Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | IME KA NDỊ NA-ASỤ ASỤSỤ DỊ ICHE ICHE NỤ OZI ỌMA

Anyị Emewela Ihe Siiri Ọtụtụ Ndị Ike

Anyị Emewela Ihe Siiri Ọtụtụ Ndị Ike

E NWERE ihe dị ka puku asụsụ asaa ndị mmadụ na-asụ n’ụwa niile. Otú a e si nwee ọtụtụ asụsụ na-eme ka agụmakwụkwọ, ịga njem, ọchịchị, na azụmahịa ghara ịna-adịcha mfe. Nsogbu a dị kemgbe ụwa. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka n’afọ 475 T.O.N.K., mgbe Eze Ahazuirọs na-achị Peshia (ọ dị ka ọ bụ ya bụ Zaksis nke Mbụ), ọ dịrịghị ya mfe ime ka ndị niile ọ na-achị mara ihe o nyere n’iwu n’ihi na a na-asụ ọtụtụ asụsụ n’ime otu narị ógbè na iri abụọ na asaa ọ na-achị. E dere iwu ahụ ka ọ dị otú ógbè nke ọ bụla si ede ihe nakwa otú ha si asụ asụsụ. *

Ndị ọchịchị na ọtụtụ ndị ọzọ na-agbasa ozi taa anaghị emeli ụdị ihe ahụ Eze Ahazuirọs mere. Ma, o nwere ndị na-eme ya. Ndịàmà Jehova na-asụgharị akwụkwọ ha dị iche iche, ihe ndị a na-egere egere, vidio, nakwa Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ asaa na iri ise. Ụdị asụsụ ndị ogbi dị́ ihe dị ka iri asatọ sokwa n’asụsụ ndị ahụ. Ha na-ebipụtakwa akwụkwọ ndị ìsì n’ụdị dị iche iche.

N’agbanyeghị ihe a niile Ndịàmà Jehova na-eme, ha anaghị eji ihe ndị ha na-asụgharị akpa ego. A naghịkwa akwụ ndị nsụgharị ha na ndị na-arụrụ ha ọrụ ụgwọ. Oleezi ihe mere ha ji agba mbọ na-asụgharị ihe ndị ha na-emepụta n’ọtụtụ asụsụ, oleekwa otú ha na-esi asụgharị ha?

^ para. 3 Gụọ Esta 8:9 na Baịbụl gị.