Abụ nke 113
Ikele Chineke n’Ihi Okwu Ya
1. Jehova, Nn’anyị, a’yị n’ekele gị
N’ihi n’anyị nwer’Okwu gị bụ́ Baịbụl!
I nyere ndị dere ya ’mụọ nsọ ide uche gị.
Baịbụl n’eduzi anyị; ị n’ezi any’ihe.
2. Ih’e dere na ya n’eru anyị n’obi.
Ndị amụma gị bụ ’madụ dị k’anyị.
Ịmụ banyere ndụ ha n’eny’anyị ob’ike.
Ọ n’eny’anyị obi ụtọ, n’enyekw’anyị ume.
3. Okwu gị n’akp’ike, n’eru anyị n’obi.
N’ezie, ọ n’ekewa mkpụr’obi na ‘mụọ.
Ọ n’achọpụt’echiche na ih’anyị bu n’obi.
Ọ n’agbazikw’anyị, nye anyị amamihe.
(Gụọkwa Ọma 119:16, 162; 2 Tim. 3:16; Jems 5:17; 2 Pita 1:21.)