Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ozi Ndị Ha Bụ

Ndị Mmụọ Ozi Ndị Ha Bụ

Ndị Mmụọ Ozi Ndị Ha Bụ

EZE nke otu alaeze ukwu ekwetaghị ihe anya ya hụrụ. Ọ hụrụ nnapụta a napụtara mmadụ atọ a tụbara n’oké ọkụ! Ònye napụtara ha? Eze ahụ n’onwe ya gwara mmadụ atọ ahụ e si otú ahụ napụta, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Chineke [unu] bụ, Onye ziteworo mmụọ ozi Ya, wee napụta ndị ohu Ya ndị tụkwasịrị Ya obi.” (Daniel 3:28) Eze a chịrị Babilọn ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga ji anya ya hụ ebe mmụọ ozi napụtara ndị mmadụ. Ọtụtụ nde mmadụ n’oge gara aga kweere ná ndị mmụọ ozi. Ọtụtụ ndị taa abụghị nanị na ha kweere na ndị mmụọ ozi dị adị, kamakwa, ha na-eche na ọ dị ụzọ ndị mmụọ ozi si emetụta ndụ ha. Olee ndị ndị mmụọ ozi bụ, oleekwa otú ha si malite?

Dị ka Bible si kwuo, ndị mmụọ ozi bụ mmụọ otú ahụ Chineke n’onwe ya bụ. (Abụ Ọma 104:4; Jọn 4:24) Ezinụlọ ndị mmụọ ozi buru ibu, ha dị ọtụtụ nde n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 5:11) Ha nile bụ “ndị dike dị ike.” (Abụ Ọma 103:20) Ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi yiri ụmụ mmadụ n’ihi na ha nwere àgwà otú ụmụ mmadụ nwere, e nyekwara ha ikike ime nhọrọ otú e si nye ụmụ mmadụ, ma ha ebughị ụzọ bụtụ mmadụ tupu ha aghọọ ndị mmụọ ozi. N’ezie, Chineke kere ndị mmụọ ozi ogologo oge tupu ya ekee ụmụ mmadụ—ọbụna tupu ya ekee mbara Ụwa. Bible na-ekwu na mgbe Chineke “tọrọ ntọala ụwa . . . kpakpando ụtụtụ [ndị mmụọ ozi] na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:4, 7) Ebe ọ bụ Chineke kere ndị mmụọ ozi, a kpọrọ ha ụmụ Chineke.

Gịnị mere Chineke ji kee ndị mmụọ ozi? Ọ̀ dị ọrụ ndị mmụọ ozi rụtụụrụla ụmụ mmadụ, ya bụrụ na ọ dị, gịnị ka ọ bụ? Hà na-emetụta ndụ anyị taa? Ebe ọ bụ na ha nwere ikike ime nhọrọ, è nwere ndị mmụọ ozi gbasorola ụzọ Setan bụ́ Ekwensu ma mee onwe ha ndị iro Chineke? Bible nyere azịza ziri ezi nye ajụjụ ndị a.