Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Nsogbu Ndị Kwesịrị Ịkwụsị?

Olee Nsogbu Ndị Kwesịrị Ịkwụsị?

Olee Nsogbu Ndị Kwesịrị Ịkwụsị?

“Ndị ọchịchị agaghị akwụsịli nsogbu anyị, ọ bụ ha kpatara nsogbu anyị.” Ọ bụ Ronald W. Reagan, prezident nke iri anọ chịrị Amerịka, kwuru ihe a n’ụbọchị e duru ya n’iyi ọrụ.

Ọ KARỊALA iri afọ atọ Reagan kwuru ihe a. N’oge ahụ, ihe siri ezigbo ike n’Amerịka. O kwuru na ọ bụ n’oge ahụ ka ihe kacha taa akpụ n’Amerịka. O kwuru, sị: “Ihe niile dị ezigbo ọnụ. Ihe adatụbeghị ọnụ otú ọ na-ada ugbu a. Kemgbe ọtụtụ afọ, ego gọọmenti anyị na-emefu ka ego ọ na-enweta. Anyị na-agbaziri ego ka anyị jiri ya na-ekpori ndụ ugbu a, ma chefuo na ọ ga-akpatara anyị na ụmụ anyị ahụhụ echi. Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe iji kwụsị ihe a na-emenụ, ndị obodo anyị ga-ata ahụhụ dị egwu, ihe ga-esiri anyị ezigbo ike, ọ ga-akpakwa ọchịchị anyị aka ọjọọ.”

Ị nụ ihe a Reagan kwuru, ya adị gị ka o nwekataghị ka ihe dị mma. Ma, o kwuru ihe gosiri na ọ ma na ihe ga-emecha dị mma. Ọ sịrị: “Ihe esierela anyị ike ná mba a kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ ga-ewe oge tupu ya akwụsị, ma ọ ga-emecha kwụsị.”

Olee otú ihe si kwụrụ taa? N’afọ 2009, ụlọ ọrụ na-ahụ maka iwu ụlọ na mmepe obodo n’Amerịka kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-agba mbọ inweta ihe ga-ezuru ha. Ma, ihe ndị dị ka ụzọ ọjọọ, enweghị ezigbo mmiri na ọkụ eletrik, enweghị ezigbo ụlọ obibi, na ezigbo ụlọ ọgwụ na-eme ka ihe na-esiri ha ike.” Ụlọ ọrụ ahụ kwukwara na ọ bụ ya mere ngalaba òtù mba ụwa nke na-ahụ maka ụlọ obibi ji kwuo n’afọ 2009 na n’ime iri afọ atọ, ihe ga-esiri otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla ezigbo ike. Ha agaghị enwe ebe dị mma ha ga na-aga mposi na ezigbo mmiri ọṅụṅụ. Ha ga-enwe nsogbu oké okpomọkụ na-akpata. Nke a ga-eme ka ọrịa ju ebe niile.

Nsogbu nke Zuru Ụwa Ọnụ

N’agbanyeghị ebe i bi, gịnị ka i chere banyere ajụjụ ndị a?

● Ihe ọ̀ dịrịla gị mma ugbu a karịa ka ọ dịịrị gị afọ iri gara aga?

● Otú e si elekọta gị na ndị ezinụlọ gị ma unu gaa ụlọ ọgwụ ugbu a, ọ̀ ka otú e si elekọta unu n’oge gara aga mma?

● Ụwa anyị a ọ̀ dị ọcha ugbu a karịa ka ọ̀ dị n’oge gara aga? Obi ọ̀ na-eruzi gị ala ugbu a?

● Ì chere na ihe ga-aka mma n’ime afọ iri, afọ iri abụọ, ma ọ bụ afọ iri atọ na-abịa abịa?

