Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ihu Ọchị Anagide Ọrịa

Iji Ihu Ọchị Anagide Ọrịa

Iji Ihu Ọchị Anagide Ọrịa

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SPEN

CONCHI bụ nwanyị katatụrụla ahụ́ na-enwe ihu ọchị mgbe nile, nke ya na ọrịa cancer nọworo na-alụ kemgbe afọ asaa. Kemgbe a chọpụtara na o bu ọrịa cancer n’ara ya, a wawo ya ahụ́ ugboro asaa iji bepụ akpụ cancer ahụ. Olee otú o si na-anagide ya?

O kwuru, sị, “Mgbe ọ bụla ndị dọkịta gwara m na a ga-awa m ahụ́, ọ bụrụ na ọ gụrụ m ákwá, ana m ebe ákwá otú m nwere ike iji mee ka obi dajụlata m. Mgbe ahụ, m na-agbalị ịdịrị ndụ m gaa n’ihu, na-emekwa ihe ndị m na-enwe mmasị ime—dị ka ịmụ asụsụ China, ịga mgbakọ Ndị Kraịst, na iso ndị ezinụlọ m na ndị enyi m gaa ezumike. Ana m echetakarị okwu Jizọs, bụ́: ‘Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?’”—Matiu 6:27.

O kwukwara, sị: “Ana m agbalịkwa ịdị na-achị ọchị mgbe nile. Mụ na ndị dọkịta na-akọrịkarị akụkọ ndị na-akpa ọchị, ana m ekiri fim ndị na-eme ka m na-achị ọchị. Nke ka nke, ana m ahụ na mụ na ndị enyi m na ndị ikwu m na-akpakọrịta mgbe mgbe. Inwe ndị enyi gị na ha pụrụ iso chịkọọ ọchị bụ ọgwụ magburu onwe ya. N’otu oge, obere oge nnọọ tupu a waa m ahụ́, ụfọdụ ndị enyi m na ndị ikwu m kọọrọ m otu akụkọ na-atọ ọchị bụ́ nke mere n’abalị bọtara ụbọchị ahụ. Achịrị m ọchị nke ukwuu nke na mgbe e bubara m n’ebe a ga-anọ waa m ahụ́, ahụ́ ruru m nnọọ ala.”

Ọ bụghị nanị Conchi bụ onye chọpụtarala na ịchị ọchị na ile ihe anya n’ụzọ dị mma pụrụ inyere anyị aka ịnagide ọrịa. Ndị dọkịta nke oge a aghọtawakwala uru dị ukwuu ịchị ọchị na-aba n’ịlụso ọrịa na ahụ́ mgbu ọgụ.

Ọ Na-adị Mma n’Ahụ́ Nakwa n’Uche

Echiche a abụghị ihe ọhụrụ. Ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, Eze Solomọn dere, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ́ dị mma.” (Ilu 17:22) N’otu aka ahụ, Lope de Vega, bụ́ onye Spen na-ede akwụkwọ, onye dịrị ndụ na narị afọ nke 17, dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị na-achị ọchị mgbe nile, ana m eche na anyị ga-enwekwu ezi ahụ́ ike.” Ma n’ụwa a nchekasị jupụtara, o yiri ka ndị mmadụ hà na-agba ọchị n’akpa kama ịchịpụta ya achịpụta. O doro anya na anyị na-ebi n’oge a na-enwe ihe ịga nke ọma na nkà na ụzụ, ma bụrụkwa oge ọchị na-ala ala. Akwụkwọ bụ́ El arte de la risa (Nkà nke Ịchị Ọchị) kwuru na, n’ụwa taa, o yiri ka ‘e jirila kọmputa dochie anya ụmụ mmadụ.’ Mgbe ụfọdụ, ọ na-eyi ka kọmputa ọ̀ na-ewerezi ọnọdụ ịchị ọchị, ịmụmụ ọnụ ọchị, nakwa ịdị na-emegharị ahụ́, bụ́ ihe ndị mmadụ na-eme mgbe ha na-ekwu okwu.

Inwe ezigbo ihu ọchị na-enyere onye na-arịa ọrịa aka ịdị na-eche echiche dị mma, na-enwe mmetụta dị mma, ma na-eme omume dị mma. Dị ka Dr. Jaime Sanz-Ortiz, bụ́ ọkachamara n’ọrịa cancer nakwa n’ọgwụ na-ebelata ihe mgbu, dere n’otu isiokwu n’oge na-adịbeghị anya, mmadụ inwe ihu ọchị “na-eme ka ọ dịrị ya mfe ịmalite nkwurịta okwu, na-eme ka ahụ́ ya nwee ike ịlụso ọrịa ọgụ, na-eme ka ahụ́ mgbu na nchegbu belata, na-eme ka obi jụrụ ya, na-eme ka uru ahụ́ ya ghara ikwe ikwe, na-akpalikwa ya inwe nkà na olileanya.”

