Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa Ihe Banyere Unu Na-emetụ Ndị Mụrụ Unu n’Obi

Ndị Ntorobịa Ihe Banyere Unu Na-emetụ Ndị Mụrụ Unu n’Obi

Ndị Ntorobịa Ihe Banyere Unu Na-emetụ Ndị Mụrụ Unu n’Obi

JỌN onyeozi merela agadi dere, sị: “Ọ dịghị ihe ga-akpatara m inwe obi ekele nke karịrị ihe ndị a, na m ga na-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Ọ bụ ezie na ụmụ e kwuru okwu ha n’ebe a bụ Ndị Kraịst, nne ma ọ bụ nna na-atụ egwu Chineke pụrụ ịghọta nnọọ ihe a Jọn kwuru. Dị nnọọ ka ndị nne na nna si eme ka ụmụ ha na-enwe nnọọ obi ụtọ ná ndụ, otú ahụkwa ka ụmụ si eme ka ndị mụrụ ha na-enwe obi ụtọ.

Sọlọmọn bụ́ Eze Izrel maara nnọọ ókè àgwà ụmụaka na-emetụtaru ndị mụrụ ha. O dere, sị: “Nwa nke maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa: ma nwa dị nzuzu bụ iru újú nne ya.” (Ilu 10:1) N’ihi ya o kwesịrị nnọọ ekwesị ka ụmụ, ma ndị nke ka dị obere ma ndị nke toworo eto, tụlee otú ihe ndị ha na-eme ga-esi emetụta nne na nna ha. Gịnị mere ha kwesịrị iji mee nke a?

Chetụkwala ihe nile ndị mụrụ gị na-atụ egwu Chineke mere iji zụlite gị! Ha malitere iche echiche na ikpe ekpere banyere gị ogologo oge tupu amụọ gị. Oge a mụsịrị gị, gị na ndị mụrụ gị bịara nwee nnọọ mmekọrịta chiri anya, o yikwara ka ha kelere Chineke maka ihe ùgwù na ọrụ a siri ike e nyere ha nke bụ́ ịbụ nne na nna. Ha nwere ọrụ nke ilekọta nwa ọhụrụ na-enweghị ike imeli ihe ọ bụla, ha jikwa ọrụ a kpọrọ ihe n’ihi na ha bụ ndị na-efe Jehova.

Ebe ọ bụ na ndị mụrụ gị bụ ezi Ndị Kraịst, ha gụrụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible iji nweta nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi n’otú ha ga-esi zụọ gị, ha gakwukwara ndị zụrụla ụmụ iji nweta ndụmọdụ otú ha ga-esi zụọ gị. Ha nọgidekwara jiri ekpere na-akọrọ Chineke ihe ndị na-echu ha ụra banyere gị. (Ndị Ikpe 13:8) Ka ị na-etolite, ndị mụrụ gị maara ebe ndị ị na-eme nke ọma na ebe ndị ị na-adịghị emecha nke ọma. (Job 1:5) Mgbe i ruru afọ iri na ụma, ihe ịma aka ndị ọzọ bilitere. Ọ pụrụ ịbụ na e nwere oge ndị i meere ha isi ike, nke mekwara ka ha kpesikwuo ekpere ike, gụsikwuo akwụkwọ ike, ma chesikwuo echiche ike banyere otú ha ga-esi nyere gị aka ịnọgide na-ejere Nna gị nke eluigwe, bụ́ Jehova ozi.

Ọ dịbeghị mgbe ha kwụsịrị ilekọta gị otú nne na nna kwesịrị isi elekọta ụmụ ha. Ọbụna mgbe i toro, ha ka nọgidere na-ahụ na i nwere ezi ahụ́ ike, na obi ruru gị ala, nakwa na gị na Chineke dị ná mma. Otú ọ dị, n’oge ahụ nile, ndị mụrụ gị maara na ọ bụ gị ga-ekpebiri onwe gị ihe ị ga-eme, marakwa na ọ dịghị onye ma kpọmkwem ụdị onye ị ga-emecha ghọọ ná ndụ. Ha maara na mee elu mee ala, ọ bụ gị ga-ekpebiri onwe gị otú ị chọrọ isi bie ndụ.

Ebe ọ dị otú a, ì cheghị na ọ bụrụ na ‘ndị nne na nna ga-enwe obi ekele’ ma ha nụ na ụmụ ha “nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ,” ọ ga-ewutekwa ha ma ha nụ na ụmụ ha akwụsịla ije ije n’eziokwu ahụ? N’ezie, ụmụaka kwụsịrị ije ije n’eziokwu ahụ na-eme ka ndị mụrụ ha na-enwe mwute. Sọlọmọn kwuru, sị: “Ihe na-akpasu nna ya iwe ka nwa nzuzu bụ, ọ bụkwaara nwanyị mụrụ ya ihe ilu.” (Ilu 17:25) Ndị nne na nna na-enwe nnọọ mwute ma nwa ha kwụsị ife ezi Chineke ahụ.

O doro nnọọ anya na otú ị họọrọ isi bie ndụ pụrụ ime ka ndị ezinụlọ gị na ndị ọzọ nwee obi ụtọ ma ọ bụkwanụ mee ka ha nwee mwute. Àgwà gị na-enwe mmetụta n’ahụ́ ndị mụrụ gị. Ọ ga-ewute ndị mụrụ gị ma ọ bụrụ na ị jụ Chineke na ụkpụrụ ya. Ma, ọ bụrụ na ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ma nọgide na-erubere Jehova isi, ndị mụrụ gị ga-aṅụrị ọṅụ. Kpebisie ike ime ka obi ndị mụrụ gị ṅụrịa! È nwere onyinye ọzọ dị oké ọnụ ahịa ị pụrụ inye ndị zụlitere gị, chebe gị ma hụ gị n’anya nke ga-akarị ime ka obi ha ṅụrịa?