Ihe Ndị Ọchịchị na Ndị Ha Na-achị Kwesịrị Ịna-eme

Ọtụtụ mba nwere ihe ndị ha kwuru ndị ọchịchị na ndị ha na-achị kwesịrị ịna-eme. Mgbe ụfọdụ, ha na-ede ya ede ma ọ bụkwanụ kwuo ya n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, mba ọ bụla chọrọ ka ụmụ amaala ya na-erube isi n’iwu obodo. Ha kwesịrị ịna-atụ ụtụ isi ma ghara ime ihe ga-akpata ọgba aghara. Ndị ọchịchị na-ekwekwa nkwa na ha ga-arụ ezigbo ụlọ ọgwụ a ga na-agwọ ndị mmadụ ọrịa. Ha na-ekwukwa na ha ga-eme ka obi dị mmadụ niile mma, ndị mmadụ enweekwa ezigbo ọrụ.

Ndị ọchịchị hà na-emere ndị ha na-achị ụzọ ihe atọ a? Na peeji atọ na-esonụ, ị ga-ahụ ihe e kwuru banyere ajụjụ a.

Inwe Ezigbo Ụlọ Ọgwụ A Ga Na-agwọ Ndị Mmadụ Ọrịa

Ihe ndị mmadụ chọrọ: Mgbe a ga-agwọ ha ọrịa n’anaghị ha nnukwu ego.

Nke bụ́ eziokwu:

● Ụlọ Akụ̀ Ụwa kwuru na “puku ụmụaka isii na-anwụ kwa ụbọchị n’ihi na a naghị edewe ebe ha bi na ihe ha na-eri ọcha. Ha na-aṅụkwa mmiri na-adịghị ọcha. Afọ ọsịsa na-egbukwa ụmụaka atọ n’otu nkeji ọ bụla.”

● N’afọ 2008, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike (WHO) lebara anya n’otú e si agwọ ọrịa “ná mba ndị mepere emepe na otú e si agwọ ya ná mba ndị na-emepeghị emepe.” Ha kwuru na a na-akpachapụ anya agwọ ndị mmadụ ọrịa ná mba ndị mepere emepe, a naghịkwa ana ha oké ego. Otú e si agwọ ndị ọgaranya ka e si agwọ ndị ogbenye, a na-enyekwa ha ọgwụ ga-agwọ ha. Ma, a naghị eme ihe ndị a ná mba ndị na-emepeghị emepe.

Mgbe afọ abụọ gara, ngalaba ahụ chọpụtara na “ịrụ ụlọ ọgwụ na ilekọta ya na-esiri ndị ọchịchị ike n’ụwa niile. Ihe kpatara ya bụ na a na-enwekwu ndị agadi, ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ndị na-anaghị ala ala, a na-enwekwa ụzọ ọhụrụ dị oké ọnụ e si agwọ ọrịa.”

● Ihe ọzọ bụ na ọgwụ ndị e ji alụso nje ọgụ anaghịzi arụ ọrụ. Ọrịa ndị dị ka ekpenta na ụkwara nta na-egbu ọtụtụ nde mmadụ n’oge gara aga. Ma, n’ihe dị ka iri afọ asaa gara aga, e mepụtara ọgwụ ndị e ji agwọ ha. Taa, ihe agbanweela. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru n’afọ 2011 na ọtụtụ nje ndị na-akpata ọrịa ndị na-anaghị ekwe ngwọta na-apụta n’ike n’ike. Ọgwụ ndị e ji agwọbu ụdị ọrịa ndị a anaghịzi arụ ọrụ. E nweela ọtụtụ ọrịa, ma, e nweghị ọgwụ e ji agwọ ha.

Nsogbu ndị kwesịrị ịkwụsị: Anyị ga-achọ ịhụ mgbe ihe Baịbụl buru n’amụma ga-emezu. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị onye bi na [Paradaịs] nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.

Ime Ka Obi Dị Mmadụ Niile Mma

Ihe ndị mmadụ chọrọ: Mgbe ịkpọ ndị ọzọ asị na imegbu ụmụ nwaanyị ga-akwụsị; mgbe a na-agaghị enwe ihe dị iche n’onye ọgaranya na onye ogbenye.

