Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị

Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị

Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị

Gịnị mere ụfọdụ ndị ji ekwugide Ndịàmà Jehova?

Otu ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ndị ekwerela asịrị e ji Ndịàmà Jehova gbaa. O nwekwara ndị ọzọ ozi ọma Ndịàmà na-ekwusa na-ewe iwe. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe mere Ndịàmà Jehova ji ekwusara ndị agbata obi ha ozi ọma bụ na ha hụrụ ha n’anya, ha makwaara na ọ bụ “onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”—Ndị Rom 10:13.

Ndịàmà Jehova hà so na chọọchị ndị si na Katọlik kewapụ, hà bụ Ndị Kraịst, ma ọ bụ òtù?

Ndịàmà Jehova esoghị na chọọchị ndị si na chọọchị Katọlik kewapụ onwe ha nke ha ji abụ ndị Katọlik, n’ihi na ha chọpụtara na e nwere ụfọdụ ihe okpukpe ndị a na-akụzi bụ́ ndị na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl anaghị akụzi na Chineke, onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya, na-ata ndị mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi n’ọkụ mmụọ. Baịbụl ekwughịkwa na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ.—Ezikiel 18:4; Ndị Rom 6:23. *

Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst n’ihi na ha na-eṅomi Kraịst n’ihe niile ha na-eme ná ndụ. Dị ka ihe atụ, Kraịst na Ndị Kraịst oge mbụ etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama, ha kwusara ozi ọma banyere Alaeze Chineke. (Luk 4:43; Jọn 15:19; 17:14) Ndịàmà Jehova na-eme ka ha, ọ bụ ya mere ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha na-agakwa n’ụlọ ndị mmadụ na-ezi ha ozi ọma ihu na ihu, na-agbalịkwa ịkụziri ha ihe otú ọ ga-eru ha n’obi dị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere.—Ọrụ 19:8.

Òtù bụ ndị si n’otu okpukpe kewapụ onwe ha ma malite okpukpe ọhụrụ n’ihi na ihe a na-eme n’ebe ahụ adịghị ha mma. Ndịàmà Jehova esighị na chọọchị ọ bụla kewapụ onwe ha. Ha abụghị òtù.

Olee otú ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-adị?

N’ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ihe bụ́ isi ha na-amụ bụ Baịbụl, a na-enwekwa oge ndị bịaranụ nwere ike itinye ọnụ. Onye ọ bụla chọrọnụ nwekwara ike ịbịa ọmụmụ ihe ha. N’otu n’ime ọmụmụ ihe ha na-enwe n’izu ọ bụla, bụ́ nke a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, a na-akụziri ha otú e si akụzi ihe, otú e si agụ ihe, na otú e si eme nchọnchọ. N’ọmụmụ ihe ọzọ ha na-enwe, a na-eji nkeji iri atọ kwuo otu isiokwu si na Baịbụl bụ́ nke ndị na-abụghị Ndịàmà ga-achọ ige. N’ọtụtụ ebe, ọ na-abụ e kwuchaa okwu ahụ, ha ejiri magazin Ụlọ Nche ha mụọ Baịbụl. Ha na-eji abụ na ekpere amalite ma na-emechi ọmụmụ ihe ha. Ha anaghị arịọ ndị mmadụ ego, ha anaghịkwa ebugharị efere ụtụ.—2 Ndị Kọrịnt 8:12.

Olee otú Ndịàmà Jehova si enweta ego ha ji akwado ọrụ ha?

Ọ bụ onyinye ndị mmadụ ji obi ha nye ka Ndịàmà Jehova ji akwado ọrụ ha. Ndịàmà Jehova anaghị ana ego ma ha mee ndị mmadụ baptizim, kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ, okwu olili ozu, ma ọ bụ ma ha zie ha ozi ọma. Ha anaghịkwa ana otu ụzọ n’ụzọ iri. Onye ọ bụla chọrọ inye onyinye nwere ike itinye ya n’igbe ndị e dewere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-eji aka ha ebipụta akwụkwọ ndị ha ji amụ Baịbụl, nke a na-emekwa ka ọ ghara ifu ha oké ego. Ọ bụkwa Ndịàmà a na-anaghị akwụ ụgwọ na-arụkarị Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ ha dị iche iche.

Ndịàmà Jehova hà na-aṅụ ọgwụ?

Ee. Nke bụ́ eziokwu bụ na hanwa ma ọ bụ onye ha rịawa ọrịa, ha na-agbalị ịga ụlọ ọgwụ kacha mma. Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ Ndịàmà Jehova bụ ndị nọọsụ na ndị dọkịta. Ma, Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara. Baịbụl sịrị: ‘Zere ọbara.’ (Ọrụ 15:28, 29) Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ ndị dọkịta achọpụtala na ịgwọ ndị ọrịa n’ejighị ọbara bụ ụzọ kacha mma isi gwọọ ọrịa, n’ihi na ọ na-egbochi mmadụ ibute ọtụtụ ọrịa ndị a na-esi n’ọbara ebute.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A kọwara ihe Baịbụl kwuru banyere ozizi ọkụ ala mmụọ na mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ nakwa ọtụtụ isiokwu ndị ọzọ dị mkpa n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

OBODO NDỊ BI NA YA NA-EKWE KA IBE HA NỌRỌ

N’ebe ndịda Meksiko, e nwere obodo a na-akpọ Bejukal de Okampo. Obodo a dịtụ iche n’obodo ndị ọzọ. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Excélsior si kwuo, “Ọtụtụ ndị bi na ya bụ Ndịàmà Jehova.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara, sị: “N’obodo a, onye ọ bụla na-ekpe okpukpe masịrị ya, ndị ọchịchị anaghịkwa enye onye ọ bụla nsogbu. . . . Ndị bi n’obodo a akwụsịla ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ sịga, ha na-amụzi Baịbụl ma na-agụ abụ. Ha na-erubekwara ndị ọchịchị isi.”

Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara na n’agbanyeghị na e nwere okpukpe dị iche iche n’obodo ahụ, “ha anaghị arụ ụka ma ọ bụ na-ese okwu n’ihi okpukpe. O nweghị onye na-eburu ibe ya iwe n’obi, ọ bụrụgodị na mmadụ na onye agbata obi ya anaghị ekpe otu okpukpe, ọ naghị egbochi ha ikele ibe ha . . . Ezinụlọ ọ bụla na-ekpe okpukpe masịrị ha, nke a anaghịkwa egbochi ndị niile bi n’obodo ahụ ibi n’udo. O nweghị onye ọ ga-eju anya na ọtụtụ ndị bi n’obodo Bejukal bụ Ndịàmà Jehova.” Ihe ọzọkwa bụ na otu onye nkụzi na-abụghị Onyeàmà, nke na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị n’obodo ahụ, kwuru na ụmụ Ndịàmà ‘na-ejike otú dị mma, na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, na-akpakwa ezigbo àgwà na klas ha.’