuru, sị: “Mkpebi a bụ mkpebi ọzọ gbara nnọọ ọkpụrụkpụ nke ga-emetụta nnwere onwe ikpe okpukpe na Europe nile, n’ihi na mkpebi ikpe ahụ ga-emetụta nnwere onwe ikpe okpukpe ná mba nile nọ n’okpuru Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe.”