Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’Oké Osimiri Galili

N’Oké Osimiri Galili

N’Oké Osimiri Galili

OTU ihe ndekọ dị na Mak 4:35-41 na-akọ na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ mmiri iji gafee Oké Osimiri Galili. Anyị na-agụ, sị: “Ajọ oké ifufe tiwapụkwara, ebili mmiri nọgidekwara na-etikwasị ụgbọ ahụ ma na-aba n’ime ya, nke mere na ụgbọ ahụ fọrọ nke nta ka o kpuo. Ma ọ [Jizọs] nọ n’azụ ụgbọ ahụ, jiri ohiri isi na-ehi ụra.”

Ọ bụ nanị n’ebe a ka okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ohiri isi” pụtara na Bible. Ya mere, ndị ọkà mmụta amaghị kpọmkwem ihe okwu ahụ e jiri mee ihe ebe a pụtara. Ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị Bible na-asụgharị okwu ahụ ịbụ “ohiri isi” ma ọ bụ “fom.” Ma, olee otú ọ dị? N’asụsụ mbụ e ji dee ya, Mak zoro aka n’ohiri isi ahụ n’ụzọ na-enye echiche na ọ bụ otu akụkụ nke ụgbọ ahụ. Otu ụgbọ a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Galili n’afọ 1986 emeela ka ihe okwu Grik ahụ Mak ji mee ihe pụrụ ịpụta dokwuo anya.

Nnyocha e mere gosiri na e ji ákwà ifufe na ụmara kwọọ ụgbọ mmiri ahụ dị mita asatọ n’ogologo. E ji ya gbuo azụ, o nwekwara oghere dị n’azụ ya bụ́ ebe a na-edebe nnukwu ụgbụ azụ na-anyị arọ. E ji ụgbọ ahụ mee ihe n’agbata afọ 100 T.O.A. na 70 O.A., ọ pụkwara ịbụ ụdị ụgbọ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji mee njem. Shelley Wachsmann, bụ́ onye so bupụta ụgbọ ahụ, dere akwụkwọ bụ́ The Sea of Galilee Boat—An Extraordinary 2000 Year Old Discovery. Ọ na-atụ aro na “ohiri isi” Jizọs dinara na ya bụ akpa ájá e ji eme ka ụgbọ dị arọ. Otu onye Jaffa bụ́ aka ochie n’iji nnukwu ụgbụ akụ azụ kwuru, sị: “Mgbe m dị obere, ụgbọ m ji gbuo azụ na Mediterenian na-ebukarị otu akpa ájá ma ọ bụ abụọ. . . . A na-adọwa akpa ndị ahụ n’ime ụgbọ iji mee ka ụgbọ ahụ dị arọ. Ma mgbe anyị na-ejighị ha na-arụ ọrụ, anyị na-ebuba ha n’oghere dị n’azụ ụgbọ ahụ. E nwee onye ike gwụrụ, ya egbeba n’oghere ahụ dị n’azụ ụgbọ ahụ gaa hie ụra, jiri akpa ájá ahụ mere ohiri isi.”

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na nkọwa Mak nyere pụtara na Jizọs dinara ala n’akpa ájá e ji eme ka ụgbọ dị arọ nke dị n’oghere dị n’azụ ụgbọ ahụ, nke bụ́ akụkụ kasị adị nchebe nke ụgbọ ahụ n’oge oké ifufe. Otú ọ bụla ọ sọrọ ohiri isi ahụ ya dịrị, ihe kasị mkpa bụ ihe merenụ ka e mesịrị. Site ná nkwado na ikike Chineke, Jizọs mere ka oké osimiri ahụ oké ifufe na-ebugharị dajụọ. Ọbụna ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, sị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọbụna ifufe na oké osimiri na-erubere ya isi?”