Gaa n'Isiokwu

Katuun E Sere na Bọọdụ

Na vidio ndị dị ebe a, ị ga-ahụ ebe a na-ese katuun na bọọdụ. E ji ha akụziri ndị na-eto eto ihe otú ọ ga-atọ ha ụtọ.

 

Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị

Ekwetela ihe ọ bụla ị nụrụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ị gụrụ. Mụta otú ị ga-esi na-amata nke bụ́ akụkọ ụgha.

Ekwela Ka Sịga Laa Ndụ Gị n’Iyi

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-aṅụ sịga ma nke eletrọnik, ma e nwere ndị kwụsịrịla ya, nweekwa ndị na-agbalịsi ike ka ha kwụsị ya. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ịṅụ sịga ọ̀ dị njọ nke otú ahụ?

Gị na Egwuregwu Vidio, Ònye Na-emeri Ibe Ya?

Egwuregwu vidio nwere ike ịna-atọ gị ụtọ. Ma, o nwekwara ike ịkpatara gị nsogbu. Olee otú ị ga-esi zere nsogbu ndị o nwere ike ịkpata ma ghọọ onye mmeri n’ìhè?

Ihe Ị Ga-eme Ka Obi Kwụsị Ịna-ajọ Gị Njọ ma Dịwazie Gị Mma

Gịnị ka ị ga-eme ma obi jọọ gị ezigbo njọ?

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Mmega Ahụ́

Mmega ahụ́ nwere ike ime ka ị mụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-emekọrịta ihe ma na-ekwurịta okwu. Ma, mmega ahụ́ ò kwesịrị iso n’ihe ndị kacha mkpa ị na-eme ná ndụ?

Chee Gbasara Nsogbu Mmanya Nwere Ike Ịkpatara Gị

Mmanya na-ebu gị, i nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ị ga-emecha kwaara mmakwaara. Olee otú ị ga-esi zere nsogbu dị n’ịṅụ mmanya na-aba n’anya?

Olee Otú M Ga-esi Akọrọ Ndị Mụrụ M Obi M?

Olee otú i nwere ike isi kọọrọ ndị mụrụ gị obi gị, ọ bụrụgodị na ọ dịghị gị nke ikwu okwu?

Gị na Ekwentị Gị Ònye Nwe Ibe Ya?

N’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa nkà na ụzụ, i kwesịghị ikwe ka ekwentị na-achị gị. Olee otú ị ga-esi ama ma ò riela gị ahụ́? Oleekwa ihe ị ga-eme maka ya?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Hapụ M Ịna-ekpebi Ihe M Ga-eme?

Ọ dị gị ka ì ruola ka e were gị ka onye torola eto, mana ndị mụrụ gị echeghị otú ahụ. Olee ihe ndị ị ga-eme ka ha nwee ike ịtụkwasị gị obi?

Gịnị Ga-enyere M Aka Ịkwụsị Ịgba Asịrị?

Mgbe ọ bụla ihe gị na mmadụ na-ekwu banyewara n’asịrị, kwụsị ya ozugbo

Ọ̀ Bụ Ezigbo Ịhụnanya Ka Ọ̀ Bụ Ịhụnanya Iberiibe?

Ị ga-amụta ihe bụ ịhụnanya iberiibe na ezigbo ịhụnanya.

Ekwela Ka Ndị Ọgbọ Gị Rafuo Gị

E nwere ihe anọ ga-enyere gị aka ịna-ekpebi ihe n’onwe gị kama ịna-eme ihe naanị maka na ndị ọgbọ gị sị gị mee ya.

Kpachara Anya n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet

Lee katuun a ka ị mata otú ị ga-esi zere nsogbu ma ị nọrọ n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet.

Olee Otú E Si Amata Ezigbo Enyi?

Ọ dị mfe mmadụ inweta ndị enyi ọjọọ, ma olee otú ị ga-esi enweta ezigbo enyi?

Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu n’Emetụghị Ya Aka

Lee ihe mere ndị mmadụ ji achọ okwu na ihe ị ga-eme ma a chọọ gị okwu.