“Ugbu A, Ị Ga-ahụ Ihe M Gaje Ime Fero”
Tupu Jehova etie ndị Ijipt ihe otiti ma napụta ndị Izrel n’ohu ha na-agba, ọ gwara ndị Izrel ihe ọ chọrọ ime. Ha ga-ahụ ike Jehova otú ha na-ahụtụbeghị ya mbụ, ndị Ijipt ga-amarakwa onye Jehova bụ. Mgbe Chineke mezuru ihe o kwuru na ọ ga-eme ndị Ijipt, okwukwe ndị Izrel sikwuru ike. Ihe a mekwara ka ha ghara ifewa chi ụgha ndị Ijipt na-efe.
Olee otú akụkọ Baịbụl a si eme ka obi sikwuo gị ike na nkwa niile Jehova kwere maka ọdịnihu ga-emezu?