Nke bụ́ eziokwu:

● Otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka nke na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ kwuru na ọtụtụ ndị ka na-alụso ibe ha ọgụ kwa ụbọchị, na-emebisị ebe ndị ahụ na-anọ efe ofufe na ụlọ ọrụ dị iche iche. Ihe mere ha ji eme ha ihe ndị a bụ na ha kpọrọ ha asị n’ihi ebe ha si na okpukpe ha na-ekpe. Ha achọghịkwa ka ndị ahụ na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ.

● Òtù Mba Ụwa kwuru na a na-emegbu ọtụtụ nde ụmụ nwaanyị n’ụwa niile, na-eti ha ihe, na-eledakwa ha anya ma n’ụlọ ma n’ebe ha na-arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, e kee ụmụ nwaanyị Afganịstan ụzọ iri, a naghị ekwe ka ihe dị ka ụzọ itoolu n’ime ha gaa ụlọ ọgwụ mgbe ha dị ime. Na Yemen, e nweghị iwu kwuru na e kwesịghị iti ụmụ nwaanyị ihe. Na Kongo Kinshasa, a na-edina ihe karịrị otu puku ụmụ nwaanyị n’ike kwa ụbọchị.

● N’Ọktoba 2011, Odeakwụkwọ Ukwu Òtù Mba Ụwa bụ́ Ban Ki-moon kwuru, sị: ‘Ihe na-eme n’ụwa a gbagwojuru anyị anya. A na-akọpụta nri hiri nne n’ụwa niile ma agụụ na-anyụ otu ijeri mmadụ anya. Mmadụ ole na ole bara ezigbo ọgaranya, ma, ọtụtụ anaghị ahụ tụrụ rachaa. E nweela ihe ọhụrụ ndị e mepụtara e ji agwọ ọrịa, ma, ụmụ nwaanyị ka na-anwụ kwa ụbọchị mgbe ha na-amụ nwa. A na-eji ọtụtụ ijeri dọla emepụta ngwá agha kama a ga-eji ya nyere ndị mmadụ aka.’

Nsogbu ndị kwesịrị ịkwụsị: Anyị ga-achọ ịhụ mgbe a na-agaghị enwe ndị a na-emegbu emegbu, mgbe imegbu ụmụ nwaanyị ga-akwụsị, na mgbe a na-agaghịzi enwe ndị ‘na-anapụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ikpe ziri ezi.’—Aịzaya 10:1, 2.

Inwe Ezigbo Ọrụ

Ihe ndị mmadụ chọrọ: Mgbe onye ọ bụla ga-enwe ezigbo ọrụ; o nweghịkwa ihe ga-akọ ya.

Nke bụ́ eziokwu:

● Otu ụlọ ọrụ kwuru na e nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịrụ ọrụ, nke ga-eme ka ihe ka mma n’ụwa, ma, e nweghị ọrụ ha ga-arụ. Ụlọ ọrụ ahụ sịrị na Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọrụ kwuru na ihe siri ezigbo ike n’ụwa nakwa na ndị na-enweghị ọrụ n’afọ 2010 ruru narị nde abụọ na nde ise.

● Ụlọ ọrụ mgbasa ozi a na-akpọ BBC kwuru ihe Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọrụ kwuru. Ọ sịrị na otú ihe si esi ike ná mba dị iche iche nwere ike ime ka a chụkwuo ọtụtụ ndị n’ọrụ. Nke a nwekwara ike ime ka e nwee ọgba aghara n’ebe dị iche iche. Ngalaba ahụ kwukwara na otú ihe si kwụrụ ugbu a na-egosi na e kee ndị na-achọ ọrụ ụzọ abụọ, naanị otu ụzọ n’ime ha ga-enweta ọrụ. Ihe ọzọ ha lebaara anya bụ ndị obi na-adịghị mma n’ihi na ha enweghị ọrụ. Ha chọpụtara na ihe mere na obi adịghị ha mma bụ na ndị kwesịrị ịkwụsị ihe isi ike n’ụwa anaghị eme ihe ọ bụla iji kwụsị ya. Ha kwuru na e nwere ike inwe ọgba aghara n’ọtụtụ mba, nke ka nke ná mba ndị dị na Yurop na Arab.

