Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 29

“Gaanụ Mee . . . Ndị Na-eso Ụzọ”

“Gaanụ Mee . . . Ndị Na-eso Ụzọ”

“Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—MAT. 28:19.

ABỤ NKE 60 Ọ Ga-eme Ka Ha Nweta Ndụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Dị ka Jizọs kwuru na Matiu 28:18-20, gịnị bụ ọrụ bụ́ isi ọgbakọ Ndị Kraịst na-arụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

Ọ GA-ABỤ na ndịozi Jizọs ji ezigbo obi ụtọ zukọọ n’akụkụ otu ugwu dị na Galili. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ gwara ndịozi ya ka ha zukọọ ebe ahụ. (Mat. 28:16) Ọ ga-abụ n’oge ahụ ka “ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe.” (1 Kọr. 15:6) Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha zukọọ ebe a? Ọ bụ ka o nye ha ọrụ ga-eme ha obi ụtọ. Ọ sịrị ha: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Gụọ Matiu 28:18-20.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ mgbe Jizọs kwuru ihe a mechara soro n’ọgbakọ Ndị Kraịst e nwere n’oge ahụ. Ọrụ bụ́ isi ha na-arụ n’oge ahụ bụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. * Taa, e nwere ọtụtụ ọgbakọ ndị Kraịst n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ọrụ bụ́ isi ha na-arụkwa taa bụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ajụjụ anọ ndị a: Gịnị mere ime ndị na-eso ụzọ ji dị ezigbo mkpa? Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji mee ndị na-eso ụzọ? Ndị Kraịst niile hà so na-eme ndị na-eso ụzọ? Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ndidi n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ?

GỊNỊ MERE IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ JI DỊ EZIGBO MKPA?

3. Dị ka e kwuru na Jọn 14:6; na 17:3, gịnị mere ime ndị na-eso ụzọ ji dị ezigbo mkpa?

3 Gịnị mere ime ndị na-eso ụzọ ji dị ezigbo mkpa? N’ihi na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-abụli enyi Chineke. Ihe ọzọkwa bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ebi ndụ ka mma ugbu a, nweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (Gụọ Jọn 14:6; 17:3.) O doro anya na ọrụ a Jizọs nyere anyị dị ezigbo mkpa, ma anyị agaghị arụli ya n’ike anyị. Pọl onyeozi kwuru banyere ya na ndịozi ibe ya, sị: “Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Obi dị anyị ụtọ na Jehova na Jizọs kwere ka anyị na ha na-arụkọ ọrụ.

4. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Ivan na Matilde?

4 Ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na-eme anyị obi ụtọ. Chegodị banyere otu nwoke aha ya bụ Ivan na nwunye ya Matilde, ndị bi na Kolombia. Ha ziri otu nwa okorobịa aha ya bụ Davier ozi ọma, ya agwa ha, sị: “M chọrọ ịgbanwe, ma o kwebeghị m.” Davier na-akụ ọkpọ, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-aṅụbiga mmanya ókè, ya na enyi ya nwaanyị aha ya bụ Erika bikwa. Ivan kwuru, sị: “Anyị na ya malitere ịmụ Baịbụl. Ebe o bi dị ezigbo anya. Anyị na-agba ígwè ọtụtụ awa n’ụzọ dị apịtị apịtị tupu anyị erute n’ụlọ ya. Mgbe Erika chọpụtara na Davier agbanwewala, ọ malitere iso ya na-amụ Baịbụl.” Ka oge na-aga, Davier kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịnụ oké mmanya na ịkụ ọkpọ. O mechakwara lụọ Erika. Matilde kwuru, sị: “Mgbe e mere Davier na Erika baptizim n’afọ 2016, anyị chetara na Davier na-ekwukarị, sị, ‘M chọrọ ịgbanwe, ma o kwebeghị m.’ Obi ụtọ mere ka anya mmiri gbawa anyị.” O doro anya na obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị nyere mmadụ aka ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst.

OLEE IHE NDỊ ANYỊ NWERE IKE IME IJI MEE NDỊ NA-ESO ỤZỌ?

5. Olee ihe mbụ anyị ga-eme ma anyị chọọ ime ndị na-eso ụzọ?

5 Ihe mbụ anyị ga-eme ma anyị chọọ ime ndị na-eso ụzọ bụ ‘ịchọpụta’ ndị chọrọ ịmụta banyere Jehova. (Mat. 10:11) Ọ bụrụ na anyị ana-ekwusara mmadụ niile anyị hụrụ ozi ọma, anyị na-egosi na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụkwa na anyị ana-ekwusa ozi ọma Jizọs nyere anyị iwu ka anyị kwusaa, anyị na-egosi na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst.