Uru Dị Ukwuu Inwe Ihu Ọchị Bara

N’ihi gịnị ka inwe ezigbo ihu ọchị ji bụrụ ihe na-agwọ ọrịa? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ àgwà nke na-enye mmadụ ohere ile ọnọdụ ọ nọ na ya anya n’ụzọ dị mma, ọbụna mgbe ọ nọ n’ọnọdụ ọjọọ. Sanz-Ortiz kwuru, sị: “Site n’ịdị na-enwe ihu ọchị ma na-achị ọchị kwa ụbọchị, anyị na-anọgide na-adị ike, ọ na-emekwa ka ike ghara ịgwụ anyị ngwa ngwa, nakwa ka anyị ghara ịdị na-emetere onwe anyị ebere.”

Dị ka e si kee anyị, ihe na-akpali anyị ịchị ọchị na-adịgasị iche dabere n’ụdị mmadụ anyị bụ nakwa obodo anyị si na ya. “Dị nnọọ ka mma si dị n’anya n’anya, ihe na-akpa ọchị na-adabere n’otú onye si hụ ya,” ka Sanz-Ortiz kọwara. Ma, n’agbanyeghị otú e si zụlite anyị ma ọ bụ ókè anyị gụruru akwụkwọ, ezigbo ihu ọchị na-abụkarị ụzọ dị mma isi na-enwe mkparịta ụka na isi na-eme ka nchekasị, iwe, ma ọ bụkwanụ ahụ́ erughị ala anyị na-enwe belata. Ọ bụrụ na ọ pụrụ inyere anyị aka dị ukwuu otú a, olee ihe anyị pụrụ ime iji na-enwe ezigbo ihu ọchị?

Ihe mbụ anyị pụrụ ime bụ ịkwụsị ịdị na-eche nanị banyere nsogbu anyị ma ọ bụ banyere ọrịa anyị ma malite ịdị na-enwe obi ụtọ n’ezi ihe ndị anyị na-enweta n’ọnọdụ ọ bụla. Tụkwasị na nke ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịdị na-eche echiche n’ụzọ ezi uche dị na ya, na-ezere iche echiche na-adịghị mma ma ọ bụ nke gbagọrọ agbagọ bụ́ ndị na-eme ka nsogbu anyị yie ka hà karịrị akarị. Anyị pụkwara ịmụta ịdị na-enwe ihu ọchị site n’ile ihe anya n’ụzọ dị iche. Ọ pụtaghị na anyị ga na-amụmụ ọnụ ọchị ma ọ bụ na-achị ọchị mgbe nile. Ma, ọ bụrụ na anyị ahụ ihe na-atọ ọchị banyere ọnọdụ anyị nọ na ya, anyị kwesịrị ịchị ọchị, nke a ga-eme ka anyị nwee ike ịnagide ọnọdụ ọ bụla. “Ịchị ọchị na-eme ka anyị wepụ obi ná nsogbu anyị ruo nwa oge ma mee ka otú anyị si ele nsogbu ahụ anya gbanwee . . . , na-eme ka anyị nwee ụzọ ndị ka mma isi na-anagide ya,” ka Sanz-Ortiz gara n’ihu na-ekwu.

N’ezie, ọchị abụghị ihe ngwọta nke nsogbu ọ bụla anyị na-enwe ná ndụ. Ma, ọ ga na-enyere anyị aka mgbe nile ile nsogbu anyị anya n’ụzọ dị mma, bụ́kwa nke ezi uche dị na ya. Dị ka Conchi kwuru, “ọrịa abụghị ihe egwuregwu, ma ị ghaghị ịgba mbọ ịnọgide na-enwe ihu ọchị. Ana m ewere ndụ m dị ka ubi akwụkwọ nri, nke a kụrụ ọtụtụ ihe na ya, bụ́ nke ọ dị mwute ikwu na otu n’ime ha bụ ọrịa m. N’agbanyeghị nke ahụ, ana m agbalị idebe ya n’otu akụkụ ka ọ ghara ịnọchi ihe ndị ọzọ m na-eme. N’ezie, agaghị m asị na emeriela m n’ọgụ a m na-alụso ọrịa cancer, ma aka m na-ekpori ndụ, nke ahụ dịkwa mkpa nke ukwuu.”

[Foto dị na peeji nke 27]

Ka Conchi na-enweta agbamume site n’aka di ya, bụ́ Felix, na nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ, bụ́ Pili