Abụ nke 28
Abụ Ọhụrụ
1. Bụkuo Chineke Abụ otuto dị ọhụrụ.
Kọọ ihe ukwu o mere Na ndị ọ g’eme.
Toonụ ike ya; Ọ bụ Chinek’onye mmeri.
Mgbe ọ n’ekp’ikpe, Ikpe ya zir’ezi.
(KORỌS)
Bụọ abụ!
Bụọ abụ ọhụrụ nke a!
Bụọ abụ!
Jehova bụ Ez’anyị.
2. Tikuo Chineke, Bụ́ Eze anyị, mkpu ọṅụ!
Too ya, sọpụrụ ya; Bụkuo y’abụ ọṅụ.
Sor’ìgwè mmadụ Bụkuo Onyenw’anyị abụ.
Jir’ụbọ na opi bụọ abụ otuto ya.
(KORỌS)
Bụọ abụ!
Bụọ abụ ọhụrụ nke a!
Bụọ abụ!
Jehova bụ Ez’anyị.
3. Ka osimiri N’ihe dum dị na ya too Jaa.
So ih’e kere n’ụwa Bụsie abụ ọṅụ ike.
Ka ala ṅụrịa, K’osimiri kụọkwa aka.
K’ugw’ukwu n’ugwu nta Bụọ abụ otuto ya.
(KORỌS)
Bụọ abụ!
Bụọ abụ ọhụrụ nke a!
Bụọ abụ!
Jehova bụ Ez’anyị.
(Gụọkwa Ọma 96:1; 149:1; Aịza. 42:10.)