6. Gịnị ka anyị ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike ige anyị ntị n’ozi ọma?

6 Ụfọdụ ndị chọsiri ike ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ma, o nwere ike ịdị anyị ka ọtụtụ ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma enweghị mmasị ná mmalite. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee ka ha nwee mmasị ige anyị ntị. Ka anyị nwee ike ime nke ọma n’ozi ọma, anyị ga-akwadebe nke ọma. Họrọ isiokwu ndị ga-amasị ndị ị ga-ahụ, chezie otú ị ga-esi malite ịgwa mmadụ banyere ya.

7. Olee otú i nwere ike isi malite izi mmadụ ozi ọma, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ige ndị anyị na-ezi ozi ọma ntị ma kwanyere ha ùgwù?

7 Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ mmadụ, sị: “O nwere otu ihe m chọrọ ịma ihe i chere banyere ya. Ọtụtụ ihe ndị na-enye anyị nsogbu taa na-enyekwa ọtụtụ ndị nsogbu n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ì chere na e nwere ọchịchị ga-akwụsị nsogbu ndị a n’ụwa niile?” Gị na ya kwurịta ihe dị na Daniel 2:44. I nwekwara ike ịgwa mmadụ, sị: “Olee otú i chere e nwere ike isi zụọ ụmụaka ka ha na-akpa àgwà ọma?” Gụziere ya Diuterọnọmi 6:6, 7Chee banyere ndị ị ga-ezi ozi ọma tupu gị ahọrọ isiokwu ị ga-eji ezi ha ozi ọma. Chee banyere otú ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi ga-esi enyere ha aka. Mgbe gị na ha na-ekwurịta okwu, i kwesịrị ige ha ntị nke ọma, kwanyekwara ha ùgwù ma ha na-ekwu ihe ha chere. Ọ ga-eme ka ị ghọta ha nke ọma, ha egeekwa gị ntị.

8. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-agachi na nke onye nwere mmasị anya?

8 Tupu mmadụ ekpebie ịmụ Baịbụl, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị wepụta oge ma gbaa mbọ gaara ya nletaghachi. N’ihi gịnị? N’ihi na onye ahụ nwere ike ghara ịnọ n’ụlọ mgbe anyị gaghachiri. O nwekwara ike ịbụ na ị ga-aga ọtụtụ ugboro tupu ahụ́ eruo ya ala ikwe ka gị na ya mụwa Baịbụl. Cheta na ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka ihe ọ kụrụ mee nke ọma, ọ ga na-agba ya mmiri mgbe niile. Otú ahụkwa ka ọ dị onye nwere mmasị. Ọ bụrụ na anyị ana-agachi na nke ya anya, na-amụrụ ya Baịbụl, o nwere ike ime ka ọ hụkwuo Jehova na Jizọs n’anya.

NDỊ KRAỊST NIILE HÀ SO NA-EME NDỊ NA-ESO ỤZỌ?

Ndịàmà Jehova n’ụwa niile so na-achọ ndị chọrọ ịmụta eziokwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10) *

9-10. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na onye nkwusa ọ bụla so na-achọta ndị chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ?

9 Onye Kraịst ọ bụla so na-achọta ndị chọrọ ịmụta gbasara Chineke. Anyị nwere ike iji ọrụ a tụnyere ịchọ nwata furu efu. Olee otú ha abụọ si yie? Chegodị ihe mere otu nwata nwoke dị afọ atọ kpafuru akpafu. Ihe dị ka narị mmadụ ise gara na-achọ ya. N’ikpeazụ, otu nwoke chọtara ya n’ugbo ọka mgbe ihe dị ka iri awa abụọ gachara ọ kpafuru. Onye ahụ chọtara ya ekweghị ka e too ya maka ịchọta ya. Ọ sịrị: “Ihe mere e ji chọta ya bụ na anyị niile rụkọrọ ọrụ ọnụ.”

10 Ọtụtụ ndị dị ka nwata ahụ furu efu. Ha enweghị olileanya, e kwesịkwara inyere ha aka. (Efe. 2:12) Anyị niile dị ihe karịrị nde asatọ so na-achọ ndị dị otú ahụ. O nwere ike e nweghị onye ị chọtara gị na ya na-amụ Baịbụl. Ma, ụmụnna ndị ọzọ na-ezikwa ozi ọma n’ókèala unu nwere ike ịchọta onye chọrọ ịmụta eziokwu dị na Baịbụl. Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla achọta onye mechara ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst, onye ọ bụla nyeere ya aka chọta ya kwesịrị iso ṅụrịa.

