Ọpụpụ 7:1-25

  • Jehova gbara Mosis ume (1-7)

  • Mkpara Erọn ghọrọ nnukwu agwọ (8-13)

  • Ahụhụ nke mbụ: mmiri ghọrọ ọbara (14-25)

7  Jehova wee gwa Mosis, sị: “Lee, emeela m ka ị bụụrụ Fero Chineke, Erọn nwanne gị ga-abụkwa onye amụma gị.+ 2  Ị ga-ekwu ihe niile m ga-enye gị iwu ka i kwuo. Erọn nwanne gị ga-agwa Fero okwu, ọ ga-ahapụkwa ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ. 3  Ma m ga-ekwe ka obi Fero kpọchie.+ M ga-eme ọtụtụ ihe àmà, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ebube n’Ijipt.+ 4  Ma, Fero agaghị ege unu ntị. M ga-ebi Ijipt aka ma si n’Ijipt kpọpụta ndị m dị ọtụtụ,* bụ́ ndị Izrel, taakwa Ijipt nnukwu ahụhụ.+ 5  Ndị Ijipt ga-amarakwa na m bụ Jehova+ mgbe m ga-eweli aka m mee Ijipt ihe ma kpọpụta ndị Izrel n’obodo ha.” 6  Mosis na Erọn mere ihe Jehova nyere ha n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ. 7  Mosis dị afọ iri asatọ, Erọn adịrị afọ iri asatọ na atọ mgbe ha gwara Fero okwu.+ 8  Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 9  “Ọ bụrụ na Fero asị unu, ‘Rụọnụ ọrụ ebube,’ gwa Erọn, sị, ‘Were mkpara gị tụpụ n’ala n’ihu Fero.’ Ọ ga-aghọ nnukwu agwọ.”+ 10  Mosis na Erọn wee gakwuru Fero ma mee nnọọ ihe Jehova nyere ha n’iwu. Erọn tụpụrụ mkpara ya n’ala n’ihu Fero na ndị na-ejere ya ozi, ya aghọọ nnukwu agwọ. 11  Ma, Fero kpọkọtara ndị ma ihe na ndị dibịa afa. Ndị dibịa anwansi ndị a e nwere n’Ijipt+ jikwa anwansi* ha mee otu ihe ahụ.+ 12  Onye ọ bụla n’ime ha tụpụrụ mkpara ya n’ala, mkpara ya aghọọ nnukwu agwọ. Ma mkpara Erọn loro mkpara ha. 13  N’agbanyeghị ihe a, Fero kpọchiri obi ya,+ o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru. 14  Jehova wee gwa Mosis, sị: “Obi Fero akpọchiela.+ Ọ jụla ịhapụ ha ka ha laa. 15  Gakwuru Fero n’ụtụtụ. Ọ ga-apụta ka ọ gaa na mmiri. Ị ga-anọrọ n’ọnụ ọnụ Osimiri Naịl ka i zute ya. Ị gawa, jiri mkpara ahụ n’aka, ya bụ, mkpara ahụ nke ghọrọ agwọ.+ 16  Ị ga-asị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru zitere m ka m bịakwute gị.+ Ọ sịrị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m* n’ala ịkpa.” Ma i gebeghị ntị ruo ugbu a. 17  Jehova kwuru, sị: “Ị ga-eji ihe a mata na m bụ Jehova.+ M ga-akụ mkpara m ji n’aka na mmiri dị n’Osimiri Naịl, mmiri ahụ ga-aghọkwa ọbara. 18  Azụ̀ ndị dị n’Osimiri Naịl ga-anwụ. Osimiri Naịl ga na-esi ísì, mmiri Osimiri Naịl agaghịkwa ekwe ndị Ijipt ọṅụṅụ.”’” 19  Jehova sịziri Mosis: “Gwa Erọn, sị, ‘Were mkpara gị, setịa aka gị n’elu mmiri ndị dị n’Ijipt,+ n’elu osimiri ndị dị na ya, n’elu ọwa mmiri ya niile,* n’elu ọdọ mmiri ya niile,+ nakwa n’elu ebe niile mmiri na-asọba, ka ha ghọọ ọbara.’ Ọbara ga-adị n’ala Ijipt niile, ma n’arịa ndị e ji osisi mee ma n’arịa ndị e ji nkume mee.” 20  Ozugbo ahụ, Mosis na Erọn mere nnọọ otú Jehova nyere ha iwu. O weliri mkpara ahụ kụọ mmiri dị n’Osimiri Naịl n’ihu Fero na ndị na-ejere ya ozi, mmiri niile dị n’osimiri ahụ ghọziri ọbara.+ 21  Azụ̀ ndị dị n’osimiri ahụ nwụrụ.+ Osimiri ahụ malitere isi ísì, ndị Ijipt enweghịkwa ike ịṅụ mmiri si n’Osimiri Naịl.+ Ọbara wee ju ebe niile n’ala Ijipt. 22  Ma, ndị dibịa anwansi ndị Ijipt ji anwansi* ha mee otu ihe ahụ,+ nke mere ka obi Fero ka kpọchie akpọchie, o geghịkwa ha ntị, otú Jehova kwuru.+ 23  Fero wee laghachi n’ụlọ ya, ma o chebaraghị ihe a merenụ echiche. 24  Ndị Ijipt niile nọ na-egwu olulu gburugburu Osimiri Naịl ka ha nweta mmiri ha ga-aṅụ, n’ihi na ha enweghị ike ịṅụ mmiri ọ bụla si n’Osimiri Naịl. 25  Ụbọchị asaa gafere mgbe Jehova mechara ka mmiri dị n’Osimiri Naịl ghọọ ọbara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ndị agha m, ndị m.”
Ma ọ bụ “majik.”
Na Hibru, “jeere m ozi.”
Ya bụ, ọwa mmiri ndị si n’Osimiri Naịl.
Ma ọ bụ “majik.”