● Otu akwụkwọ kwuru na n’Amerịka, e kee ụgwọ ndị mmadụ ji, otu onye ga-eketa ihe karịrị otu nde naịra, narị puku naịra asaa na puku ise. Nke a ji okpukpu atọ karịa ụgwọ ndị mmadụ ji n’afọ 1990. Akwụkwọ ahụ kwukwara na ọtụtụ ndị na-aga zụrụ ihe n’aka, ndị mmadụ hụ ha ha echee na ha bara ọgaranya. Ọ sịkwara na ndị Amerịka hụ onye na-agba ụgbọala mara mma ma ọ bụkwanụ onye na-eyi uwe mara mma, ha echee na o nwere ego. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ha zụrụ ihe ndị ahụ n’aka.

Nsogbu ndị kwesịrị ịkwụsị: Onye ọ bụla kwesịrị inwe ọrụ. Ndị mmadụ kwesịrị ịna-azụ naanị ihe ndị dị ha mkpa. Baịbụl gosiri na “ego bụ ihe nchebe.” Ma, ọ gwara anyị ka anyị ghara ịhụ ya n’anya n’ihi na “ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.”—Ekliziastis 7:12; 1 Timoti 6:10.

Ihe ndị a e kwuru na peeji nke anọ ruo nke asatọ nwere ike ime ka mmadụ chewe na ọ ga-esi ike tupu ihe adị mma. Ma, ihe agaghị adịgide otú a. Ihe ga-emecha dị mma n’ụwa a. Ọ bụghịkwanụ ọchịchị ụmụ mmadụ ga-eme ya.

[Igbe/Ihe e sere na peeji nke 5]

Gịnị ka ndị na-eto eto sị na ha ga-eme ka ụwa dị mma ma a sị na ọ dị ha n’aka? Otu ebe a na-edebe ihe n’Ịntanet kwuru na a gbara ihe dị ka puku ụmụaka abụọ ndị Briten dị n’agbata afọ anọ na iri na anọ ajụjụ ọnụ. A jụrụ ha ihe ndị ha ga-achọ ime ka ha kwụsị. Ha kwuru na ha ga-achọ ime ka ihe ndị na-esonụ kwụsị:

[Ihe e sere ese]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

100%

AGỤỤ

AGHA ỊDA

OGBENYE

75%

OKÉ OKPOMỌKỤ MMEGBU

50%

25%

0%

[Igbe/Ihe e sere na peeji nke 5]

N’afọ 2009, otu ụlọ ọrụ dị na Jamanị gbara ndị na-eto eto dị n’agbata afọ iri na anọ na iri na asatọ ajụjụ ọnụ. Ha dị ihe dị ka narị mmadụ ise. Ụlọ ọrụ ahụ kwuru ihe kacha enye ndị ahụ na-eto eto nsogbu n’obi.

Ihe ndị dị ka igbu ndị mmadụ ka ọkụkọ na otú ọnụ ọgụgụ mmadụ si na-ehi nne n’ụwa anachaghị enye ha nsogbu n’obi. Ihe isi ike e nwere n’ụwa a sokwa n’ihe na-anaghị enye ha nsogbu n’obi. Ụlọ ọrụ ahụ kwuru na ihe mere ihe ndị a anaghị enye ha nsogbu bụ na o nwebeghị ihe ha hụrụ ná ndụ.

[Ihe e sere ese]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

100%

75% ỊDA OGBENYE

ỤKỌ NRI NA ỤKỌ OKÉ OKPOMỌKỤ

MMIRI ỌṄỤṄỤ NA IMETỌ ỤWA

50% ỌRỊA

25%

0%