11. Ọ bụrụgodi na e nweghị onye ị na-amụrụ Baịbụl, olee ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi na-enye aka n’ime ndị na-eso ụzọ?

11 Ọ bụrụ na e nweghị onye ị na-amụrụ Baịbụl ugbu a, e nwere ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi nye aka mee ndị na-eso ụzọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịnabata ndị ọhụrụ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, metakwa ha enyi. Ọ ga-eme ka ha mata na ezigbo Ndị Kraịst hụrụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) Ọ bụrụgodị na ị zara ajụjụ dị nkenke n’ọmụmụ ihe, o nwere ike ime ka ndị ọhụrụ mụta otú ha ga-esi kwanyere mmadụ ùgwù mgbe ha na-agwa ya ihe ha kweere. I nwekwara ike iso onye nkwusa ọhụrụ gaa ozi ọma ma kụziere ya otú ọ ga-esi jiri Baịbụl na-akụzi ihe nke ọma. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị na-akụziri ya ime ka Kraịst.—Luk 10:25-28.

12. Ọ̀ dị mkpa na anyị ga-enwe nkà pụrụ iche iji mee ndị na-eso ụzọ? Kọwaa.

12 Anyị ekwesịghị iche na anyị ga-enwe nkà pụrụ iche iji kụziere mmadụ ihe ya abụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi gịnị? Chegodi gbasara Nwanna Nwaanyị Faustina bi na Bolivia. Mgbe ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, ọ maghị otú e si agụ ihe. Ọ mụtatụla ịgụ ihe. E meela ya baptizim ugbu a, ịkụziri ndị mmadụ ihe na-atọkwa ya ezigbo ụtọ. Ọ na-amụrụ mmadụ ise Baịbụl kwa izu. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị Faustina na-amụrụ ihe ka ya agụ ihe, o nyerela mmadụ isii aka ha abụrụ Ndịàmà Jehova e mere baptizim.—Luk 10:21.

13. Olee uru ụfọdụ anyị ga-erite ma anyị na-eme ndị na-eso ụzọ, ọ bụrụgodị na anyị nwere ọtụtụ ihe anyị na-eme?

13 Ọtụtụ Ndị Kraịst nwere ọtụtụ ihe dị mkpa ha na-eme. Ma, ha na-ewepụta oge na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Obi na-atọkwa ha ezigbo ụtọ ime ya. Dị ka ihe atụ, o nwere nwanna nwaanyị aha ya bụ Melanie bi n’otu obodo dịpụrụ adịpụ n’Alaska. Ọ bụ naanị ya na-azụ nwa ya nwaanyị dị afọ asatọ. Ọ na-arụ ọrụ, na-elekọtakwa nna ya na-arịa ọrịa kansa. Ọ bụ naanị Melanie bụ Onyeàmà Jehova n’obodo ha. Ọ na-arịọkarị Jehova ka o nye ya ike idi oyi na-atụ ebe ahụ ka o nwee ike ịga ozi ọma n’ihi na ọ chọrọ ịchọta onye ya na ya ga na-amụ Baịbụl. O mechara chọta otu nwaanyị aha ya bụ Sara. Obi tọrọ Sara ụtọ ịmụta na Chineke nwere aha. Ka oge na-aga, Sara kwetara ka a mụwara ya Baịbụl. Melanie kwuru, sị: “O ruo ná mgbede Fraịdee, ike na-agwụcha m. Ma obi na-adị mụ na nwa m nwaanyị ụtọ ịga mụọrọ ya Baịbụl. Ọ na-amasị anyị ime nchọnchọ ma zaa ya ajụjụ ndị o nwere. Obi dịkwa anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka ya na Jehova na-adị ná mma.” Sara katara obi die mmegide e megidere ya, hapụ chọọchị ya, e meekwa ya baptizim.

IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ INWE NDIDI N’ỌRỤ IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ

14. (a) Olee otú ime ndị na-eso ụzọ si yie ịkụ azụ̀? (b) Gịnị ka ihe Pọl kwuru na 2 Timoti 4:1, 2 kụziiri gị?

