Ụlọ Nche na Teta!
Anyị na-ebipụta magazin anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ narị asụsụ, ma asụsụ ndị ogbi. Ụlọ Nche na-ekwu banyere ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere anyị, na-emekwa ka anyị nwee okwukwe na Jizọs Kraịst. Teta! na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-edi nsogbu ndị anyị na-enwe taa. Ọ na-emekwa ka obi sie anyị ike na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ime ka ụwa bụrụ paradaịs ebe udo ga-adị, obi eruokwa mmadụ niile ala.