14 Ọ bụrụgodị na e nwebeghị onye ị na-amụrụ Baịbụl, ike agwụla gị ịchọ. Cheta na Jizọs ji ime ndị na-eso ụzọ tụnyere ịkụ azụ̀. Ndị na-akụ azụ̀ nwere ike ịnọ n’ebe ha gara ịkụ azụ̀ ọtụtụ awa tupu ha akụta azụ̀. Ọtụtụ mgbe, ha na-akụ azụ̀ n’ime abalị ma ọ bụ n’isi ụtụtụ. Mgbe ụfọdụkwa, ha na-akwọrọ ụgbọ ha gaa ebe dị anya ka ha nwee ike ịkụta azụ̀. (Luk 5:5) Otú ahụ ka ọ dịkwa ụfọdụ ndị nkwusa. Ha na-eji ọtụtụ awa achọ ndị nwere mmasị n’ebe dị iche iche nakwa n’oge dị iche iche. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka ha nwee ike inweta ọtụtụ ndị. Ndị na-eme otú a na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-enweta ndị nwere mmasị. Ì nwere ike ịga ozi ọma n’oge ndị mmadụ na-anọkarị n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị?—Gụọ 2 Timoti 4:1, 2.

Jiri ndidi nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ mata Jehova, hụkwa ya n’anya ma na-erubere ya isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ndidi?

15 Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ndidi ma anyị mụwara mmadụ Baịbụl? Otu ihe kpatara ya bụ na anyị kwesịrị inyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịmụta ihe Baịbụl kwuru ma jiri ya kpọrọ ihe. Anyị kwesịkwara inyere ya aka ịmata Jehova, bụ́ onye e dere uche ya na Baịbụl, nakwa ịhụ ya n’anya. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụghị naanị na anyị ga-akụziri onye ahụ ihe Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-eme, anyị ga-enyekwara ya aka ịmata otú ọ ga-esi na-eme ya. Anyị kwesịrị inwere ya ndidi ma nyere ya aka ka ọ na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru ná ndụ ya. Ụfọdụ na-enwe ike ịgbanwe n’ime ọnwa ole na ole, ebe ọ na-ewe ndị ọzọ oge karịrị otú ahụ ịgbanwe.

16. Gịnị ka ị mụtara n’ihe a kọrọ gbasara Raúl?

16 Otu onye ozi ala ọzọ bi na Peruu kọrọ otu akụkọ gosiri na anyị kwesịrị ịna-enwere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ndidi. Ọ sịrị: “Amụọrọla m otu nwoke aha ya bụ Raúl akwụkwọ abụọ. Ma, ọ ka nwere ihe ndị ya na ha na-alụ. Ya na nwunye ya na-enwekarị nsogbu, ọ na-ekwu okwu ọjọọ, ụmụ ya anaghịkwa akwanyere ya ùgwù n’ihi àgwà ọjọọ ya. Ma, ọ na-abịachi ọmụmụ ihe anya. N’ihi ya, anọgidere m na-aga enyere ya na ezinụlọ ya aka. Mgbe ihe karịrị afọ atọ mụ na ya matara gachara, e mere ya baptizim.”

17. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Jizọs gwara anyị, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” N’ihi ya, anyị na-ekwusara ndị anyị na ha na-ekweghị n’otu ihe ozi ọma ọtụtụ mgbe. Ụfọdụ n’ime ha enweghị okpukpe ha nọ na ya, e nwekwara ndị nke na-ekweghị na Chineke. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi na-ezi ụdị ndị a ozi ọma.

ABỤ NKE 68 Ịgha Mkpụrụ Alaeze

^ par. 5 Ọrụ bụ́ isi ọgbakọ Ndị Kraịst na-arụ bụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ndị ga-enyere anyị aka ime ndị na-eso ụzọ.

^ par. 2 NKỌWAKWU: Ihe ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme abụghị naanị ịmụta ihe Jizọs kụziiri ha. Ha na-emekwa ihe ha na-amụta. Ha na-agbalị isochi nzọụkwụ Jizọs anya.—1 Pita 2:21.

^ par. 52 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwoke na-aga ezumike natara ụmụnna akwụkwọ n’ọdụ ụgbọelu. Mgbe o mechara gaa n’ebe a na-elegharị anya, ọ hụkwara ụmụnna na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Mgbe ọ lọtara n’ụlọ, ụmụnna ọzọ bịakwara izi ya ozi ọma.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Nwoke ahụ kwetara ka a mụwara ya Baịbụl, e mechaakwa mee ya baptizim.